Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jisọs Na-azọpụta—N’ụzọ Dị Aṅaa?

Jisọs Na-azọpụta—N’ụzọ Dị Aṅaa?

 Jisọs Na-azọpụta—N’ụzọ Dị Aṅaa?

“Jisọs na-azọpụta!” “Jisọs bụ Onye Nzọpụta anyị!” N’ọtụtụ mba gburugburu ụwa, a na-amapawa ozi ndị dị otú ahụ n’ahụ ụlọ nakwa n’ebe ndị ọzọ ọha mmadụ na-anọ. Ọtụtụ nde mmadụ ji ezi obi kwere na Jisọs bụ Onye Nzọpụta ha. Ọ bụrụ na ị jụọ ha, sị, “N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si azọpụta anyị?” eleghị anya ha ga-aza, sị, “Jisọs nwụrụ n’ihi anyị” ma ọ bụ, “Jisọs nwụrụ n’ihi mmehie anyị.” Ee, ọnwụ Jisọs mere ka o kwe omume ịzọpụta anyị. Ma n’ụzọ dị aṅaa ka ọnwụ otu onye pụrụ isi kwụọ ụgwọ mmehie nke ọtụtụ mmadụ? Ọ bụrụ na a jụọ gị, sị, “N’ụzọ dị aṅaa ka ọnwụ Jisọs pụrụ isi zọpụta anyị?” gịnị ka ị ga-aza?

AZỊZA Bible na-enye maka ajụjụ a dị nnọọ mfe ma doo anya, nweekwa ọtụtụ ihe ọ pụtara. Otú ọ dị, iji ghọta mkpa ọ dị, ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ ghọta na ndụ na ọnwụ Jisọs bụ ihe ngwọta nke otu nsogbu siri nnọọ ike. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka anyị pụrụ ịghọta nke ọma abamuru dị nnọọ ukwuu nke ọnwụ Jisọs.

N’ime ka Jisọs nye ndụ ya, Chineke na-edozi otu nsogbu bilitere mgbe Adam mehiere. Lee ọdachi mmehie ahụ kpatara! Nwoke mbụ na nwunye ya, bụ́ Iv, zuru okè. Ọmarịcha ogige Iden ahụ bụ ebe obibi ha. Chineke nyere ha ọrụ nwere nzube nke bụ́ ilekọta ebe obibi ha bụ́ ubi. Ha gaje iji ịhụnanya lekọta ihe ndị ọzọ dị ndụ e kere eke nọ n’ụwa. Ka ụmụ mmadụ na-amụbakwa  ma na-eji ọtụtụ nde ndị yiri ha na-emejupụta ụwa, ha gaje ịgbasa paradaịs ruo ebe ụwa sọtụrụ. (Jenesis 1:28) Lee ọrụ na-enye obi ụtọ ma na-akpali akpali e nyere ha! Ọzọkwa, ha nwere mmekọrịta ịhụnanya n’etiti onwe ha. (Jenesis 2:18) Ọ dịghị ihe kọrọ ha. Ndụ obi ụtọ nke na-adịru mgbe ebighị ebi dị ha n’ihu.

O siri ike iche n’echiche otú Adam ma ọ bụ Iv ga-esi mee mmehie. Ma mmadụ abụọ mbụ ahụ nupụrụ isi megide kpọmkwem onye ahụ kere ha—Jehova Chineke. N’iji agwọ mee ihe, mmụọ ahụ e kere eke bụ́ Setan bụ́ Ekwensu duhiere Iv inupụrụ Jehova isi, Adam sonyekwaara ya.—Jenesis 3:1-6.

A naghị ajụ ajụ ihe Onye Okike ga-eme banyere Adam na Iv. O kwuolarị n’ụzọ doro anya ihe ga-esi ná nnupụisi pụta, na-asị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Otu ajụjụ ka nnọọ mkpa chọrọ ọsịsa ugbu a.

Ihe A Kpọrọ Mmadụ Echee Nsogbu Siri Ike Ihu

Mmehie mbụ ahụ kpataara ihe a kpọrọ mmadụ oké nsogbu. Adam malitere ịdị ndụ dị ka mmadụ zuru okè. N’ihi ya, ụmụ ya gaara ebi ndụ zuru okè ruo mgbe ebighị ebi. Otú ọ dị, Adam mehiere tupu ya amụọ ụmụ. Agbụrụ mmadụ nile ka nọ ya n’úkwù mgbe a mara ya ikpe, sị: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alọta n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” (Jenesis 3:19) Ya mere, mgbe Adam mehiere ma malite ịnwụ dị ka Chineke kwuru, a makọtara ya na ihe nile a kpọrọ mmadụ ikpe ọnwụ.

N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Pọl onyeozi mesịrị dee, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Ee, n’ihi mmehie mbụ ahụ, ụmụ ndị e kwesịrị ịmụ dị ka ndị zuru okè, na-enwe atụmanya nke ndụ agwụghị agwụ bụzi ndị a mụrụ inwe atụmanya nke ịrịa ọrịa, ịka nká, na ịnwụ anwụ.

“Nke ahụ bụ ikpe na-ezighị ezi,” ka mmadụ pụrụ ikwu. “Ọ bụghị anyị họọrọ inupụrụ Chineke isi—ọ bụ Adam. Gịnị mere atụmanya nke ndụ ebighị ebi na obi ụtọ ga-eji funahụ anyị?” Anyị maara na ọ bụrụ na ndị ụlọikpe atụkpuo nwata n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na papa ya zuru ohi ụgbọala, nwata ahụ pụrụ izi ezi ime mkpesa, sị: “Nke a bụ ikpe na-ezighị ezi! O nweghị ihe ọjọọ m mere.”—Deuterọnọmi 24:16.

Site n’ịrabanye nwoke na nwanyị mbụ ahụ ná mmehie, ọ pụrụ ịbụwo na Setan kwubiri na ya ga-etinye Chineke n’ọnọdụ amaghị nke a ga-eme. Ekwensu rụrụ nnọọ ala ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke agbụrụ mmadụ—tupu ha amụọ ụmụ ọ bụla. Ozugbo Adam mehiere, otu ajụjụ dị mkpa nke biliterenụ bụ, Gịnị ka Jehova ga-eme banyere ụmụ Adam na Iv ga-amụ?

Jehova Chineke mere ihe ziri ezi ma dị mma. “Ya bụrụ Chineke ihe arụ, bụ́ imebi iwu; ya [bụkwara] Onye pụrụ ime ihe nile ihe arụ, bụ́ ime ajọ omume,” ka onye ezi omume ahụ bụ́ Elaịhu kwupụtara. (Job 34:10) Banyekwara Jehova, onye amụma bụ́ Mosis dere, sị: “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Ihe ngwọta ezi Chineke ahụ mere ndokwa ya maka nsogbu nke  mmehie Adam kpatara anapụghị anyị ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs.

Chineke Emee Ndokwa Maka Ihe Ngwọta Zuru Okè

Tụlee ihe ngwọta Chineke mere ndokwa ya n’ikpe ọ mara Setan bụ́ Ekwensu. Jehova gwara Setan, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ [nzukọ eluigwe nke Chineke], na n’etiti mkpụrụ gị [ụwa nke Setan na-achịkwa] na mkpụrụ ya [Jisọs Kraịst]: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị [Setan] n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ [ọnwụ Jisọs].” (Jenesis 3:15) N’amụma mbụ a nke Bible, Jehova zoro aka ná nzube ya ime ka Ọkpara ya bụ́ mmụọ nọ n’eluigwe bịa bie n’ụwa dị ka nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs ma mesịa nwụọ—bụrụ onye e chifịara n’ikiri ụkwụ—n’ọnọdụ emeghị mmehie ahụ ọ nọ.

N’ihi gịnị ka Chineke ji chọọ ka mmadụ zuru okè nwụọ? Ọ dị mma, gịnị bụ ntaramahụhụ Jehova Chineke kwuru na Adam ga-enweta ma ọ bụrụ na o mehie? Ọ́ bụghị ọnwụ? (Jenesis 2:16, 17) “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Rom 6:23) Adam ji ọnwụ nke ya kwụọ ụgwọ mmehie ya. E nyere ya ndụ, ya ahọrọ ime mmehie, ọ nwụkwara dị ka ntaramahụhụ maka mmehie ya. (Jenesis 3:19) Gịnị banyere ikpe a mara agbụrụ mmadụ dum n’ihi mmehie ahụ? Ọnwụ dị mkpa iji kpuchie mmehie ha. Ma ònye ka ọnwụ ya pụrụ ikpuchi mmehie nke ihe nile a kpọrọ mmadụ n’ụzọ ziri ezi?

Iwu Chineke nke e nyere Israel oge ochie chọrọ ka “ndụ laara ndụ.” (Ọpụpụ 21:23) Dị ka ụkpụrụ iwu a si dị, ọnwụ nke ga-ekpuchi mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-abụ nke ya na ihe Adam tụfuru ha nhata. Ọ bụ nanị ọnwụ nke mmadụ ọzọ zuru okè pụrụ ịkwụ ụgwọ nke mmehie. Jisọs bụ mmadụ dị otú ahụ. N’ezie, Jisọs bụ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ” maka nzọpụta nke ihe nile a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta bụ́ ndị sitere n’Adam.—1 Timoti 2:6, NW; Ndị Rom 5:16, 17.

Ọnwụ Jisọs Bara Uru Dị Ukwuu

Ọnwụ Adam abaghị uru; o kwesịrị ịnwụ n’ihi mmehie ya. Otú ọ dị, ọnwụ Jisọs bara uru dị ukwuu n’ihi na ọ nwụrụ n’emeghị mmehie. Jehova Chineke pụrụ ịnakwere uru nke ndụ zuru okè nke Jisọs dị ka ihe mgbapụta maka ụmụ na-erube isi nke Adam mere mmehie. Uru nke àjà Jisọs akwụsịghị n’ịkwụ ụgwọ maka mmehie ndị anyị mere n’oge ndị gara aga. Ọ bụrụ na ọ kwụsịrị, anyị agaaraghị enwe ọdịnihu. N’ihi ịbụ ndị a tụụrụ ime ha ná mmehie, anyị ga-ejehierịrị ọzọ. (Abụ Ọma 51:5) Lee ka anyị pụrụ isi nwee ekele na ọnwụ Jisọs mere ka anyị nwee ohere inweta izu okè Jehova zubere ná mbụ maka ụmụ Adam na Iv!

A pụrụ iji Adam tụnyere nna nke nwụrụ ma tinye anyị n’oké ụgwọ (mmehie) nke na ọ dịghị ụzọ ọ bụla kwere omume anyị pụrụ isi pụọ n’ụgwọ ahụ. N’aka nke ọzọ, Jisọs dị ka ezigbo nna nke nwụrụ ma hapụrụ anyị ihe nketa bara ụba bụ́ nke mere, ọ bụghị nanị ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’oké ụgwọ nke Adam tinyere anyị n’ime ya, kamakwa ka anyị nwee ihe ga-ezuru anyị iji bie ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọnwụ Jisọs abụghị nanị nhichapụ nke mmehie ndị e mere n’oge gara aga; ọ bụkwa ndokwa magburu onwe ya maka ọdịnihu anyị.

Jisọs na-azọpụta n’ihi na ọ nwụrụ maka anyị. Leekwa ndokwa bara uru ọnwụ ya bụ! Mgbe anyị hụtara ya dị ka akụkụ nke ihe ngwọta Chineke mere ndokwa ya maka nsogbu ahụ siri ike nke mmehie Adam kpatara, okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ na n’ụzọ o si eme ihe ga-esikwu ike. Ee, ọnwụ Jisọs bụ ụzọ isi napụta “onye ọ bụla nke kwere” na ya pụọ ná mmehie, ọrịa, ịka nká, na ọnwụ n’onwe ya. (Jọn 3:16) Ì nwere ekele n’ebe Chineke nọ maka ime ndokwa ịhụnanya a maka nzọpụta anyị?

[Foto dị na peeji nke 5]

Adam wetaara ihe a kpọrọ mmadụ mmehie na ọnwụ

[Foto dị na peeji nke 6]

Jehova mere ndokwa maka ihe ngwọta zuru okè