Jenesis 7:1-24
7 Mgbe e mechara, Jehova sịrị Noa: “Banye n’ụgbọ ahụ, gị na ndị ezinụlọ gị niile, n’ihi na ọ bụ gị bụ onye ezi omume m hụrụ n’ọgbọ a.+
2 Chịrị anụ ọ bụla dị ọcha asaa asaa,+ oké na nne. Chịrị anụ ọ bụla na-adịghị ọcha naanị abụọ abụọ, oké na nne.
3 Chịrịkwa anụ ndị na-efe efe asaa asaa, oké na nne, ka e wee chebe ụmụ ha ndụ n’ụwa niile.+
4 N’ihi na ọ fọrọ naanị ụbọchị asaa ka m mee ka mmiri zoo+ n’ụwa ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.+ M ga-ekpochapụkwa ihe ọ bụla dị ndụ m kere eke n’ụwa.”+
5 Noa wee mee ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.
6 Noa dị narị afọ isii (600) mgbe mmiri ahụ zoro tojuo ụwa.+
7 Noa na ụmụ ya na nwunye ya na ndị nwunye ụmụ ya wee banye n’ụgbọ ahụ tupu nnukwu mmiri ahụ amalite izo.+
8 Anụ ọ bụla dị ọcha na anụ ọ bụla na-adịghị ọcha na anụ ndị na-efe efe na ihe ọ bụla na-agagharị agagharị n’ala+
9 banyere abụọ abụọ, oké na nne, n’ụgbọ ahụ. Ha gakwuuru Noa otú Chineke nyere Noa n’iwu.
10 Mgbe ụbọchị asaa gachara, nnukwu mmiri ahụ malitere izo n’ụwa.
11 N’abalị iri na asaa n’ọnwa nke abụọ n’afọ Noa gbara narị afọ isii (600), n’ụbọchị ahụ, a gbaghere nnukwu mmiri niile dị na mbara igwe, megheekwa ọnụ ụzọ mmiri niile dị n’eluigwe.+
12 Mmiri wee zosie ike n’ụwa ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.
13 N’ụbọchị ahụ, Noa banyere n’ụgbọ ahụ, ya na ụmụ ya bụ́ Shem, Ham, na Jefet,+ nakwa nwunye Noa na ndị nwunye ụmụ ya atọ.+
14 Ha banyere, ha na anụ ọhịa ọ bụla n’ụdị ya dị iche iche, na anụ ụlọ ọ bụla n’ụdị ya dị iche iche, na anụ ọ bụla na-arị arị n’ụdị ya dị iche iche, na anụ ọ bụla na-efe efe n’ụdị ya dị iche iche, ya bụ, nnụnụ ọ bụla na ihe ọ bụla nwere nku.
15 Ụdị anụ ọ bụla na-eku ume nọ na-agakwuru Noa abụọ abụọ n’ime ụgbọ ahụ.
16 Ha wee banye otú Chineke nyere Noa n’iwu. Ụdị anụ ọ bụla banyere oké na nne. Mgbe ha banyechara, Jehova mechiri ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ.
17 Mmiri ahụ zogidere n’ụwa ruo ụbọchị iri anọ. Mmiri ahụ nọ na-eto wee malite ibu ụgbọ ahụ, ụgbọ ahụ nọkwa na-ese n’elu mmiri n’ụwa.
18 Mmiri ahụ wee karịa akarịa, na-etochikwa ebe niile n’ụwa. Ma ụgbọ ahụ nọ na-ese n’elu mmiri ahụ.
19 Mmiri ahụ karịrị akarị n’ụwa nke na o tochiri ugwu niile dị elu dị n’ụwa.*+
20 Mmiri ahụ ji kubit* iri na ise tofee ugwu ndị ahụ.
21 Ihe niile e kere eke* na-agagharị n’ụwa wee laa n’iyi,+ ya bụ, anụ ndị na-efe efe, anụ ụlọ, anụ ọhịa, obere ụmụ anụmanụ ndị ọzọ,* na mmadụ niile.+
22 Ihe ọ bụla na-eku ume nọ n’elu ala nwụrụ.+
23 Chineke* wee kpochapụ ihe ọ bụla dị ndụ n’ụwa, ma mmadụ ma anụmanụ ma anụ ndị na-arị arị ma anụ ndị na-efe efe. O kpochapụrụ ha niile n’ụwa.+ Naanị Noa na ndị ya na ha nọ n’ụgbọ fọrọ ndụ.+
24 Mmiri ahụ tochiri ụwa ruo otu narị ụbọchị na iri ise (150).+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”
^ Na Hibru, “Anụ ahụ́ niile.”
^ O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.
^ Na Hibru, “O.”