Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-akwado Ibu Agha?

Chineke Ọ̀ Na-akwado Ibu Agha?

Echiche nke Bible

Chineke Ọ̀ Na-akwado Ibu Agha?

ỌTỤTỤ mgbe, ndị isi ọchịchị, ndị ọchịagha, na ọbụna ndị ụkọchukwu akpọsawo ma ọ bụ kwadoo agha n’aha Chineke! Na 1095, site ná nkwado na ngọzi nke Popu Urban nke Abụọ, a malitere Agha Ntụte nke Mbụ iji nwetaghachiri ndị Krisendọm “Obodo Nsọ” bụ́ Jeruselem. Ma tupu ha emezuo ebumnobi ha, ndị Turk, bụ́ ndị ịnụ ọkụ n’obi ha na-anụrụ Allah siri nnọọ ike dị ka okwukwe nke Ndị Agha Ntụte ahụ nwere n’Atọ n’Ime Otu, kpochapụrụ otu ìgwè nke Ndị Agha Ntụte.

N’August 1914, otu onye Germany na-eto eto si n’ogige ebe ọ nọ n’oge Agha Ụwa Mbụ dee, sị: “Ọ bụrụ na e nwere ikpe ziri ezi, ọ bụrụkwa na Chineke na-eduzi ihe na-eme n’akụkọ ihe mere eme—bụ́ nke m ji nnọọ n’aka na ọ na-eduzi—mgbe ahụ mmeri ga-abụrịrị nke anyị.” N’otu ọnwa ahụ, Czar Nicholas nke Abụọ zipụrụ ndị agha Russia ịwakpo Germany, ka ọ nọ na-akpọsa, sị: “Ana m ezigara usuu ndị agha m dị ike na ndị òtù m a ma ama ekele sitere nnọọ n’obi m. Chineke dịnyeere anyị!”

N’ịbụ ndị e si otú a mesie obi ike, ọtụtụ nde ndị agha agawo n’ọgbọ agha, na-ekwenye n’ụzọ zuru ezu na Chineke dịnyeere ha. Ọtụtụ ndị na-eche na Chineke hapụrụ ka a na-alụ agha otú ahụ n’ihi na ọ bụ ụgwọ a na-aghaghị ịkwụ iji nweta nwere onwe, ha na-ezokwa aka n’agha ndị e kwuru maka ha n’Akwụkwọ Nsọ Hibru (nke a na-akpọkarị Agba Ochie) dị ka ihe iji kwadoo ya. Ma otú ha si akọwa Okwu Chineke ò ziri ezi?

Agha Ndị Izrel Oge Ochie Lụrụ

Jehova Chineke nyere iwu ka ndị Izrel buo agha iji bipụ ndị Kenan ahụ rụrụ arụ n’Ala Nkwa ahụ. (Levitikọs 18:1, 24-28; Deuterọnọmi 20:16-18) Dị nnọọ ka Chineke jiri iju mmiri taa ndị mmebi iwu ahụhụ n’oge Noa, jirikwa ọkụ mee ihe n’ihe banyere Sọdọm na Gọmọra, otú ahụ ka o ji mba Izrel mee ihe dị ka mma agha ya nke imezu ihe e kpere n’ikpe.—Jenesis 6:12, 17; 19:13, 24, 25.

Dị ka Bible si kwuo, ndị Izrel lụrụ agha ndị ọzọ mgbe Chineke nyere ha ntụziaka ime otú ahụ, dị ka ọ na-adịkarị iji gbochie iyi egwu na-enweghị ihe kpatara ya nke ndị iro ha. Mgbe mba ahụ rubeere Jehova isi, ha nwere ihe ịga nke ọma n’agha ndị ha lụrụ. (Ọpụpụ 34:24; 2 Samuel 5:17-25) Ma mgbe ọ bụla ndị Izrel nwara ịlụ agha n’abụghị ná ntụziaka Chineke, ha na-ezutekarị ọdachi. Tụlee ihe banyere Eze Jeroboam. N’ileghara ịdọ aka ná ntị amụma e nyere ya anya, o zipụrụ usuu ndị agha ya buru ibu ịga buo agha obodo megide Juda. Mgbe ime ihe ike ahụ mesịrị bie, ndị agha dị 500,000 nke Jeroboam nwụrụ. (2 Ihe E Mere 13:12-18) Ọbụna Eze Josaịa kwesịrị ntụkwasị obi, lụrụ agha na-abụghị nke ya n’otu oge. Mkpebi ahụ o mere ọkụ ọkụ kpataara ya ọnwụ.—2 Ihe E Mere 35:20-24.

Gịnị ka ihe ndị a merenụ na-egosi? Ọ na-egosi na n’Izrel oge ochie, ọ bụ Chineke ka mkpebi ma à ga-ebu agha dịịrị. (Deuterọnọmi 32:35, 43) O mere ka ndị ya buo agha n’ihi nzube ụfọdụ kpọmkwem. Otú ọ dị, e mezuru nzube ndị a eri ogologo oge gara aga. Ọzọkwa, Jehova buru amụma na ndị na-efe ya “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a” ‘ga-akpụgharị mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè,’ “ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:2-4) N’ụzọ doro anya, agha ndị ahụ a lụrụ n’oge Bible adịghị egosi na agha ndị nke oge a ziri ezi, bụ́ nke ọ na-adịghị otu n’ime ha a na-alụ ná ntụziaka Chineke ma ọ bụ n’ihi iwu o nyere.

Mmetụta nke Ozizi Kraịst Nwere

Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jizọs gosiri otú a pụrụ isi jiri ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị dochie anya ịkpọasị, na-enye iwu, sị: “Unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya.” (Jọn 15:12) O kwukwara, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo.” (Matiu 5:9) N’ebe a okwu Grik maka “ime udo” pụtara ihe karịrị inwe ọnọdụ nke ihe ịdị jụụ. N’ezie, ọ gụnyere ịzụlite udo, ịrụsi ọrụ ike iji kwalite mmekọrịta dị mma.

N’oge a na-ejide Jizọs, Pita onyeozi nwara iji ihe agha a pụrụ iji gbuo mmadụ chebe ya. Ma Ọkpara Chineke baara ya mba, na-asị: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya, n’ihi na ndị nile na-ebu mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) Olee otú Ndị Kraịst narị afọ mbụ si jiri okwu ndị a mee ihe? Rịba ihe ndị na-esonụ e kwuru ama.

“Ntụle e ji nlezianya tụleghachi ihe ọmụma nile e nwere [na-egosi] na, ruo n’oge nke Marcus Aurelius [121-180 O.A.], ọ dịghị Onye Kraịst ọ bụla ghọrọ onye agha; ọ dịghịkwa onye agha, mgbe ọ ghọsịrị Onye Kraịst, nọgidere n’ọrụ agha.”—The Rise of Christianity.

“Àgwà Ndị Kraịst [oge mbụ] dị nnọọ iche na nke ndị Rom. . . . Ebe Kraịst kwusaworo udo, ha jụrụ ịghọ ndị agha.”—Our World Through Ages.

N’ihi na ndị na-eso ụzọ Kraịst jụrụ ịrụ ọrụ dị ka ndị agha eze ukwu, ndị Rom gburu ọtụtụ n’ime ha. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ji were nguzo dị otú ahụ nke ọtụtụ na-enweghị mmasị na ya? N’ihi na Jizọs kụziiri ha ịbụ ndị na-eme udo.

Ibu Agha nke Oge A

Cheedị otú ọnọdụ ahụ ga-esi dị njọ ma ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Kraịst esoro ndị agha na-alusorịta ibe ha agha na-alụ agha, na-anwa igbu ibe ha. Ihe dị otú ahụ ga-emegide ụkpụrụ Ndị Kraịst. N’ezie ndị na-erubere Chineke nke Bible kwuru maka ya isi agaghị emerụ onye ọ bụla ahụ́—ọbụna ndị iro ha. *Matiu 5:43-45.

N’ụzọ doro anya, Chineke adịghị akwado agha ụmụ mmadụ na-ebu n’etiti onwe ha n’oge a megide anụ ahụ́. N’ịbụ ndị na-eme udo, ezi Ndị Kraịst na-ekwusa banyere udo nke a ga-eguzobe n’ụwa nile n’okpuru Alaeze Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Bible hotara “Ha-Magedọn,” bụ́ nke a na-akpọkwa “agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” Nke a anaghị ezo aka n’agha nke ụmụ mmadụ na-ebu, kama ná mbibi nke Chineke ga-ebibi nanị ndị mmebi iwu. Ya mere, a pụghị iji Ha-Magedọn gosi na agha ụmụ mmadụ na-alụ n’oge a ziri ezi ma ọ bụ were ya na Chineke na-agọzi ha.—Mkpughe 16:14, 16; 21:8.

[Foto dị na peeji nke 27]

Ọchịagha Francisco Franco nke Spen, ebe ya na ụfọdụ ndị ụkọchukwu nke Katọlik guzo

[Ebe E Si Nweta Foto]

U.S. National Archives photo

[Foto dị na peeji nke 27]

Ebe ndị ụkọchukwu nke chọọchị Ọtọdọks nke Gris na-agọzi ndị agha tupu ha agawa Kosovo, June 11, 1999

[Ebe E Si Nweta Foto]

AP Photo/Giorgos Nissiotis