Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ahapụ Okpukpe Ndị Mbụ?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ahapụ Okpukpe Ndị Mbụ?

 Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ahapụ Okpukpe Ndị Mbụ?

OKPUKPE NDỊ NA-AZỌRỌ na ozizi ha hiwere isi n’ozizi Jizọs Kraịst nwere ihe dị ka ijeri 1.7 ndị na-ekpe ha. E weere Krisendọm dị ka okpukpe kasị ukwuu n’ụwa, ọbụna karịa okpukpe ndị ọzọ a ma ama dị ka okpukpe Buddha, okpukpe Hindu, na Alakụba n’ọnụ ọgụgụ. Otú ọ dị, akụkọ e nwetara na-egosi na n’ọtụtụ mba ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst, ike Krisendọm nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ na-ebelata ebelata.

Ndị mmadụ nọ n’ọnọdụ nile na-agbahapụ chọọchị ha. Ronald F. Inglehart, bụ́ onye nnyocha na Mahadum Michigan nakwa onye ntụzi ọrụ ná Nnyocha Maka Ụkpụrụ Omume Ụwa, kwuru na mmetụta okpukpe na-enwe n’ahụ́ ụmụ mmadụ bi n’ebe ndị mepere emepe, na-adịwanye ala. Magazin bụ́ Bible Review na-ehota ya dị ka onye kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị na ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị kwa izu adalatala nnọọ, kama mba ndị dị na Latin America na-ezigazi ndị ozi ala ọzọ iji zọpụta ndụ nke ndị bi ná mba ndị dị na Europe.” Ọ na-azọrọ na “ndakpọ nke okpukpe” pụtara ìhè karịsịa ná mba ụfọdụ dị n’ebe ugwu Europe. Na Norway na Denmark, ọ bụ nanị pasent 5 nke ndị bi na ha na-agachi chọọchị anya. Na Sweden, ọnụ ọgụgụ ahụ dị nnọọ ala ruo pasent 4, na Russia kwa pasent 2.

 Akụkọ ndị sitere na Germany na-egosi na n’agbata afọ 1984 na 1993, ọnụ ọgụgụ ndị na-agachi chọọchị anya n’etiti ndị Katọlik e debara aha ha n’akwụkwọ dalatara site na pasent 25.3 ruo pasent 19. Ka ọ na-erule na 1992, nanị pasent 4 nke ndị Protestant nọ na-agachi ụka Sunday anya. Na 1999, akwụkwọ bụ́ Christianity Today kọrọ, sị: “Ọ bụ nanị otu onye n’ime ndị Germany iri na-aga chọọchị kwa izu.”

Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian na-ekwu banyere ndalata ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe na Britain, sị: “Iso Ụzọ Kraịst anọtụbeghị n’ọnọdụ dị njọ karịa nke a.” Isiokwu ahụ kwuru na “nye ma ndị ụkọchukwu ma ndị isi chọọchị, 1950-2000 bụ ọkara narị afọ kasị njọ ha hụtụrụla.” N’izo aka n’otu akụkọ pụrụ iche banyere okpukpe na United Kingdom, akwụkwọ akụkọ ahụ na-egosi na ọ bụghị nanị ndị na-eto eto ka okwukwe ha nwere ná njikọ okpukpe na-ebelata kamakwa nke ndị agadi na-eme otú ahụ. Ọ na-ekwu, sị: “Okwukwe nke ndị toworo eto nwere n’ebe Chineke nọ na-ebelata ka ha na-emekwu agadi. Nnyocha ọhụrụ e mere bụ́ nke na-egosi na ihe a na-eme eme n’ezie ga-awụ chọọchị ndị dị na Britain, bụ́ ndị nwere ọgba aghara, akpata oyi, bụ́ ndị nọworo na-ele ndị agadi anya ruo ugbu a dị ka ndị bụ́ isi na-ejikọta ma na-akwado chọọchị ha ndị ọnụ ọgụgụ ha na-ebelata ebelata.”

A na-ahụ ihe ndị yiri ya n’ebe ndị ọzọ na-abụghị Europe. Dị ka ihe atụ, magazin Canada bụ́ Alberta Report na-ekwu na Canada na-enwe “ndakpọ nke inwe nkwenkwe na ife ofufe n’ìgwè,” nakwa na “ọtụtụ ndị Canada karị na-ahọrọ inwe echiche nke aka ha banyere Chineke karịa ikwere n’usoro okwukwe a kapịrị ọnụ.”

Ọtụtụ ndị adịghị eriju afọ ma ọ bụ enweta ihe ọmụma n’ụzọ ime mmụọ site n’ịga ụka. Dị ka magazin Canada bụ́ Maclean’s si kwuo, ma ndị Juu ma ndị Katọlik a gbara ajụjụ ọnụ n’oge nnọkọ ekpere nke Himalaya, ma ọ bụ nnọkọ ekpere ndị Hindu, kwupụtara echiche bụ́: “Ememe okpukpe ndị na-agbụ agbụ adịghịzi amasị anyị.” N’ezie, ọbụna mgbe e jisịrị ịdị uchu jee chọọchị ruo ọtụtụ afọ, ụfọdụ ndị na-ahụta onwe ha ka ha na-eche, sị, ‘Gịnị n’ezie ka m mụtaworo na chọọchị? Ò meela ka m nọrọkwuo Chineke nso?’ Ka a sịkwa ihe mere na, dị ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ Gregg Easterbrook si kwuo ya, “n’ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ịda ogbenye n’ụzọ ime mmụọ anọchiwo anya ịda ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe dị ka ụkọ kasịnụ e nwere n’oge anyị.”

N’ezie, e nwere ọtụtụ ala ebe ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị ka ukwuu. Otú ọ dị, ịga chọọchị adịghị apụta mgbe nile iji iguzosi ike n’ihe na-agbaso ozizi nile nke chọọchị. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ Australia bụ́ The Age na-ekwu na n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, “ọnụ ọgụgụ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-ekpe okpukpe ha na-adalata ngwa ngwa. N’akụkụ ka ukwuu nke Africa, Eshia na Latin America, Iso Ụzọ Kraịst bụ ihe ọtụtụ ndị mmadụ na-ezo n’azụ ya ma nọgide na-anakwere nkwenkwe ndị na-akpali akpali karị nke agbụrụ ma ọ bụ nke òtù nzuzo bụ́ ndị na-enweghị ihe jikọrọ ha na ozizi Ndị Kraịst dịwarala kemgbe, bụ́ ndị na-emegidekarị ozizi ndị ahụ, bụrụkwa ndị a gbahapụrụ ọtụtụ afọ gara aga.”

N’ihi gịnị ka ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu nke ndị mmadụ, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi ji agbahapụ chọọchị ha? O yiri ka isi ihe na-akpata ya ọ̀ bụ ndakpọ olileanya.

Akụkọ Na-adịghị Mma Banyere Okpukpe

Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian kwuru ihe na-esonụ: “Chọọchị Roman Katọlik nwere aha ọjọọ nke isoro ọchịchị aka ike fascist kpaa nkata na narị afọ nke 20 nile, malite ná mma mma ọ tụụrụ Ọchịagha Franco mgbe a lụsịrị agha obodo na Spen, ruo ná mgbalị o mere n’oge na-adịbeghị anya iji kwadoo Ọchịagha Pinochet.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ Guardian kwukwara na Popu Pius nke Iri na Abụọ, nke jere ozi dị ka popu n’oge agha, “dịịrị nnọọ njikere iso [Hitler] mee ndokwa ma zere ihe ndị pụrụ imechu ya ihu dị ka ịkatọ Oké Mgbukpọ ahụ.”

Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Age na-ekwu, sị: “Nzọrọ Iso Ụzọ Kraịst a na-azọrọ abụwo nnọọ nke elu ọnụ ọtụtụ ugboro. Ndị Kraịst enwebeghị ike ichekwa udo na ịdị n’otu n’etiti onwe ha. . . . Ọtụtụ agha ndị e nweworo mmeri na ha ma kwakọrọ ihe ndị mmadụ bụ́ ndị e mere ka ha yie ihe ziri ezi site n’ikwu na nzube ha bụ iji tọghata  ndị mmadụ gaa n’akụkụ Kraịst pụrụ ịgba akaebe nke a. Okwukwe, olileanya na ịhụnanya pụrụ ịbụ omume ọma ndị kasị pụta ìhè nke Ndị Kraịst, ma ndị a sịrị na ha na-agbalịsi ike igosipụta omume ọma ndị ahụ pụrụ nnọọ ịbụ ndị na-atụchakarị ihe, ndị pụrụ ịdaba n’enweghị olileanya dị nnọọ ka ndị na-abụghị Ndị Kraịst na-eme, ikekwe, ha adịghịkwa arụ ọrụ ebere karịa ndị na-abụghị Ndị Kraịst. . . . Ọ bụ mba e ji Iso Ụzọ Kraịst mara kpaliri Oké Mgbukpọ ahụ, ọ bụkwa mba ọzọ e ji Iso Ụzọ Kraịst mara tụrụ mba Japan bọmbụ atọm ahụ na-atụ ụjọ.”

Ụfọdụ ndị pụrụ ikwu na Krisendọm anọwo na-akwalite omume ọma ndị dị ka ịdị akọ, obi ike, anya udo, na ikpe ziri ezi. Otú ọ dị, akwụkwọ akụkọ ahụ bụ́ The Age na-ekwu, sị: “N’ozuzu ha, Ndị Kraịst nọ na Europe, n’Ebe Ugwu America nakwa n’Australia na-ewere nnọọ òkè karịrị nnọọ nke ha kwesịrị iwere n’akụ̀ ndị dị n’Ụwa, ha akwụsịbeghịkwa ịnakwere nrigbu, mmegbu na imebi gburugburu ebe obibi nke mba ndị na-adịchaghị ike iji mejuo ọchịchọ ha.”

Akwụkwọ akụkọ a bụ́ The Age gara n’ihu ikwu banyere ọdịnihu Krisendọm, sị: “E wezụga usoro a haziri ahazi bụ́ nke na-arụ ọrụ nke ọma, Iso Ụzọ Kraịst apụghị inweghachi ikike o nwere n’etiti ọha na eze na narị afọ ndị gara aga. Nke a pụrụ ịbụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ, dabere n’otú mmadụ si ele ihe anya. Ma nke ahụ bụ eziokwu ga na-eche Iso Ụzọ Kraịst ihu n’afọ ndị dị n’ihu.”

N’ihi nretọ dị otú ahụ e nwere ná njikọ okpukpe, ọtụtụ ndị na-ahapụ chọọchị ndị mbụ. Ma nke ha na-achọta n’ọnọdụ ya ọ̀ na-egbo mkpa ha? Ọ̀ bụ ihe ngwọta ya?

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Oké ememe dị iche iche na-eme ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-enweghị afọ ojuju n’ụzọ ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọtụtụ ndị ahapụwo okpukpe ndị mbụ n’ihi òkè ha na-ekere n’ịkwado agha na ndị ọchịchị aka ike

[Ebe E Si Nweta Foto]

foto: age fotostock