Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Oriri Ndị Na-enye Ihe n’Ahụ́ Dị n’Ebe Aka Gị Ga-eru

Ihe Oriri Ndị Na-enye Ihe n’Ahụ́ Dị n’Ebe Aka Gị Ga-eru

 Ihe Oriri Ndị Na-enye Ihe n’Ahụ́ Dị n’Ebe Aka Gị Ga-eru

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA MEXICO

ANGÉLICA na ezinụlọ ya mmadụ iri mejupụtara bi n’obodo nta dị na steeti Oaxaca, dị na Mexico. Ha dara ogbenye, ihe oriri ha na-abụ achịcha ọka, àgwà, ofe ose, osikapa gbara mmiri, bred na-atọ rịrịrị, na tii. “Anyị etopụghị etopụ,” ka Angélica na-ekwu. “Anyị dị obere ma taa ahụ́. Anyị na-arịakarị ọrịa—ọrịa afọ, nje, na azụ̀zụ̀.”

Angélica na ezinụlọ ya kpebiri ịkwaga Mexico City, na-enwe olileanya ịchọta ọrụ ga-eme ka ha nwee ike imeziwanye ọnọdụ akụ̀ na ụba ha. O chere na ihe oriri ha ka nnọọ mma ugbu a n’ihi na ọ gụnyere mmiri ara ehi, àkwá, anụ, mmiri ara  ehi yiri bọta, akwụkwọ nri ole na ole, na ihe oriri dị iche iche e ji mmiri ọgwụ chekwaa. Ma ihe oriri ha ọ̀ ghọwo n’ezie nke na-enye ihe n’ahụ́ karị?

Erighị Ihe Na-edozi Ahụ́ —Ókè Ha Aṅaa Ka Ọ Gbasaruru?

N’ụwa nile, ihe dị ka nde mmadụ 800 nọ n’ihe ize ndụ nke ịnwụ n’ihi erighị ihe na-edozi ahụ́. Dị ka Akụkọ Ahụ́ Ike Ụwa Maka 1998 bụ́ nke Òtù Ahụ́ Ike Ụwa (WHO) nyere si gosi, ihe dị ka pasent 50 nke ụmụaka nile na-erubeghị afọ ise na-anwụnụ bụ n’ihi erighị ihe na-edozi ahụ́. Ọbụna ndị nke jisiri ike dịgide ndụ na-enwekarị nsogbu ahụ́ ike.

N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe ha ka nde mmadụ 800 nọ n’ihe ize ndụ nke ịnwụ n’ihi iribiga nri ókè. Nri na-adịghị edozi ahụ́ pụrụ ịkpata ọrịa na-adịghị ala ala ndị dị ka oké ibu, nsụchi nke akwara obi, ọbara mgbali elu, ọrịa shuga, ọrịa imeju, na ụdị ọrịa cancer dị iche iche. N’ikwu ya ná nkenke, òtù WHO na-ekwu, sị: “Ya mere, erighị ihe na-edozi ahụ́ na-akpata ọtụtụ nsogbu ahụ́ ike, gụnyere erighị nri nke ọma, ụkọ ihe ụfọdụ na-edozi ahụ́, na iri nri gabiga ókè; na-egbukwa mmadụ, na-akpata nkwarụ, na-akpata ìsì, ọ na-emekwa ka ọnụ ọgụgụ dị ukwuu n’ezie nke ndị mmadụ n’ụwa nile ghara ito nke ọma.”

N’otu mba, a pụrụ inwe ma ndị na-adịghị eri nri nke ọma ma ndị buru oké ibu. N’ime otu ezinụlọ, a pụrụ inwe ụmụ ọhụrụ na-adịghị eri ihe na-edozi ahụ́ nakwa ndị toworo eto bụ́ ndị nwere nsogbu na-adịghị ala ala nke ibu oké ibu. N’ọnọdụ ụfọdụ, otu onye ahụ nke na-adịghị eri nri nke ọma mgbe ọ bụ nwatakịrị na-ebu oké ibu mgbe o toro. Nke ikpeazụ ahụ pụrụ imetụta ndị si n’ime obodo kwaga n’obodo ukwu.

Ọtụtụ ndị adịghị aghọta njikọ ọnọdụ ahụ́ ike ha na otú ha si eri nri nwere. Ikekwe ọ bụ n’ihi na mmetụta nke mmadụ erighị ezigbo nri na-enwe n’ahụ́ ike mmadụ adịghị apụta ìhè ozugbo ahụ. Ma ihe oriri na-akwalite ahụ́ ike pụrụ igbochi ọtụtụ ọrịa. N’eziokwu, òtù WHO na-eme atụmatụ na a pụrụ igbochi ihe dị ka pasent 40 nke ọrịa cancer site n’imeziwanye otú e si eri nri na  site n’imega ahụ́. Ma olee otú ị pụrụ isi meziwanye ihe oriri gị?

Ụzọ Isi Meziwanye Ihe Oriri Gị

Ndị ụfọdụ na-ele ihe oriri anya dị ka nke e kewara gaa n’ìgwè atọ bụ́ isi. Ìgwè nke mbụ gụnyere mkpụrụ akụ́kụ́, ndị dị ka ọka nkịtị, ọka wit, osikapa, ọka oat, ọka rye, ọka bali, na ọka millet, nakwa ihe oriri na-eru eru, ndị dị ka poteto na ji. Carbohydrate ndị a na-enye ike ngwa ngwa. Ìgwè nke abụọ gụnyere ihe oriri na-adị ná mkpo a na-agbawa agbawa, ndị dị ka àgwà, lentil, chick-pea, na akịdị, na ihe oriri ụfọdụ sitere n’anụmanụ, ndị dị ka anụ, azụ̀, àkwá, na mmiri ara ehi nakwa ihe ndị a na-eji ya emepụta. Ihe ndị a na-enye protein, iron, zinc, na vitamin dị iche iche. Ìgwè nke atọ gụnyere mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri. Ihe ndị a na-enye vitamin na mineral ndị dị oké mkpa. Ha na-enyekwa fiber na ike, ọ bụkwa nanị ha bụ ihe ndị sitere n’okike na-enye vitamin C.

Dị ka Dr. Héctor Bourges, bụ́ onyeisi ngalaba ihe oriri nke Ụlọ Akwụkwọ Mba Maka Ihe Ọmụmụ Nkà Ọgwụ na Ihe Oriri (INCMNSZ) nke Salvador Zubirán dị na Mexico si kwuo, ihe oriri na-akwalite ahụ́ ike aghaghị isitecha n’ìgwè atọ ndị a, izu ezu, nakwa inwe ihe ndị na-enye ihe n’ahụ́ n’ókè kwesịrị ekwesị. Ọ na-atụ aro ka anyị “si n’ìgwè nke ọ bụla na-eweta ma ọ dịkarịa ala otu ihe oriri maka nri ọ bụla ma na-agbanwe ihe oriri ndị a na-ewere n’ìgwè nke ọ bụla ruo n’ókè kwere mee, na-agbanwekwa otú e si akwadebe ha.”

Tụlee ihe banyere María. Ya na ezinụlọ ya biri n’Atopixco, bụ́ ime obodo dị na steeti Hidalgo, Mexico. Ha dara nnọọ ogbenye, ihe oriri ha bụ́ isi bụ achịcha ọka, àgwà, nri ndị dị ka macaroni, osikapa, na ose oyi. N’ụzọ dị iche n’ebe ezinụlọ Angélica nọ, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, ihe oriri ha gụnyekwara obere squash, chayote, ero, na akwụkwọ nri ndị a na-enweta ọtụtụ n’ime ha n’ime obodo. Site n’oge ruo n’oge, ha gbalịrị ịdị na-eri mkpụrụ osisi mgbe ha nọ n’oge ha ji apụta. Mgbalị ha tinyere mere ka ha nwee ahụ́ ike ka mma.

Dr. Adolfo Chávez, bụ́ onyeisi Ngalaba Na-ahụ Maka Iri Nri Eri na Ịkụzi Iri Nri nke ụlọ ọrụ INCMNSZ, na-atụ aro ka anụ bụrụ ihe e ji eme ka nri tọkwuo ụtọ, ka ọ ghara ịbụ ihe bụ́ isi n’ihe oriri. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ iji nanị àkwá ole na ole na poteto, akwụkwọ nri, na àgwà kwadebe ihe oriri. “Ná [ngalaba na-ahụ maka] ihe oriri, a maara nke a dị ka ‘ngwakọ,’” ka Dr. Chávez na-ekwu. Otú ọ dị, rịba ịdọ aka ná ntị a ama: Na-asa mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri asa nke ọma mgbe nile, karịsịa ndị nke a ga-eri n’esighị ha esi.

Ihe oriri aghaghịkwa ikwekọ n’ọnọdụ onye nke ọ bụla, a ghaghịkwa ichebara ihe ndị dị ka afọ ndụ, ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, na ụzọ ndụ echiche. Nye ndị toworo eto, ụfọdụ ndị na-atụ aro ka a na-eri òkè abụọ nke mkpụrụ osisi na/ma ọ bụ akwụkwọ nri n’oge nri ọ bụla nakwa irikwu ihe oriri ndị na-adị ná mkpụrụ na ihe oriri ndị na-adị ná mkpo a na-agbawa agbawa. Ndị ụfọdụ na-atụ aro ka a na-eri ihe oriri ndị sitere n’anụmanụ nanị n’ókè dị nta ná nri ọ bụla, na-ahọrọ azụ̀, anụ ọkụkọ e kpepụrụ elu akpụkpọ ahụ́ ya, na anụ ndị na-enweghị abụba. A na-atụkwa aro ka a na-eri abụba na shuga n’ókè dị nta.

Ọbụna ndị bi ná mba ndị ka na-emepe emepe bụ́kwa ndị dara ogbenye pụrụ imeziwanye ihe oriri ha mgbe ụfọdụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịhọrọ ihe oriri ndị na-enye ihe n’ahụ́ nakwa site n’ime mgbanwe na ime ngwakọta, dị ka irikọta ihe oriri ndị na-adị ná mkpụrụ na ihe oriri ndị na-adị ná mkpo a na-agbawa agbawa. Site n’itinye obere anụ ma ọ bụ àkwá ná nri iji mee ka ọ na-enyekwu ihe n’ahụ́. Site n’iji akwụkwọ nri ndị a na-akọ n’ógbè unu na mkpụrụ osisi ndị nọ n’oge ha ji apụta, na-eme ihe.

Onye Okike anyị na-eme ka “nri si n’ala puta” ka ihe a kpọrọ mmadụ nụ ụtọ ha. (Abụ Ọma 104:14) N’Eklisiastis 9:7, Bible na-ekwu, sị: “Jee, were ọṅụ rie nri gị.” Obi abụọ adịghị ya na, site n’ime ihe otú kwesịrị ekwesị na n’imeru ihe n’ókè, anyị pụrụ inweta abamuru nke ihe oriri na-atọ ụtọ ma na-enye ihe n’ahụ́ bụ́ ndị Onye Okike nyeworo anyị.

[Foto dị na peeji nke 24]

ÌGWÈ NKE MBỤ: mkpụrụ akụ́kụ́ na ihe oriri ndị na-eru eru

[Foto dị na peeji nke 24]

ÌGWÈ NKE ABỤỌ: ihe oriri ndị na-adị ná mkpo a na-agbawa agbawa, anụ, azụ̀, àkwá, na mmiri ara ehi na ihe ndị a na-eji ya emepụta

[Foto dị na peeji nke 24]

ÌGWÈ NKE ATỌ: mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri