Ozi Ọma Matiu Dere 26:1-75
-
Ndị nchụàjà kpara nkata igbu Jizọs (1-5)
-
Otu nwaanyị wụrụ mmanụ na-esi ísì ọma n’isi Jizọs (6-13)
-
Ememme Ngabiga ikpeazụ na ịrara Jizọs nye (14-25)
-
Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị (26-30)
-
Jizọs kwuru na Pita ga-agọnahụ ya (31-35)
-
Jizọs kpere ekpere na Getsemeni (36-46)
-
Mgbe e jidere Jizọs (47-56)
-
Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe na Sanhedrin (57-68)
-
Pita gọnahụrụ Jizọs (69-75)
26 Mgbe Jizọs kwuchara ihe a niile, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya:
2 “Unu ma na ọ fọrọ abalị abụọ ka e mee Ememme Ngabiga,+ a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ ka e gbuo ya n’elu osisi.”+
3 Ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu wee zukọta na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Kayafas+
4 ma gbaa izu+ otú ha ga-esi jiri aghụghọ jide Jizọs, gbuokwa ya.
5 Ma, ha nọ na-asị: “Ọ bụghị n’oge ememme a, ka ndị mmadụ ghara ịgbawa aghara.”
6 Mgbe Jizọs nọ na Betani, n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta,+
7 otu nwaanyị ji mkpọ̀ alabasta,* nke mmanụ na-esi ísì ọma dị n’ime ya, bịakwute ya. Mmanụ ahụ dịkwa oké ọnụ. Nwaanyị ahụ wee malite ịwụkwasị ya n’isi ya ka ọ nọ na-eri ihe.
8 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, ha were iwe, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a n’iyi?
9 N’ihi na a gaara ereta ya ezigbo ego ma nye ya ndị ogbenye.”
10 Ebe Jizọs ma ihe ha na-ekwu, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-enye nwaanyị a nsogbu? O meere m ihe ọma.
11 N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.+
12 Nwaanyị a tere m mmanụ a na-esi ísì ọma ka ọ kwadebe m maka olili.+
13 N’eziokwu, ana m asị unu na n’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile, a ga na-akọ ihe nwaanyị a mere, jiri ya na-echeta ya.”+
14 Otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt,+ gakwuuru ndị isi nchụàjà+
15 wee sị ha: “Gịnị ka unu ga-enye m ka m rara ya nye n’aka unu?”+ Ha wee kwekọrịta inye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.+
16 N’ihi ya, malite mgbe ahụ gawa, ọ nọ na-achọ oge ga-adaba adaba ọ ga-eji rara ya nye.
17 N’ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ ndị na-eso ụzọ Jizọs bịakwutere ya, sị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị kwadebere gị ka ị nọrọ rie nri Ememme Ngabiga?”+
18 O wee sị ha: “Banyenụ n’ime obodo, n’ụlọ onye dị otú a. Sịnụ ya, ‘Onye Ozizi sịrị: “Oge m a kara aka dị nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eme Ememme Ngabiga n’ụlọ gị.”’”
19 Ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ihe ọ gwara ha, kwadebekwa maka Ememme Ngabiga ahụ.
20 Mgbe o ruru ná mgbede,+ ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọ na-eri ihe na tebụl.+
21 Mgbe ha nọ na-eri ihe, ọ sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, otu onye n’ime unu ga-arara m nye.”+
22 Ihe a wutere ha nke ukwuu. Ha niile n’otu n’otu amalite ịsị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụghị m, ka ọ̀ bụ m?”
23 O wee sị ha: “Ọ bụ onye mụ na ya ga-amanyekọ aka n’efere ga-arara m nye.+
24 N’eziokwu, Nwa nke mmadụ na-ahapụ unu, otú e dere banyere ya. Ma, onye ga-arara Nwa nke mmadụ nye+ ga-ata ahụhụ.+ Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”+
25 Judas, onye na-aga ịrara ya nye, wee sị ya: “Onye Ozizi,* ọ̀ bụ m?” Jizọs asị ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.”*
26 Mgbe ha nọ na-eri ihe, Jizọs weere otu ogbe achịcha. Mgbe ọ gọzichara ya, ọ nyawara ya,+ nye ya ndị na-eso ụzọ ya, sị ha: “Naranụ, taa. Nke a pụtara ahụ́ m.”+
27 O bukwaara iko, kelee Chineke, bunyekwa ha ya, sị: “Unu niile, ṅụọnụ ihe dị na ya,+
28 n’ihi na nke a pụtara ọbara m,+ bụ́ ‘ọbara ọgbụgba ndụ’+ nke a ga-awụpụ ka e wee gbaghara ọtụtụ ndị+ mmehie ha.+
29 Ma ana m asị unu na agaghị m aṅụ mmanya si ná mkpụrụ vaịn ọzọ ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ nke ọhụrụ n’Alaeze Nna m.”+
30 N’ikpeazụ, mgbe ha bụchara abụ otuto,* ha gawara n’Ugwu Oliv.+
31 Jizọs gwaziri ha, sị: “Unu niile ga-ahapụ m n’abalị a, n’ihi na e dere, sị: ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ, ìgwè atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’+
32 Ma, a kpọlitechaa m n’ọnwụ, m ga-ebu unu ụzọ gaa Galili.”+
33 Ma Pita sịrị ya: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ gị, o nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị.”+
34 Jizọs wee sị ya: “N’eziokwu, ana m asị gị, n’abalị a, tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+
35 Pita asị ya: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, e nweghị ihe ga-eme ka m gọnahụ gị.”+ Ndị ọzọ niile na-eso ụzọ ya kwukwara otu ihe ahụ.
36 Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya bịaziri ebe a na-akpọ Getsemeni.+ O wee sị ha: “Nọdụnụ ala ebe a ka m gaa ebe nke ọzọ kpee ekpere.”+
37 Ọ kpọọrọ Pita na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitekwara ichegbu onwe ya nke ukwuu.+
38 O wee sị ha: “Ọ na-ewutesi m ike.* Nọrọnụ ebe a, sorokwanụ m na-eche nche.”+
39 Mgbe ọ gatụrụ n’ihu, o gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpee ekpere, sị:+ “Nna m, ọ bụrụ na o kwe mee, ka m ghara ịṅụ ihe dị n’iko a.+ Ma, ọ bụghị ka e mee ihe m chọrọ, kama ka ihe ị chọrọ mee.”+
40 Ọ bịaghachiri n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ ma hụ ka ha na-ehi ụra. O wee sị Pita: “Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iso m chee nche ọ bụrụgodị otu awa?+
41 Na-echenụ nche,+ na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile,+ ka a ghara ịnwata unu.+ N’eziokwu, ọ na-agụ mmadụ ime ihe dị mma,* ma anụ ahụ́ ya adịghị ike.”+
42 Ọ gara ọzọ kpee ekpere nke ugboro abụọ, sị: “Nna m, ọ bụrụ na ọ gaghị ekwe omume ka m ghara ịṅụ ihe dị n’iko a, ka uche gị mee.”+
43 Ọ bịaghachikwara hụ ka ha na-ehi ụra, n’ihi na ụra ji ha aka ọjọọ.
44 Ọ hapụrụ ha ọzọ pụọ gaa kpee ekpere nke ugbo atọ, kwughachi otu ihe ahụ.
45 Ọ bịaghachiri ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, sị ha: “N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezukwa ike. Oge eruola ka a rara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie.
46 Bilienụ ka anyị pụọ. Lee, onye ga-arara m nye abịala nso.”
47 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas, otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, bịara, ya na ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na okpiri. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu dunyere ha.+
48 Onye ga-arara ya nye nyere ha ihe àmà, sị: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya. Jidenụ ya.”
49 O wee gakwuru Jizọs, sị: “Onye Ozizi,* ndeewo.” O wee jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.
50 Ma Jizọs sịrị ya: “Enyi, gịnị mere i ji bịa ebe a?”+ Ha wee bịa jide Jizọs, kpụrụ ya.
51 Ma, otu n’ime ndị so Jizọs mịịrị mma agha ya, gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà, bepụ ya ntị.+
52 Jizọs wee sị ya: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya,+ n’ihi na ndị niile na-egbu ndị ọzọ mma agha ga-esi ná mma agha laa n’iyi.+
53 Ka ì chere na mụ agaghị arịọli Nna m ka o zitere m ọtụtụ puku* ndị mmụọ ozi ugbu a?+
54 Ya dị otú ahụ, oleezi otú Akwụkwọ Nsọ, nke kwuru na ihe ga-esi otú a mee, ga-esi mezuo?”
55 Jizọs gwaziri ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ijide m ka à ga-asị na unu bịara ijide onye ohi? M na-anọdụ ala kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ, na-ezi ihe,+ ma unu ejideghị m.+
56 Ma ihe a niile mere ka ihe ndị amụma dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.”+ Ndị na-eso ụzọ ya niile wee hapụ ya gbaa ọsọ.+
57 Ndị jidere Jizọs duuru ya gakwuru Kayafas,+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà, ebe ndị odeakwụkwọ na ndị okenye zukọtara.+
58 Ma Pita nọ ebe dị anya na-eso ya n’azụ, ruo na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà ahụ. Mgbe ọ banyere n’ime, o so ndị na-eje ozi n’ụlọ nọrọ ọdụ ka ọ hụ ihe ga-emecha mee.+
59 N’oge ahụ, ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ so ná ndị Sanhedrin* nọ na-achọgharị ebubo ha ga-ebo Jizọs ka ha wee gbuo ya.+
60 Ma ha achọtaghị, ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara.+ E mechaa, mmadụ abụọ pụtara
61 wee sị: “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọ nsọ Chineke ma jiri ụbọchị atọ rụghachi ya.’”+
62 Nnukwu onye nchụàjà wee bilie ọtọ, sị ya: “Ị̀ gbara nkịtị? Ị́ nụghị ebubo ndị a na-ebo gị?”+
63 Ma Jizọs gbachiri nkịtị.+ N’ihi ya, nnukwu onye nchụàjà ahụ sịrị ya: “Eji m Chineke dị ndụ na-eme ka ị ṅụọ iyi na ị ga-agwa anyị ma ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke.”+
64 Jizọs asị ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.* Ma ana m asị unu: Si ugbu a gawa, unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri Chineke dị ike*+ ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+
65 Nnukwu onye nchụàjà wee dọwaa uwe elu ya, sị: “O kwuluola Chineke! Ànyị ka kwesịrị ịchọwa ndị akaebe? Unu anụlanụ na o kwuluola Chineke.
66 Gịnị ka unu chere?” Ha asị: “O kwesịrị ịnwụ.”+
67 Ha gbụrụ ya asọ mmiri n’ihu+ ma suo ya ọkpọ.+ Ndị ọzọ mara ya ụra n’ihu,+
68 sị ya: “Kraịst, buoro anyị amụma. Ònye tiri gị ihe?”
69 Pita nọkwa ọdụ na mbara èzí ahụ. Otu nwa agbọghọ na-eje ozi ebe ahụ wee bịakwute ya, sị: “Gị na Jizọs onye Galili na-anọ.”+
70 Ma ọ gọrọ agọ n’ihu ha niile, sị: “Amaghị m ihe ị na-ekwu.”
71 Mgbe ọ gara n’ọnụ ụzọ ámá, nwa agbọghọ ọzọ matara na ọ bụ ya wee gwa ndị nọ ebe ahụ, sị: “Nwoke a na Jizọs onye Nazaret na-anọ.”+
72 Ọ gọkwara agọ, ṅụọ iyi, sị: “Amaghị m nwoke ahụ.”
73 Mgbe obere oge gachara, ndị guzo gburugburu bịara sị Pita: “O doro anya na ị bụ otu n’ime ha, n’ihi na n’eziokwu, asụsụ gị agbaala gị àmà.”
74 Ọ maliteziri ịbụ onwe ya ọnụ na ịṅụ iyi, na-asị: “Amaghị m nwoke ahụ.” Ozugbo ahụ, oké ọkpa akwaa.
75 Pita wee cheta na Jizọs sịrị: “Tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ O wee pụọ n’èzí bee ezigbo ákwá.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Grik, “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.
^ Ma ọ bụ “abụ ọma.”
^ Na Grik, “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ọbụna ruo ọnwụ.”
^ Na Grik, “mmụọ dị njikere.”
^ Na Grik, “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Grik, “ụsụụ iri na abụọ.” Otu ụsụụ ndị agha ndị Rom n’oge ochie na-adị malite n’ihe dị ka puku anọ ruo puku isii. Na Baịbụl, “ụsụụ” nwere ike ịbụ ihe a na-agaghị agụtali ọnụ.
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Grik, “n’aka nri nke ike.”
^ Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.