Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere O Ji Sie Oké Ike Mụ na Onye Mụ na Ya Bi n’Otu Ọnụ Ụlọ Ibikọ?

Gịnị Mere O Ji Sie Oké Ike Mụ na Onye Mụ na Ya Bi n’Otu Ọnụ Ụlọ Ibikọ?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Mere O Ji Sie Oké Ike Mụ na Onye Mụ na Ya Bi n’Otu Ọnụ Ụlọ Ibikọ?

“Ana m edozi ihe edozi, ana m edozi ihe nke ọma. Ma mgbe m lọtara n’ụlọ, onye mụ na ya bi na-atụsara n’ala na-ekiri TV—akwụkwọ na ọka e ghere eghe atụsasịakwa ebe nile. Mgbe ọ bụla m lọtara n’ụlọ, m na-eche ihe m gaje ịhụ, m na-asịkwa onwe m, ‘Achọghị m ịba n’ebe ahụ.’”—David.

“Onye mụ na ya bi bụ nwa a zụgburu azụgbu. Ọ dị ka ọ na-eche na o nwere nwa odibo anyị na ya bi. Ọ na-achọkarịkwa ka e mee ihe otú o si chọọ.”—Renee. *

“ỊMỤTA ịnagide àgwà nke onye mmadụ na-amabughị pụrụ ịkụziri mmadụ . . . omume ime mgbanwe na ikike ịhapụwa ihe ụfọdụ,” ka otu isiokwu dị ná U.S.News & World Report na-ekwu. “Ma ịmụta ya na-esikarị ike.” Ndị nwetụrụla onye ha na ya bi n’otu ọnụ ụlọ pụrụ ikweta na ọ bụ eziokwu.

Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ mahadum na-enwe onye ha na ha bi n’otu ọnụ ụlọ iji belata ego a na-emefu n’ịgụ akwụkwọ. Ndị ọzọ na-eto eto na-ebinyere onye ọzọ n’ihi na ha chọrọ inwere onwe ha pụọ n’ebe ndị mụrụ ha nọ. N’etiti ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst, ọtụtụ ahọrọwo inwe onye ha na ha ga-ebi iji nyere ha aka ịchụso ihe ime mmụọ. (Matiu 6:33) Ha na-achọpụta na inwe onye ha na ya ga na-ekerịta ụgwọ mmefu nke ihe e ji ebi ndụ ga-enyere ha aka ije ozi dị ka ndị na-ezisa ozi ọma oge nile. Mgbe ụfọdụkwa, mmadụ inwe onye ya na ya bi bụ ihe ya na ije ozi ala ọzọ nakwa ije ozi n’alaka dịgasị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-eso. *

Teta! so ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ bụ́ ndị ha na ndị ọzọ bikọtụworo nwee nkwurịta okwu. Ha nile kwetara na onye ya na mmadụ bi n’otu ọnụ ụlọ ekwesịghị ịbụ nanị onye ya na ya na-eke ego ụgwọ ụlọ—onye ya na mmadụ bi kwesịrị ịbụ enyi ya, onye ya na ya pụrụ ikwurịta okwu na imekọ ihe. “Anyị na-amụ anya ruo ime abalị na-ekwu ihe gbasara ụmụ nwanyị ma ọ bụ  na-ekiri TV,” ka Lynn na-echeta. “Onye gị na ya bi n’otu ọnụ ụlọ pụkwara ịgba gị ume,” ka Renee na-ekwu. “Oge ụfọdụ ma ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ ego, na-agbalị ịkwụ ụgwọ mmefu, na-agbalị ime nkwusa, ọ dị mma inwe onye gị na ya ga-ebi bụ́ onye ga na-agba gị ume.”

Otú o sina dị, gị na mmadụ ibi—karịsịa onye fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ị na-amabughị ma ọlị—pụrụ ịbụ nnukwute ihe ịma aka. U.S.News & World Report kwuru banyere ọnọdụ na-adị n’ụlọ akwụkwọ mahadum, sị: “N’agbanyeghị mgbalị buru ibu ọtụtụ ụlọ akwụkwọ na-eme ikenyekọta ndị ihe ga-adabara ibikọ, a na-enwekarị ihe ndị na-adịghị mma na-esi na ya apụta.” N’ezie, a hụwo na esemokwu nke na-adị n’etiti ndị na-ebikọ ọnụ na mahadum na-erukarị n’ókè nke ime ihe ike! Ógbè Intanet apụtawo bụ́ ndị na-enye ụmụ akwụkwọ ohere igosipụta obi nkoropụ ha nke yiri ihe na-adịghị agwụ agwụ n’ebe ndị ha na ha bi nọ. Olee ihe mere mmadụ iso onye ọzọ biri ji esikarị ike?

Gị na Onye Ị Na-amabughị Ibi

“Ibinyere onye ị na-amabughị yiri ka ọ bụ ahụmahụ na-akpali akpali,” ka Mark na-ekwu. “Ị maghị n’ezie otú iso onye ahụ biri ga-adị.” N’ezie, echiche nke iso onye o nwere ike ịbụ na ọ dịghị ọtụtụ ihe gị na ya nwekọrọ mmasị na ha biri pụrụ nnọọ ịdị na-akpata obi erughị ala. N’eziokwu Ndị Kraịst kwesịrị inwe ọtụtụ ihe ha pụrụ inwekọ mmasị na ha ma kwurịta. Otú ọ dị, David kwetara, sị: “E nwere ọtụtụ ihe na-atụ m ụjọ banyere inwe onye mụ na ya ga-ebi.”

Otú ọ dị, o mesịrị bụrụ na onye e tinyekọtara ya na David sikwa n’obodo ukwu. Ma ọ bụchaghị ndị nile e kenyekọtara ọnụ ka ọ na-adabakọrọ. Mark na-ekwu, sị: “Onye mbụ mụ na ya biri anaghị ekwukebe okwu. Mgbe gị na mmadụ bi n’otu ọnụ ụlọ, ọ dị mkpa n’ezie ka unu na-ekwukọrịta okwu. Ma ọ dịghị ekwu okwu. Nke a malitere iwe m iwe.”

Ndịrịta iche nke ebe mmadụ nọ tolite pụkwara ịkpata nsogbu ndị ọzọ. Lynn na-ekwu sị: “Mgbe mbụ ị malitere ibiri onwe gị, ị na-achọ ime ihe otú o si masị gị. Ma n’oge na-adịghị anya ị na-achọpụta na e nwere ndị ọzọ ị ga-echebara echiche.” N’ezie ọ ga-abụ ihe ijuanya ịhụ otú ndị mmadụ si ele ihe anya n’ụzọ dị nnọọ iche mgbe i siri n’okpuru nchebe nke ezinụlọ gị pụọ.

Nzụlite Dịgasị Iche, Ụzọ Ime Ihe Dịgasị Iche

Ihe dị ukwuu na-adabere na mmadụ inweta ọzụzụ—ma ọ bụ enwetaghị ọzụzụ—site n’aka ndị mụrụ ya. (Ilu 22:6) Fernando na-eto eto na-ekwu, sị: “Ana m edozi ihe edozi, ma onye mụ na ya bi na-aghasasị ihe aghasasị. Ka e were ebe a na-edebe ákwà dị ka ihe atụ: Ọ na-enwe mmasị ịtụsasị ihe ebe nile. M na-enwe mmasị ikowe ihe ekowe.” Mgbe ụfọdụ ndịrịta iche nke ụkpụrụ na-adị nnọọ iche nke ukwuu.

Renee na-echeta, sị: “Ọ dị onye mụ na ya biri, bụ́ onye ọnụ ụlọ ebe ọ na-ehi ụra na-adị ka ebe a na-ekpofu ihe! O nwewokwa ndị mụ na ha biri bụ́ ndị na-adịghị ehicha elu tebụl mgbe ha risịrị nri ma ọ bụ na-ahapụ efere ha ji rie nri n’ime ebe a na-asa efere ruo ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ.”

Ee, a bịa n’ọrụ ụlọ, ụfọdụ ndị ha na mmadụ bi na-abụ nnọọ ihe ahụ Ilu 26:14 kwuru: “Dị ka ibo ọnụ ụzọ si emegharị n’ihe nkonye ya, otú a ka onye umengwụ na-emegharị n’ihe ndina ya.”

N’aka nke ọzọ, iso onye na-adịbiga ọcha ókè biri adịghịkwa enyecha obi ụtọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lee na-ekwu banyere otu onye ya na ya biri, sị: “Nye ya, e kwesịrị ịdị na-ehicha ihe kwa awa. Adịghị m eru unyi, ma mgbe ụfọdụ ana m ahapụ ihe ụfọdụ, dị ka akwụkwọ, n’elu àkwà m. Ọ na-adị ya ka ya gwa m ihe m ga-eme.”

Ọzọ, ndị ha na mmadụ na-ebikọ pụrụ inwe echiche nke ha banyere ịdị ọcha onwe onye. Mark na-akọwa, sị: “Onye mụ na ya bikọrọ na-eteta ụra mgbe oge na-adịkwaghị. Ọ na-agbara gaa n’ebe a na-akwọ aka, kwọsa mmiri n’isi ya, tipụ.”

Ndịrịta iche nke ebe mmadụ nọ tolite na ụdị onye mmadụ bụ pụrụ inwe mmetụta n’ụdị egwuregwu na ntụrụndụ na-amasị ya. “Anyị adịghị enwe mmasị n’otu ụdị egwú,” ka Mark kwuru banyere onye ya na ya bi. Otú ọ dị, n’ebe onye ọ bụla na-akwanyere ibe ya ùgwù, ndịrịta iche dị otú ahụ pụrụ ịba uru, ikekwe na-enyere mmadụ abụọ na-ebikọ ọnụ aka ịmụba ihe ndị na-amasị  ha. Ma ọtụtụ mgbe, ndịrịta iche ndị a na-akpata esemokwu. “M na-enwe mmasị n’egwu ndị Spen,” ka Fernando na-ekwu, “ma onye mụ na ya bi na-akatọ ya mgbe nile.”

Fon—Nsogbu

Iji telifon eme ihe pụrụ ịbụ otu n’ime ihe ndị kasị akpata esemokwu. Mark na-ekwu, sị: “M ga-achọ ịlakpu. Ma onye mụ na ya bi ga-amụ anya na-ekwu okwu na telifon ruo mgbe chi jimiri. Nke a pụrụ ịbụ ihe na-akpasu iwe mgbe oge ụfọdụ gatụrụ.” Lynn na-echeta ihe yiri nke ahụ, sị: “Mgbe ụfọdụ ndị enyi nke onye mụ na ya bi na-akpọ ya na fon n’elekere anya atọ ma ọ bụ nke anọ nke ụtụtụ. Ọ bụrụ na ọ nọghị ya, m na-ebili gaa zaa fon ahụ.” Olee otú ha si dozie nsogbu ha? “Anyị hụrụ na onye ọ bụla nwere fon nke ya.”

Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nile na-eto eto ga-azụtali fon nke ha, a na-amanyekwa ọtụtụ ndị iji otu fon na-emekọ ihe ọnụ. Nke a pụrụ ime ka e nwee oge ndị a ga-enwe obi ilu. Renee na-echeta, sị: “Otu n’ime ndị mụ na ha biri so otu nwa okorobịa na-eyi oge mkpapụ, ọ na-anọkwa na fon ruo ọtụtụ awa. N’otu ọnwa, ọ kpọtara ihe karịrị dollar 90 n’ụgwọ. Ebe anyị nile kwekọrịtaworo ike ego mmefu n’ụzọ hà nhata, ọ tụrụ anya ka onye ọ bụla n’ime anyị soro kwụọ ụgwọ ahụ.”

Nanị inwe fon pụrụ ịbụ nsogbu ọzọ. “Mụ na onye tọtụrụ m bi,” ka Lee na-echeta. “Anyị nwekwara nanị otu telifon. M na-eji fon eme ihe mgbe nile, n’ihi na m nwere ọtụtụ ndị enyi. Ọ tụpụghịrị m ọnụ. M na-eche na ọ bụrụ ọ chọrọ iji fon mee ihe na ọ ga-agwa m. Ugbu a ka m ghọtara na mụ adịghị echebara ya echiche.”

Enweghị Oge Ịnọrọ Nanị Gị

“Onye ọ bụla na-achọ ịnọrọ onwe ya oge ụfọdụ,” ka David na-ekwu. “Mgbe ụfọdụ, nanị ihe m na-achọ bụ idinara ala na-ezu ike.” Otú ọ dị, mgbe gị na mmadụ bi, ịchọta oge ị ga-anọ nanị gị pụrụ isi ike. “M na-enwe mmasị inwe oge m ga-anọ nanị m,” ka Mark na-ekweta. “N’ihi ya, ihe kasịworo siere m ike bụ enweghị oge m ga-anọ nanị m. Mụ na onye mụ na ya bi nwere otu usoro ihe omume. N’ihi ya, ọ na-esi ike ịchọta oge ịnọ nanị gị.”

Ọbụna Jizọs Kraịst nwere mgbe ụfọdụ ịnọ nanị ya dị ya mkpa. (Matiu 14:13) Ya mere, ọ pụrụ ịbụ ihe na-akụda mmụọ mgbe ọnụnọ nke onye gị na ya bi na-eme ka ịgụ akwụkwọ, ịmụ ihe, ma ọ bụ ịtụgharị uche sie ike ma ọ bụ ghara ikwe omume. Mark na-ekwu, sị: “Ọ na-esi ike ịmụ ihe n’ihi na ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe ihe na-emenụ. Ọ ga-akpọ ndị enyi ya òkù ịbịa nọnyere ya n’ụlọ, ọ na-ekwu okwu na telifon, ma ọ bụ ọ na-ekiri TV ma ọ bụ na-egere redio.”

Ka o sina dị, ọtụtụ puku ndị na-eto eto enwewo ihe ịga nke ọma n’iso onye ọzọ biri n’agbanyeghị ihe ịma aka dị n’ịnagide onye ya na mmadụ bi. Isiokwu ndị ọzọ ga-apụta n’usoro isiokwu a ga-atụle ụzọ ndị dị irè isi nweta ihe kasị mma n’inwe onye gị na ya bi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 6 Ọ bụ ezie na ndụmọdụ a bụ maka ndị na-eto eto, ọ pụkwara ịba uru nye ndị meworo okenye bụ́ ndị ha na onye ọzọ na-aghaghị ịmalite ibikọ n’ihi mgbanwe nke ọnọdụ, dị ka mmadụ ịbụ onye di ya nwụnahụrụ.

[Foto dị na peeji nke 10, 11]

Inwe mmasị n’ụdị egwú dịgasị iche pụrụ ịbụ ihe ịma aka

[Foto dị na peeji nke 12]

Echebaraghị ndị ọzọ echiche pụrụ ịkpata nsogbu