Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Kasị Mma Isi Gboo Mkpa Ime Mmụọ Gị

Ụzọ Kasị Mma Isi Gboo Mkpa Ime Mmụọ Gị

 Ụzọ Kasị Mma Isi Gboo Mkpa Ime Mmụọ Gị

N’IHI GỊNỊ KA okpukpe ji dị ndị mmadụ mkpa? Ụfọdụ ndị ga-asị na ndị mmadụ na-echigharịkwuru ihe ime mmụọ iji nọrọ ná nchebe n’ụwa nke na-anọghị ná nchebe. Ma ọ gụnyere ihe karịrị nke ahụ. Otu isiokwu dị n’akwụkwọ bụ́ American Sociological Review kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị mkpa maka ịnọ ná nchebe na-adọta ndị mmadụ n’okpukpe. Ndị mmadụ anọwo mgbe nile na-achọ azịza nye ajụjụ ndị dị ka: Ebee ka anyị si bịa? Ebee ka anyị na-aga? N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a?”

 Obi abụọ adịghị ya na ị ga-ekweta na ajụjụ ndị ahụ dị nnọọ mkpa. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ na ha achọghị azịza ndị a pụrụ ịdabere na ha? Ajụjụ ndị dị otú ahụ dị oké mkpa, baa uru nke na ha abụghị ndị a ga-aza nanị site n’ịhọtagasị nkwenkwe okpukpe site n’ọdịnala dịgasị iche iche n’ihi na ha masịrị anyị n’onwe anyị. N’ezie, usoro ka mma dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-achọta azịza ndị rijuru afọ, ndị a pụrụ ịdabere na ha, nke ajụjụ ndị ka mie emie nke ndụ.

Ọ̀ dị ihe ka mma? Ferrar Fenton, bụ́ onye nsụgharị Bible, kwuru ihe dị ịrịba ama banyere akwụkwọ ahụ. Ọ kpọrọ ya “nanị mkpịsị ugodi nke na-akpọghere Mmadụ Ihe Omimi nke Eluigwe na Ala, nakwa nke na-ekpughere Mmadụ Ihe Omimi Banyere Onwe Ya.” Ee, Bible na-aza ajụjụ banyere oge gara aga, oge dị ugbu a, na ọdịnihu. Ọ na-agwa anyị ebe anyị si bịa, ihe bụ́ nzube nke ndụ, otú anyị pụrụ isi chọta obi ụtọ, na ihe ọdịnihu anyị ga-abụ. Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke nweworo mmetụta n’ahụ́ mmadụ dị ka Bible; ọ dịbeghịkwa akwụkwọ ọzọ lanarịworo ọtụtụ ajọ mwakpo dị ka ya. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji eleghara akwụkwọ a pụrụ iche anya n’ọchịchọ ha na-achọ azịza nke ajụjụ ndị metụtara ndụ?

Ọtụtụ ndị ewepụtatụbeghị oge iji tụlee ndịrịta iche dị nnọọ ukwuu dị n’etiti Bible na chọọchị ndị ha mawooro. Ha ahụwo otú ndị a sị na ha bụ Ndị Kraịst si egburịta ibe ha n’aha Chineke. Ọtụtụ ndị emewo mkpesa, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian kwuru, na “n’ụbọchị ndị a, ndị ụkọchukwu na-enwe mmasị n’ịnakọta ego karịa n’ime nleta iji nye nlekọta na nduzi ime mmụọ.” Ikekwe ha na-eche na Bible kwadoro ma ọ bụ na-anabata àgwà dị otú ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Bible nyere Ndị Kraịst iwu ịdị “na-ahụrịta ibe [ha] n’anya,” ọ na-agwakwa ndị na-ekwusa okwu ya, sị, “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Jọn 13:34; Matiu 10:8) Mgbe ahụ, ò ziri ezi ikpebi ịba uru nke Bible dabere n’omume nke ndị na-azọrọ na ha na-akwanyere ya ùgwù ma ghara ịdị na-agbaso ya?

Ọtụtụ ndị kweere na Bible ekwekọghị na sayensị, nakwa na ọ na-emegide onwe ya, bụrụkwa nke oge ya gaferela. Ma nnyocha e ji nlezianya mee na-egosi ihe dị iche. N’eziokwu, Bible abụghị akwụkwọ sayensị. Ma, mgbe ọ bụla o kwuru okwu n’isiokwu ndị metụtara sayensị—dị ka usoro ihe ndị dị ndụ ji pụta n’elu ala, ọdịdị nke ụwa, ma ọ bụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi gwọọ ọrịa na-efe efe—Bible adịghị ekwu ihe na-ezighị ezi. N’ụzọ dị iche, o kwuru ihe ndị were ọtụtụ narị afọ tupu sayensị amata ha. Ọ bụkwa ezie na Bible nwere akwụkwọ 66 ma bụrụ nke were ihe karịrị afọ 1,600 iji dechaa ya, ha nile nwere nkwekọrịta. Ọzọkwa, Bible na-egosipụta nghọta pụrụ iche banyere ọdịdị mmadụ, na-eme ya ka ọ bụrụ akwụkwọ kwekọrọ n’oge a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

Akwụkwọ a dị ịrịba ama na-ekwu ihe dị oké mkpa banyere ife Chineke. Ọ na-ekwu na ofufe dị otú ahụ aghaghị ịbụ nke e fere, ọ bụghị dabere n’ihe mmadụ kpebiri, kama dabere n’ihe Chineke kpebiri. (Jọn 5:30; Jems 4:13-15; 2 Pita 1:21) Ma mmadụ ole na ole anabatawo ma gbasoo ụkpụrụ ahụ n’ezie. Site n’oge ndị mbụ, ndị mmadụ emewo okpukpe ka o kwekọọ ná nzube nke ha. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị mgbe ndị mmadụ pịrị chi ha dị iche iche site ná mkpirisi osisi ma na-efe ha ofufe. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị mgbe okpukpe dị iche iche na-akụzi ozizi ndị ha chepụtara echepụta. Ọ̀ bụ na ọ bụghịkwa otú ahụ ka ọ dị n’ebe ndị ahụ na-eme ka okpukpe onwe onye kwekọọ n’ọchịchọ nke ha?

Tụlee ihe dị iche a pụrụ ime. Gịnị ma i mee dị ka ọkàikpe ukwu nke Ụlọikpe Kasị Elu nke United States mere? N’otu ụzọ ahụ o si ekpe ikpe n’ụlọikpe, o ji ezi obi nyochaa ihe àmà na-akwado ma ọ bụ na-emegide ịbụ eziokwu nke Bible. Gịnị si na ya pụta? O kwuru, sị: “Eruwo m ná nkwubi okwu bụ́ na Bible bụ akwụkwọ sitere n’aka onye nwere ike karịrị ike mmadụ, na o sitere n’aka Chineke.”

Olee otú ị pụrụ isi mee nnyocha yiri nke ahụ n’onwe gị? Otu aro bụ, ị pụrụ ịnwale iji nlezianya na-amụchi Bible anya, na-enyocha azịza ya nye ajụjụ ndị e welitere ná mmalite nke isiokwu a. E nwere ihe dị ka nde Ndịàmà Jehova isii, ná mba 235, bụ́ ndị nweworo ọmụmụ ihe dị otú ahụ. Ha na-enye oge ha n’afọ ofufo iji soro ndị ọzọ kwurịta ihe ha mụtaworo. Ọmụmụ Bible ebe obibi ha na-eduzi n’efu enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka ịchọta okpukpe na-abụghị nke ọpụtara taa laa echi ma ọ bụ nke dabeere n’ọchịchọ onwe onye. Iso Ụzọ Kraịst nke bụ́ ezigbo ya ma dị ọcha bụ́ nke a kọwara n’ime Bible abụghị nnọọ okpukpe ọzọ nkịtị. Ọ na-anọchite anya eziokwu banyere Chineke na nzube ya. Ya mere, gịnị mere ị ga-eji họrọ nke na-erughị eru?—Jọn 17:17.

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ụzọ kasị mma isi gboo mkpa ime mmụọ gị bụ ịmụta banyere Chineke site na Bible ma soro ezi ndị na-efe ofufe na-akpakọrịta