Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụta Ihe N’otú Jehova na Jizọs Si Enwe Ndidi

Mụta Ihe N’otú Jehova na Jizọs Si Enwe Ndidi

Mụta Ihe N’otú Jehova na Jizọs Si Enwe Ndidi

“Na-agụkwanụ ndidi Onyenwe anyị dị ka nzọpụta.”​—2 PITA 3:15.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Olee otú Jehova sirila gosi na o nwere ndidi?

Gịnị mere Jizọs ji nwee ndidi ruo ogologo oge?

Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji mee ka anyị nwekwuo ndidi ka Chineke?

1. Gịnị ka ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-ajụ onwe ha?

OTU nwanna nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi nke diri ọtụtụ ihe isi ike ruo ọtụtụ afọ ji obi umeala jụọ, sị, “Ọgwụgwụ ọ̀ ga-abịa tupu mụ anwụọ?” Ụfọdụ ndị jeerela Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ na-eche otu ihe ahụ. Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ mgbe Chineke ga-eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ ma wepụ nsogbu ndị na-emekpa anyị ahụ́ taa. (Mkpu. 21:5) N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kwere na ọgwụgwụ ụwa Setan adịla ezigbo nso, o nwere ike isiri anyị ike iji ndidi chere ụbọchị ahụ.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle banyere ndidi Chineke?

2 Ma, Baịbụl kwuru na anyị ga-enwerịrị ndidi. Dị ka ndị ohu Chineke n’oge gara aga, anyị ga-enweta ihe Chineke kwere ná nkwa ma ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe siri ike ma jiri ndidi chere oge ọ ga-emezu nkwa ndị ahụ. (Gụọ Ndị Hibru 6:11, 12.) Jehova n’onwe ya nwere ndidi. A sị na ọ chọrọ, ọ gaara akwụsịla ihe ọjọọ, ma, ọ na-echere oge kacha mma ọ ga-eme ya. (Rom 9:20-24) Gịnị mere o ji nwee ndidi otú ahụ? Olee otú Jizọs sirila ṅomie ndidi Chineke ma gosi anyị ihe nlereanya? Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị amụta inwe ndidi ka Chineke? Azịza ajụjụ ndị a nwere ike inyere anyị aka inwekwu ndidi na okwukwe siri ike, a sịgodị na o yie anyị ka Jehova ọ̀ nọọla ọdụ imezu nkwa ya.

GỊNỊ MERE JEHOVA JI ENWE NDIDI?

3, 4. (a) Gịnị mere Jehova ji nwee ndidi ka ihe o zubere maka ụwa mezuo? (b) Gịnị ka Jehova mere mgbe Adam na Iv nupụrụ isi n’Iden?

3 E nwere ezi ihe mere Jehova ji enwe ndidi. Ọ bụ eziokwu na o nweghị onye ka ya ike ma n’eluigwe ma n’ụwa; ma isi ahụ e nupụrụ n’Iden mere ka e nwee ajụjụ ụfọdụ dị mkpa e kwesịrị ịza otú ọ ga-abara ma ndị nọ n’eluigwe ma ndị nọ n’ụwa uru. Jehova nọ na-enwe ndidi kemgbe ahụ n’ihi na ọ ma na ịza ajụjụ ndị ahụ nke ọma ga-ewe oge. Ebe ọ ma otú ndị niile nọ n’eluigwe na n’ụwa si eme omume nakwa otú ha si eche echiche, ọ na-eme ihe niile otú ga-akacha baara anyị uru.—Hib. 4:13.

4 Jehova zubere ka ụmụ Adam na Iv jupụta ụwa. Mgbe Setan duhiere Iv, Adam emechaakwa nupụ isi, Chineke ahapụghị nzube ya. Ụjọ atụghị ya, o meghịkwa mkpebi n’echeghị echiche ma gbahapụ ụmụ mmadụ. Kama, o chepụtara otú ọ ga-esi mezuo ihe o zubere maka ụmụ mmadụ na ụwa. (Aịza. 55:11) Iji mezuo nzube ya ma gosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị ihe ndị o kere eke, Jehova jidere onwe ya ma nwee ndidi, cheredị ọtụtụ puku afọ ka ihe ụfọdụ o zubere mezuo otú kacha mma.

5. Olee ngọzi ụmụ mmadụ ga-enweta n’ihi otú Jehova si enwe ndidi?

5 Ihe ọzọ mere Jehova ji jiri ndidi chere bụ ka ọtụtụ ndị nwekwuo ike inweta ndụ ebighị ebi. Ugbu a, ọ na-eme ndokwa ịnapụta “oké ìgwè mmadụ.” (Mkpu. 7:9, 14; 14:6) Jehova ji ozi ọma anyị na-ekwusa na-akpọ ndị mmadụ òkù ka ha mụta banyere Alaeze ya na ihe ndị ọ chọrọ ka ha na-eme. Ozi Alaeze ahụ bụ ozi kacha mma e nwere ike izi ụmụ mmadụ. N’eziokwu, ọ bụ “ozi ọma.” (Mat. 24:14) Onye ọ bụla Jehova dọtara na-abata n’ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke ndị nọ na ya bụ ndị enyi hụrụ ezi ihe n’anya. (Jọn 6:44-47) Chineke anyị hụrụ anyị n’anya na-enyere ndị dị otú ahụ aka ime ihe na-atọ ya ụtọ. O sikwa n’etiti ụmụ mmadụ na-ahọrọ ndị ga-eso chịa n’eluigwe. Mgbe ha ga-anọ n’eluigwe, ha ga-enyere ụmụ mmadụ na-erube isi aka izu okè na ịdị ndụ ebighị ebi. N’eziokwu, n’agbanyeghị na Jehova ji ndidi na-eche ka nzube ya mezuo, ọ nọ na-arụ ọrụ kemgbe iji mezuo nkwa ya ka ọ baara anyị uru.

6. (a) Olee otú Jehova si nwee ndidi n’oge Noa? (b) Olee otú Jehova si na-enwe ndidi n’oge anyị a?

6 Ọ bụrụgodị na a kpasuo Jehova ezigbo iwe, ọ na-enwe ndidi. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ihe o mere mgbe ndị mmadụ nọ na-eme ihe ọjọọ tupu Iju Mmiri. Omume rụrụ arụ na ime ihe ike jupụtara ụwa n’oge ahụ, ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme ‘wutekwara’ Jehova. (Jen. 6:2-8) Ọ gaghị ahapụ ha ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, o kpebiri iji iju mmiri bibie ndị ahụ na-enupụrụ ya isi. Mgbe “Chineke ji ndidi na-echere n’ụbọchị Noa,” ọ haziri otú ọ ga-esi napụta Noa na ezinụlọ ya. (1 Pita 3:20) Mgbe oge ruru, Jehova gwara Noa ihe ọ chọrọ ime ma gwa ya ka ọ rụọ ụgbọ. (Jen. 6:14-22) Ihe ọzọ bụ na Noa, bụ́ “onye na-ekwusa ezi omume,” nọ na-agwa ndị agbata obi ya na Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ n’oge na-adịghị anya. (2 Pita 2:5) Jizọs kwuru na oge anyị yiri oge Noa. Jehova ekpebiela mgbe ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Ọ dịghị mmadụ maara ‘ụbọchị na oge awa’ ọ ga-eme ya. (Mat. 24:36) Ugbu a, Chineke nyere anyị ọrụ ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị na ịgwa ha ihe ha ga-eme ka a zọpụta ha.

7. Jehova ọ̀ nọọla ọdụ imezu nkwa ya? Kọwaa.

7 O doro anya na ndidi Jehova na-enwe apụtaghị na naanị ihe ọ na-eme bụ ichere ka oge gafee. Anyị ekwesịghị iche na ọ chọghị ịma ihe na-emenụ! Ma, anyị nwere ike ịna-eche otú ahụ ka anyị na-aka nká ma ọ bụ na-ata ahụhụ n’ụwa ọjọọ a. Obi nwere ike ịda anyị mbà ma ọ bụ anyị echee na Chineke anọọla ọdụ imezu nkwa ya. (Hib. 10:36) Ka anyị ghara ichefu na o nwere ezigbo ihe mere o ji na-enwe ndidi nakwa na o ji ugbu a na-eme ihe ga-abara ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi uru. (2 Pita 2:3; 3:9) Ka anyị tụlezie otú Jizọs si nwee ndidi ka Chineke.

OLEE OTÚ JIZỌS SI GOSI EZI IHE NLEREANYA N’INWE NDIDI?

8. Olee otú Jizọs si nwee ndidi?

8 Jizọs na-eme uche Chineke, o jirikwala obi ụtọ mee ya ruo ọtụtụ puku afọ. Mgbe Setan nupụrụ isi, Jehova kpebiri na Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ga-abịa n’ụwa ma bụrụ Mesaya. Chegodị ihe ọ pụtara. Ọ pụtara na Jizọs ga-eji ndidi chere ọtụtụ puku afọ ka oge ahụ ruo. (Gụọ Ndị Galeshia 4:4.) Ọ nọghị nkịtị n’oge ahụ niile; kama, ọ nọ na-arụ ọrụ Nna ya nyere ya. Mgbe o mechara bịa n’ụwa, ọ maara na Setan ga-eme ka e gbuo ya, dị ka e buru n’amụma. (Jen. 3:15; Mat. 16:21) O ji ndidi kweta ime uche Chineke n’agbanyeghị na ọ ga-ata ahụhụ ma nwụọ. Otú o si kwesị ntụkwasị obi enweghị atụ. O cheweghị banyere onwe ya na ọkwá ya. Anyị kwesịkwara iṅomi ya.—Hib. 5:8, 9.

9, 10. (a) Gịnị ka Jizọs nọ na-eme ka ọ na-eche ka Jehova mezuo nkwa ya? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele oge Jehova kara aka anya?

9 Mgbe Jizọs si n’ọnwụ bilie, Chineke nyere ya ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa. (Mat. 28:18) O ji ikike ahụ emezu uche Jehova n’oge Chineke kara aka. Jizọs ji ndidi nọrọ n’aka nri Chineke na-eche ruo afọ 1914, bụ́ mgbe e debere ndị iro ya ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya. (Ọma 110:1, 2; Hib. 10:12, 13) N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ebibi ụwa Setan. Ma ugbu a, Jizọs ji ndidi na-enyere ndị mmadụ aka ma na-eduga ha ná “mmiri nke ndụ.”—Mkpu. 7:17.

10 Ihe nlereanya Jizọs ò mere ka ị mụta otú i kwesịrị isi na-ele oge Jehova kara aka anya? O doro anya na Jizọs dị njikere ime ihe ọ bụla Nna ya gwara ya; ma o cheere oge Chineke kara aka. Ka anyị na-echere mgbe a ga-ebibi ụwa Setan, anyị niile kwesịrị inwe ụdị ndidi Chineke nwere, chere nduzi Chineke ma ghara ịda mbà wee kwụsị ife Chineke. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ndidi otú ahụ?

OLEE OTÚ M GA-ESI MỤTA INWE NDIDI KA CHINEKE?

11. (a) Olee otú inwe ndidi si gbasa inwe okwukwe? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị inwe okwukwe siri ike?

11 Tupu Jizọs abịa n’ụwa, ndị amụma na ezi ndị ohu Chineke ndị ọzọ gosiri na mmadụ na-ezughị okè nwere ike iji ndidi tachie obi. E nwere otú okwukwe ha si gbasa ndidi ha. (Gụọ Jems 5:10, 11.) A sị na ha enweghị okwukwe, ma ọ bụ na ha ekwetaghị ihe Jehova gwara ha, hà gaara eji ndidi chere ka nkwa ya mezuo? Ugboro ugboro, ha meriri ọnwụnwa ndị siri ezigbo ike n’ihi na obi siri ha ike na Chineke ga-emezu nkwa ya. (Hib. 11:13, 35-40) Baịbụl gosiri na e nwere ihe mere anyị ji kwesị inwe okwukwe siri ike. Jizọs abụrụla “Onye Mmezu nke okwukwe anyị.” (Hib. 12:2) O mezuru ọtụtụ amụma, meekwa ka anyị ghọtakwuo nzube Chineke otú ga-eme ka anyị nwee okwukwe.

12. Olee ihe anyị nwere ike ime iji nwekwuo okwukwe?

12 Olee ihe anyị nwere ike ime ka okwukwe anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị nwekwuo ndidi? Otu ihe dị mkpa bụ iso ndụmọdụ Chineke. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe ndị mere i ji kwesị ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Ì nwere ike ịgbasikwu mbọ ike ime ihe ahụ Jizọs kwuru na Matiu 6:33? I nwere ike iwepụtakwu oge na-aga ozi ọma ma ọ bụ gbanwee ihe ụfọdụ n’otú i si ebi ndụ. Echefula otú Jehova sirila gọzie mbọ ndị ị na-agba kemgbe. O nwere ike ịbụ na o meela ka ị malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl ma ọ bụ nyere gị aka inwe “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Gụọ Ndị Filipaị 4:7.) Ọ bụrụ na ị na-atụgharị uche n’uru ndị ahụ i riterela maka ime ihe Jehova kwuru, ị ga-aghọtakwu na inwe ndidi bara uru.—Ọma 34:8.

13. Olee ihe atụ ga-enyere anyị aka ịghọta otú okwukwe si eme ka anyị nwekwuo ndidi?

13 E nwere ihe atụ ga-enyere anyị aka ịghọta otú okwukwe anyị nwere ike isi mee ka anyị nwekwuo ndidi. Onye ọrụ ubi na-akụ mkpụrụ, na-elekọta ya, mechaakwa ghọọ mkpụrụ ya. Mgbe ọ bụla onye ọrụ ubi ghọtara mkpụrụ buru ibu n’ubi ya, obi na-esikwu ya ike ịkụ mkpụrụ ọzọ n’ubi ya. Ọ bụ eziokwu na ọ ga-echere ka oge iwe ihe ubi ruo, ọ gaghị eme ka ọ ghara ịkụ mkpụrụ n’ubi ya, ikekwe kụọdị karịa otú ọ kụrụ n’afọ gara aga. Obi na-esi ya ike na ọ ga-aghọta mkpụrụ n’ubi ya. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị amụta ndụmọdụ Jehova, na-eme ihe anyị mụtara, na-eritekwa uru na ya, anyị ga-atụkwasịkwu Jehova obi. Okwukwe anyị ga-esikwu ike, ọ ga-adịkwuru anyị mfe ichere ka Jehova gọzie mgbalị anyị n’ihi na anyị maara na ọ ga-eme otú ahụ.—Gụọ Jems 5:7, 8.

14, 15. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata anya?

14 Otú ọzọ anyị nwere ike isi mụta inwe ndidi bụ ịtụle otú anyị kwesịrị isi na-ele ụwa na ọnọdụ anyị anya. Gbalịa ịna-ele ihe anya otú Jehova si ele ya. Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee otú o si ele ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata anya. Ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata na-ewute ya kemgbe ụwa; n’agbanyeghị nke ahụ, o kwebeghị ka mwute mee ka ike gwụ ya ime ihe ziri ezi. O zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya “ka o wee bibie ọrụ Ekwensu” ma mezie ihe niile Setan mebiiri ụmụ mmadụ. (1 Jọn 3:8) Nke bụ́ eziokwu bụ na ahụhụ ahụ agaghị adịte aka, ma Chineke ga-ewepụ ya ruo mgbe ebighị ebi. N’otu aka ahụ, kama ikwe ka ihe ọjọọ juru n’ụwa a Setan na-achị mee ka obi daa anyị mbà ma ọ bụ mee ka anyị chegbuwe onwe anyị banyere mgbe ihe ọjọọ ndị a ga-akwụsị, ka anyị nwee okwukwe n’ihe ndị a na-adịghị ahụ anya, bụ́ ihe ndị ga-adịru mgbe ebighị ebi. Jehova ekpebiela mgbe ọ ga-ewepụ ihe ọjọọ, ọ ga-ewepụkwa ya mgbe oge ahụ ruru.—Aịza. 46:13; Nehọ. 1:9.

15 N’oge ikpeazụ a tara akpụ, e nwere ike ịnwa anyị ọnwụnwa siri ike, bụ́ ndị nwere ike imebi okwukwe anyị. Kama iwe iwe mgbe e mesoro anyị ihe ike ma ọ bụ mgbe ndị anyị hụrụ n’anya na-ata ahụhụ, anyị kwesịrị ikpebisi ike ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam. Anyị ezughị okè. N’ihi ya, ọ gaghị adị mfe. Ma, cheta ihe Jizọs mere, bụ́ nke a kọrọ na Matiu 26:39.Gụọ ya.

16. Olee ihe anyị kwesịrị izere ugbu a?

16 Ihe nwere ike ime ka anyị ghara inwe ụdị ndidi Chineke nwere bụ ịbụ a hụ n’anya e kwe. Gịnị ka ọ pụtara? Ọ bụrụ na obi esighị mmadụ ike na ọgwụgwụ adịla nso, o nwere ike ịmalite ime atụmatụ ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na ihe emeghị otú Jehova si kwuo. O nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Ka m lee ma Jehova ọ̀ ga-emezu okwu ya.’ O nweziri ike ịchọwa imere onwe ya aha n’ụwa a, ịchọ ịbụ aka ji akụ̀ kama ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, ma ọ bụ iche na ọ bụ ịga mahadum ga-eme ka ihe dịrị ya mma n’ụwa ochie a. Ma, nke ahụ ọ́ gaghị egosi na onye ahụ enweghị okwukwe? Cheta na Pọl gbara anyị ume ka anyị ṅomie ndị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị “sitere n’okwukwe na ndidi” nweta ihe ndị Jehova kwere ha ná nkwa. (Hib. 6:12) Jehova agaghị ekwe ka ụwa ọjọọ a jiri otu ụbọchị nọfee mgbe o kpebirila ibibi ya. (Hab. 2:3) Ka ọ dị ugbu a, anyị ekwesịghị ịna-efe Jehova iji mezuo iwu. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịmụrụ anya mgbe niile ma na-ekwusasi ozi ọma ike, bụ́ nke na-enye anyị ọṅụ na-enweghị atụ ugbu a.—Luk 21:36.

OLEE NGỌZI NDỊ ANYỊ GA-ENWETA MAKA INWE NDIDI?

17, 18. (a) Olee ohere anyị nwere ugbu a ka anyị na-enwe ndidi? (b) Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta maka inwe ndidi ugbu a?

17 Ma ànyị efeela Chineke ọnwa ole na ole ma ọ bụ ọtụtụ afọ, anyị chọrọ ife ya ruo mgbe ebighị ebi. Inwe ndidi ga-enyere anyị aka ịtachi obi ruo mgbe a ga-azọpụta anyị, n’agbanyeghị afọ ole fọrọnụ tupu e bibie ụwa ochie a. Jehova na-enye anyị ohere ugbu a igosi na anyị tụkwasịrị mkpebi ndị o mere obi kpamkpam nakwa na ọ bụrụ na ọ dị mkpa, anyị dị njikere ịta ahụhụ maka aha ya. (1 Pita 4:13, 14) Chineke na-azụkwa anyị ka anyị na-enwe ndidi, nke ga-eme ka a zọpụta anyị.—1 Pita 5:10.

18 E nyela Jizọs ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa, o nweghịkwa ihe ga-eme ka ọ ghara ichebe gị ma ọ bụrụ na i kwesị ntụkwasị obi. (Jọn 10:28, 29) I kwesịghị ịtụwa ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ma ọ bụdị tụwa ụjọ ọnwụ. A ga-azọpụta ndị ji ndidi tachie obi ruo ọgwụgwụ. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka ụwa megharịa anyị anya ma mee ka anyị kwụsị ịtụkwasị Jehova obi. Kama nke ahụ, anyị ga-ekpebisi ike ime ka okwukwe anyị sikwuo ike ma jiri oge a Chineke ka nwere ndidi na-eme ihe bara uru.—Mat. 24:13; gụọ 2 Pita 3:17, 18.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Inwe ndidi ka Chineke ga-enyere gị aka ilekwasị anya n’ihe gbasara Alaeze Chineke, meekwa ka i nweta ngọzi Chineke!