Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom 9:1-33

  • Pọl ruuru ndị Izrel uju (1-5)

  • Ndị bụ́ ụmụ Ebreham n’eziokwu (6-13)

  • A gaghị ata Chineke ụta maka ihe o kpebiri (14-26)

    • Arịa ndị e kwesịrị ibibi ebibi na ndị nke a ga-emere ebere (22, 23)

  • Ọ bụ naanị ndị fọdụrụ ka a ga-azọpụta (27-29)

  • Izrel kpọrọ ụkwụ na nkume mkpọbi ụkwụ (30-33)

9  Ebe m bụ onye na-eso ụzọ Kraịst, ana m ekwu eziokwu, ọ bụghị ụgha ka m na-agha n’ihi na akọnuche m, nke mmụọ nsọ na-edu, na-agba àmà  na m na-eru nnukwu uju, obi anaghịkwa ezu m ike.  N’ihi na ọ dị m ka ya bụrụ na e kewapụrụ m n’ebe Kraịst nọ, ka m bụrụ onye a bụrụ ọnụ kama ụmụnna m ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ, bụ́ ndị agbụrụ m,  ndị bụ́ ndị Izrel. Ọ bụ ha ka Chineke mere ka ha bụrụ ụmụ ya.+ E mere ka ha dị ebube, ha na ya gbakwara ndụ.+ Ọ bụ ha ka e nyere Iwu Mosis,+ nye ha ohere ije ozi dị nsọ,+ kwekwa ha nkwa dị iche iche.+  Ha si n’agbụrụ nna nna anyị hà,+ bụ́ agbụrụ Kraịst sikwa na ya.+ Ka otuto dịrị Chineke, onye bụ́ isi ihe niile, ruo mgbe ebighị ebi. Amen.  Ma, ọ pụtaghị na okwu Chineke emezughị. N’ihi na ọ bụghị ndị niile Izrel mụrụ bụ “ndị Izrel” n’eziokwu.+  Ọ bụghịkwa maka na ha bụ ụmụ Ebreham mere ha niile ga-eji bụrụ ụmụ* ya;+ kama e dere, sị, “Ọ bụ Aịzik ga-amụta ndị a ga-akpọ ụmụ* gị.”+  Ọ pụtara na ọ bụghị ndị niile Ebreham mụrụ bụ ụmụ Chineke n’eziokwu,+ kama ọ bụ ụmụ a mụrụ n’ihi nkwa ahụ+ bụ ụmụ* Ebreham.  N’ihi na Chineke kwere nkwa, sị: “M ga-abịa n’ụdị oge a n’afọ ọzọ, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”+ 10  Ọ bụghị naanị n’oge ahụ, kamakwa n’oge Aịzik nna nna anyị tụwara Ribeka ime, ya abụrụ ime ejima.+ 11  Mgbe a na-amụbeghị ha, mgbe ha na-emebeghịkwa ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ọ bụla, Chineke ekpebiela otú ọ ga-esi họrọ onye ọ chọrọ, ọ bụghị n’ihi ọrụ onye ahụ, kama ọ na-ahọrọ onye ọ chọrọ ịkpọ. 12  N’ihi ya, a gwara Ribeka, sị: “Nke okenye ga-agbara nke nwata ohu.”+ 13  Otú ahụ ka e dere ya, sị: “Ahụrụ m Jekọb n’anya, ma m kpọrọ Ịsọ asị.”+ 14  Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Mbanụ!+ 15  N’ihi na ọ gwara Mosis, sị: “Onye ọ bụla m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, onye ọ bụla m chọkwara inwere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.”+ 16  N’ihi ya, ọ bụghị ihe mmadụ chọrọ ma ọ bụ mbọ ọ na-agba ga-eme ka a họrọ ya,* kama ọ bụ Chineke, onye na-eme ebere, ka ọ dị n’aka.+ 17  N’ihi na n’Akwụkwọ Nsọ, Chineke gwara Fero, sị: “Ọ bụ ihe a mere m ji hapụ gị ndụ: ka m wee jiri gị gosi ike m, ka m wee mee ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.”+ 18  N’ihi ya, ọ bụ onye ọ chọrọ ka ọ na-emere ebere, ma ọ na-ahapụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ gbaa isi akwara.+ 19  N’ihi ya, ị ga-ajụ m, sị: “Gịnịzi mere o ji ata ndị mmadụ ụta? È nwere onye ga-emeli ka ọ ghara imezu uche ya?” 20  Ma, gị mmadụ, ònye ka ị bụ na ị ga na-asa Chineke okwu?+ Ihe a kpụrụ akpụ ọ̀ na-agwa onye kpụrụ ya, sị: “Gịnị mere i ji kpụọ m otú a?”+ 21  Ọ̀ bụ na ọkpụite enweghị ikike iji ụrọ+ ọ gwakọtara kpụọ otu arịa ka e jiri ya mee ihe bara ezigbo uru, kpụọkwa ọzọ ka e jiri ya mee ihe na-abaghị uru? 22  Otú ahụ ka ọ dịkwa Chineke. N’agbanyeghị na ọ chọrọ iwesa ndị ajọ omume iwe ma mee ka ha hụ ike ya, o nwere ezigbo ndidi ma hapụ ndị yiri arịa a ga-ewesa iwe, bụ́ ndị e kwesịrị ibibi ebibi. 23  O mere ihe a ka e wee mata ebube ya dị ukwuu nke ọ ga-eme ka ndị yiri arịa a ga-emere ebere nweta,+ bụ́ ndị o burula ụzọ kwadebe ka ha nweta ebube, 24  ya bụ, anyịnwa, ndị o si ma n’etiti ndị Juu ma n’etiti ndị mba ọzọ kpọọ.+ 25  Ọ bụ otú a ka o kwuru ya n’akwụkwọ Hosia, sị: “Ndị na-abụghị ndị m+ ka m ga-akpọ ‘ndị m.’ Nwaanyị ahụ a na-ahụghị n’anya ka m ga-akpọ ‘onye m hụrụ n’anya’;+ 26  n’ebe m gwara ha, sị, ‘Unu abụghị ndị m,’ n’ebe ahụ ka a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke dị ndụ.’”+ 27  Aịzaya kwukwara banyere Izrel, sị: “Ọ bụ eziokwu na ndị Izrel nwere ike ịdị ọtụtụ ka ájá dị n’oké osimiri, ọ bụ naanị ndị fọdụrụ ka a ga-azọpụta.+ 28  N’ihi na Jehova* ga-ekpe ụwa ikpe, kpechaa ya n’egbughị oge.”*+ 29  Aịzaya kwukwara, sị: “A sị na Jehova* nke ụsụụ ndị agha emeghị ka ụmụ* anyị fọdụ, anyị gaara adị nnọọ ka Sọdọm, anyị gakwaara adị ka Gọmọra.”+ 30  Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-ekwu na n’agbanyeghị na ndị mba ọzọ anaghị agbalị ka ha bụrụ ndị ezi omume, a kpọrọ ha ndị ezi omume+ n’ihi okwukwe ha.+ 31  Ma n’agbanyeghị na Izrel gbara mbọ ka ha debe iwu ahụ ka ha wee bụrụ ndị ezi omume, ha edebelighị iwu ahụ. 32  Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ha chere na a ga-akpọ ha ndị ezi omume n’ihi ọrụ ha, kama ịbụ n’ihi okwukwe ha. Ha kpọrọ ụkwụ na “nkume mkpọbi ụkwụ”;+ 33  otú ahụ e dere, sị: “Lee, ana m adọnye otu nkume+ na-akpọbi ndị mmadụ ụkwụ nakwa otu oké nkume na-akpasu ndị mmadụ iwe* na Zayọn, ma e nweghị onye nwere okwukwe na ya a ga-emechu ihu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “onye a ga-akpọ nwa.” Na Grik, “mkpụrụ.”
Na Grik, “mkpụrụ.”
Na Grik, “ọ dịghị n’aka onye na-achọ ma ọ bụ n’aka onye na-agba ọsọ.”
Ma ọ bụ “mee ihe o kpebiri ọsọ ọsọ.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Na Grik, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “oké nkume nke na-eme ka ndị mmadụ daa.”