‘Ezi Mmadụ Na-enweta Ihu Ọma Chineke’

‘Ezi Mmadụ Na-enweta Ihu Ọma Chineke’

‘Ezi Mmadụ Na-enweta Ihu Ọma Chineke’

Ọ BỤ Jehova Chineke nyere ihe nile dị ndụ ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Ee, “site n’aka ya ka anyị nwere ndụ, na-ejegharị, na-adịkwa ndụ.” (Ọrụ 17:28) Ọ̀ bụkwa na obi anyị ekwesịghị ijupụta nnọọ n’ekele mgbe anyị tụgharịrị uche n’ụgwọ ọrụ ọ na-enye ndị ya na ha na-enwe mmekọrịta chiri anya? N’ezie, “onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi.” (Ndị Rom 6:23) Lee nnọọ ka o si dị mkpa ka anyị chọọ ihu ọma Jehova!

Ọbụ abụ ahụ na-emesi anyị obi ike na ‘amara ka Jehova na-enye.’ (Abụ Ọma 84:11) Ma, ònye ka ọ na-enye ya? Taa, ụmụ mmadụ na-emekarịrị ndị ọzọ amara dabere n’otú ha gụruru akwụkwọ, akụ̀ na ụba ha, ụcha akpụkpọ ahụ́ ha, agbụrụ ha si na ya, na ihe ndị yiri ha. Ònye ka Chineke na-emere amara? Eze Solomọn nke Izrel oge ochie na-aza, sị: “Onye bụ́ ezi mmadụ na-enweta ihu ọma Jehova, ma onye nwere echiche ọjọọ ka ọ na-akpọ onye ajọ omume.”Ilu 12:2, NW.

N’ụzọ doro anya, Jehova na-enwe obi ụtọ n’ebe ezi mmadụ nọ—onye na-eme omume ọma. Omume ọma nke ezi mmadụ na-agụnye àgwà ndị dị ka ọzụzụ onwe onye, ikpe ziri ezi, ịdị umeala n’obi, ọmịiko, na ịdị akọ. Echiche ya nile ziri ezi, ihe ndị ọ na-ekwu na-ewuli elu, ihe ndị ọ na-eme zikwara ezi ma baa uru. Akụkụ nke mbụ nke isi 12 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu na-egosi anyị otú ịdị mma kwesịrị isi na-emetụta ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị ma na-egosi uru ndị na-esi n’igosipụta àgwà a apụta. Ịtụle ihe e kwuru n’ebe ahụ ga-eme ka anyị nwee “uche na ime mma.” (Abụ Ọma 36:3) Itinye ndụmọdụ dị n’ime ya, nke amamihe dị na ya, n’ọrụ ga-enyere anyị aka inweta ihu ọma Chineke.

Ịdọ Aka ná Ntị Dị Mkpa

“Onye na-ahụ ịdọ aka ná ntị n’anya na-ahụ ihe ọmụma n’anya,” ka Solomọn kwuru, “ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ anụ ọhịa.” (Ilu 12:1) Ebe ọ chọsiri imeziwanye ihe ike, ịdọ aka ná ntị na-agụsi ezi mmadụ agụụ ike. Ọ na-adị ngwa n’itinye ndụmọdụ ndị ọ na-anụ ná nzukọ Ndị Kraịst ma ọ bụ ná mkparịta ụka ya na ndị ọzọ na-enwe n’ọrụ. Ihe ndị e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible na-adị ka ndụdụ nke na-akpali ya igbaso ụzọ ziri ezi. Ọ na-achọ ihe ọmụma ma na-eji ya eme ka okporo ụzọ ya nile zie ezi. Ee, onye na-ahụ ịdọ aka ná ntị n’anya bụkwa onye na-ahụ ihe ọmụma n’anya.

Lee ka ịdọ aka ná ntị si dị ndị na-efe ezi ofufe mkpa—karịsịa ọzụzụ onwe onye! Ọ pụrụ ịdị anyị ka ya bụrụ na anyị nwere ihe ọmụma buru ibu karị nke Okwu Chineke. Ọ pụrụ ịbụ ọchịchọ anyị ịbụ ndị dị irè karị n’ozi Ndị Kraịst na ịbụ ndị ozizi ka mma nke Okwu Chineke. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ma, ọ na-achọ ọzụzụ onwe onye iji mezuo ọchịchọ ndị ahụ. Ọzụzụ onwe onye dịkwa mkpa n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ. Dị ka ihe atụ, ihe ndị e mepụtara iji kpalie agụụ na-ezighị ezi bara ụba taa. Ọ̀ bụ na ọ dịghị achọ ọzụzụ onwe onye mmadụ igbochi anya ya ka ọ ghara ile ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị? Ọzọkwa, ebe ọ bụ na “nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata,” echiche rụrụ arụ pụrụ isi n’ime ime uche anyị bilite. (Jenesis 8:21) A chọrọ ọzụzụ onwe onye iji zere ịnọgide na-atụgharị ihe dị otú ahụ n’uche.

Onye na-akpọ ịba mba asị, n’aka nke ọzọ, ahụghị ịdọ aka ná ntị n’anya, ọ hụghịkwa ihe ọmụma n’anya. N’ịgbaso àgwà ụmụ mmadụ na-eme mmehie nke bụ́ ịjụ ịdọ aka ná ntị, ọ na-eweda onwe ya ala ruo n’ókè nke iyi anụ na-enweghị uche—anụ ọhịa—n’amaghị ihe dị iche n’omume ọma na omume ọjọọ. Anyị aghaghị iguzogidesi àgwà a ike.

“Mkpọrọgwụ Ndị A Na-apụghị Ifopụ Efopụ”

N’ezie, ezi mmadụ apụghị ibu onye ajọ omume ma ọ bụ onye na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi. N’ihi ya, ezi omume dịkwa mkpa iji nweta ihu ọma Jehova. Eze Devid bụrụ abụ, sị: “Gị onwe gị na-agọzi onye ezi omume; Jehova, I ji otú ihe ya si atọ Gị ụtọ gbaa ya gburugburu dị ka ọta ukwu.” (Abụ Ọma 5:12) N’igosi ọdịiche dị n’ọnọdụ onye ezi omume na nke onye ajọ omume, Solomọn na-ekwu, sị: “Mmadụ agaghị eguzosi ike site ná mmebi iwu; ma mkpọrọgwụ ndị ezi omume, a gaghị efopụ ya.”Ilu 12:3.

Ndị na-emebi iwu pụrụ iyi ka ha na-enwe ihe ịga nke ọma. Tụlee ahụmahụ nke onye ọbụ abụ bụ́ Esaf. “Ma mụ onwe m,” ka o kwuru, “ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m abụọ wezụga onwe ha; nzọụkwụ m fọdụrụ nke nta ka ha gbụchapụ.” N’ihi gịnị? Esaf na-aza, sị: “Ekwosoro m ndị na-anya isi ekworo, ọ bụ udo nke ndị na-emebi iwu ka m na-ahụ.” (Abụ Ọma 73:2, 3) Ma mgbe ọ banyere n’ebe nsọ nke ụlọ nsọ Chineke, ọ bịara ghọta na ọ bụ n’ebe na-alọ alọ ka Jehova debere ha. (Abụ Ọma 73:17, 18) Ihe ịga nke ọma ọ bụla o yiri ka ndị na-emebi iwu ha na-enwe na-adịru nanị nwa oge. Gịnị mere anyị ga-eji na-ekwoso ha ekworo?

N’ụzọ dị iche na nke ahụ, onye nwere ihu ọma Jehova na-akwụsi ike. N’iji okwu ihe atụ bụ mkpọrọgwụ nile siri ike nke osisi eme ihe, Solomọn kwuru, sị: “Ndị ezi omume nwere mkpọrọgwụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ.” (Ilu 12:3, The New English Bible) Mkpọrọgwụ a na-adịghị ahụ anya nke osisi buru ibu, dị ka osisi sequoia nke California, pụrụ ịgbasa ruo ihe gafere otu hekta na ọkara, ọ pụrụ ime ka ọ kwụsie nnọọ ike n’agbanyeghị idei mmiri na oké ifufe. Nnukwu osisi sequoia pụrụ iguzogide ọbụna ala ọma jijiji dị ike.

Dị nnọọ ka ụdị mkpọrọgwụ ndị ahụ dị n’ime ala nke na-eme nri, ọ dị uche na obi anyị mkpa ime nnyocha sara mbara n’ime Okwu Chineke na inweta mmiri site ná mmiri na-enye ndụ nke dị n’ime ya. N’ụzọ dị otú a, okwukwe anyị ga-agbanyesi mkpọrọgwụ ike ma sie ike, olileanya anyị ga-abụ nke e ji n’aka ma sie ike. (Ndị Hibru 6:19) Anyị agaghị abụ ndị “ifufe ozizi [ụgha] ọ bụla na-ebugharị.” (Ndị Efesọs 4:14) N’ezie, ule ndị tara akpụ ga-enwe mmetụta n’ahụ́ anyị, anyị pụkwara ọbụna ịma jijiji n’ihi ụjọ n’oge ihe isi ike. Ma ‘a gaghị eme ka mkpọrọgwụ anyị maa jijiji.’

“Nwanyị nke Na-ejide Onwe Ya nke Ọma Bụ Okpueze Di Ya”

Ọtụtụ mmadụ maara okwu bụ́, “Nwoke ọ bụla nwere ihe ịga nke ọma nwere ezigbo nwanyị kwụ ya n’azụ.” N’izo aka ná mkpa ọ dị inwe nwanyị na-enye nkwado, Solomọn kwuru, sị: “Nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma bụ okpueze di ya, ma ọ dị ka ire ure n’ọkpụkpụ di ya, bụ́ nwanyị na-eweta ihere.” (Ilu 12:4) Okwu bụ́ “na-ejide onwe ya nke ọma” bụ nchịkọta nke ọtụtụ ihe ndị ịdị mma gụnyere. Omume ọma nke ezi nwanyị, dị ka a kọwara ha n’ụzọ zuru ezu n’Ilu isi 31, na-agụnye ịrụsi ọrụ ike, ikwesị ntụkwasị obi, na amamihe. Nwanyị nke nwere àgwà ndị a bụ okpueze di ya n’ihi na àgwà ọma ya na-ewetara di ya nsọpụrụ ma na-ebuli ya elu n’anya ndị ọzọ. Ọ dịghị mgbe ọ na-eji n’ihi oké ọchịchọ achọ inwe ọganihu ma ọ bụ na-ama di ya aka iji bụrụ onye a ma ama. Kama nke ahụ, ọ bụ onye inyeaka kwesịrị di ya.

Olee otú nwanyị pụrụ isi mee omume n’ụzọ na-eweta ihere, gịnịkwa ga-esi na ya pụta? Omume a na-eweta ihere pụrụ ịgụnye malite n’ise okwu ruo n’ịkwa iko. (Ilu 7:10-23; 19:13) Nanị ihe onye bụ́ nwunye ime ụdị omume ndị a ga-arụpụta bụ ịkwatu di ya. O yiri “ire ure n’ọkpụkpụ di ya” n’echiche nke na “ọ na-eme ka di ya daa, dị ka ọrịa nke na-eme ka ahụ́ mmadụ daa mbà,” ka otu akwụkwọ e ji eme nchọpụta na-ekwu. “Okwu yiri ya n’oge a pụrụ ịbụ ‘ọrịa cancer’—ọrịa nke na-eji nwayọọ nwayọọ eme ka ike gwụ mmadụ,” ka akwụkwọ ọzọ e ji eme nchọpụta kwuru. Ka Ndị Kraịst bụ́ ndị nwunye na-agbalịsi ike inweta ihu ọma Chineke site n’igosipụta omume ọma nke nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma.

Site n’Iche Ya n’Echiche Gaa n’Ime Ya Eme Gaa n’Ihe Ndị Ga-esi na Ya Pụta

Iche ihe n’echiche na-eduga n’ime ya eme, ime ya eme na-enwekwa ihe ndị na-esi na ya apụta. Solomọn kwuziri okwu banyere isite n’iche ihe n’echiche gaa n’ime ya eme, jiri ndị ezi omume na-atụnyere ndị ajọ omume. O kwuru, sị: “Echiche nile nke ndị ezi omume bụ ezi ikpe: ma ndụmọdụ nile nke ndị na-emebi iwu bụ aghụghọ. Okwu nile nke ndị na-emebi iwu bụ iche anwụ ọbara: ma ọnụ ndị ziri ezi ga-anapụta ha.”Ilu 12:5, 6.

Echiche ndị ezi omume dị ọcha, ọ bụkwa ihe ndị ziri ezi ka ha na-eche maka ha. Ebe ọ bụ na ihe na-akwali ndị ezi omume bụ ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ na n’ebe ụmụ mmadụ ibe ha nọ, ebumnobi ha bụ ebumnobi dị mma. N’aka nke ọzọ, ihe na-akwali ndị ajọ omume bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Ya mere, atụmatụ ha—ụzọ ha si emezu ebumnobi ha—na-eduhie eduhie. Omume ha bụ omume aghụghọ. Ha anaghị ala azụ n’isiri ndị aka ha dị ọcha ọnyà, ikekwe n’ụlọikpe, site n’ibo ha ebubo ụgha. Ihe ndị ha na-ekwu bụ “iche anwụ ọbara” n’ihi na ha chọrọ imerụ ndị aka ha dị ọcha ha na-emeso omume ha ahụ́. Ndị ezi omume, ebe ha maara atụmatụ ọjọọ ndị ahụ, nweekwa amamihe a chọrọ iji dị akọ, ga-enwe ike izere ihe ize ndụ a. Ha pụrụ ọbụna ịdọ ndị na-amụghị anya aka ná ntị ma napụta ha n’atụmatụ aghụghọ dị iche iche nke ndị na-emebi iwu.

Olee otú ihe ga-esi gaara ndị ezi omume na ndị ajọ omume? “A sị na e kpuo ndị na-emebi iwu ihu, ha anọghịkwa,” ka Solomọn na-aza, “ma ụlọ ndị ezi omume ga-eguzo.” (Ilu 12:7) Ụlọ, dị ka otu akwụkwọ e ji eme nchọpụta na-ekwu, “na-anọchite anya ezinụlọ onye ahụ na ihe nile dị oké ọnụ ahịa o nwere, na-eme ka o kwe ya omume ịdị ndụ n’ezie.” Ọ pụrụ ọbụna izo aka n’ebe ezinụlọ na ụmụ nke ndị ezi omume nọ. Otú o sina dị, ihe ilu ahụ na-ekwu doro anya: Onye ezi omume ga-eguzosi ike n’oge ihe isi ike.

Ihe Ga-adịrị Onye Dị Umeala n’Obi Mma Karị

N’imesi uru nghọta bara ike, eze Izrel ahụ kwuru, sị: “Dị ka ezi uche ya si dị ka a ga-eto onye ọ bụla: ma onye gbagọrọ agbagọ n’obi ga-aghọ onye a na-eleda.” (Ilu 12:8) Onye nwere ezi uche anaghị ekwu okwu ngwa ngwa. Ọ na-eche echiche tupu ya ekwuo okwu, ya na ndị ọzọ na-adịkwa n’udo n’ihi na “ezi uche” na-eme ka o jiri nlezianya họrọ ihe ndị ọ na-ekwu. Mgbe ajụjụ na-enweghị isi chere ya ihu, onye nwere ezi uche na-enwe ike ‘gbochie okwu ọnụ ya.’ (Ilu 17:27) A na-eto onye dị otú a, ihe ya na-atọkwa Jehova ụtọ. Lee ka o si dị iche n’ebe onye nwere echiche gbagọrọ agbagọ, nke sitere ‘n’obi gbagọrọ agbagọ,’ nọ!

Ee, a na-eto onye nwere ezi uche, ma ilu na-esonụ na-akụziri anyị uru ịdị umeala n’obi bara. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ dị mma, bụ́ onye a na-elelị ma o nwere ohu, karịa onye na-asọpụrụ onwe ya, ma nri kọrọ ya.” (Ilu 12:9) O yiri ka Solomọn ọ na-ekwu na ọ ka mma ịbụ onye dị umeala n’obi nke nwere ihe dị nta, onye nwere nanị otu ohu, karịa imefusị ihe ndị dị mkpa ná ndụ ná mgbalị ịnọgide na-ebi ndụ okomoko. Lee ezi ndụmọdụ nke ahụ bụ́ nye anyị—ibi ndụ otú akpa anyị hà.

Ndụ Ịkọ Ugbo Nwere Ihe Mmụta Banyere Ịdị Mma

N’iji ndụ ọrụ ugbo eme ihe, Solomọn kụziri ihe mmụta abụọ banyere ịdị mma. “Onye ezi omume maara ndụ anụ ụlọ ya,” ka o kwuru, “ma obi ebere nile nke ndị na-emebi iwu bụ enweghị obi ebere.” (Ilu 12:10) Onye ezi omume na-eji obiọma emeso anụmanụ ya ihe. Ọ maara ihe ndị na-akpa ha ma na-enwe nchegbu maka ọdịmma ha. Onye ajọ omume pụrụ ikwu na ya na-enwe nchegbu banyere anụmanụ, ma ọ dịghị enwe mmetụta n’ezie maka ihe ndị na-akpa ha. Ebumnobi ya bụ maka ọdịmma onwe ya nanị, ọ na-emesokwa anụmanụ ihe dị ka uru ọ pụrụ isi na ha nweta hà. Ihe onye dị otú ahụ na-ewere dị ka nlekọta kwesịrị ekwesị maka anụmanụ pụrụ n’ezie ịbụ mmeso obi ọjọọ.

Ụkpụrụ nke imeso anụmanụ omume n’obiọma na-emetụtakwa ilekọta anụmanụ ndị e ji mere enyi. Lee nnọọ omume obi ọjọọ ọ ga-abụ bụ́ ịkpa anụ ndị e ji mere enyi ma mee ka ha na-ata nnukwute ahụhụ na-ekwesịghị ekwesị site n’ileghara ha anya ma ọ bụ imeso ha n’ụzọ na-adịghị mma! N’ihe banyere anụmanụ nke na-arịa ajọ ọrịa ma ọ bụ nke merụrụ ahụ́, obiọma pụrụ ime ka ọ dị mkpa igbu ya egbu.

N’iji akụkụ ọzọ nke ndụ ịkọ ugbo eme ihe—igburi ala—Solomọn na-ekwu, sị: “Onye na-arụ ala ubi ya, afọ ga-eju ya ná nri.” N’ezie, ịrụsị ezi ọrụ ike na-eweta abamuru. “Ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, obi amamihe kọrọ ya.” (Ilu 12:11) N’ihi enweghị ezi uche ma ọ bụ nghọta, onye “obi amamihe kọrọ” na-achụso atụmatụ achụmnta ego ndị na-enweghị isi, ndị dị ize ndụ, na ndị na-abaghị n’ihe. Ihe mmụta ndị dị n’amaokwu abụọ ndị a doro nnọọ anya: Nwee obi ebere ma na-arụsi ọrụ ike.

Onye Ezi Omume Na-enwe Ihe Ịga nke Ọma

“Onye na-emebi iwu achọsiwo ọnyà ndị ọjọọ ike,” ka eze ahụ maara ihe kwuru. (Ilu 12:12a) Olee otú onye na-emebi iwu si eme nke ahụ? Ọ na-eme ya site n’ịchọ inweta ihe onwunwe ndị e si n’ụzọ na-ezighị ezi nweta.

Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere onye bụ́ ezi mmadụ? Onye dị otú ahụ na-ahụ ịdọ aka ná ntị n’anya, ọ gbanyesikwara mkpọrọgwụ ike n’okwukwe. Ọ bụ onye ezi omume na onye ziri ezi, nwee uche ma dị umeala n’obi, nwee ọmịiko ma dị uchu. Ma “mkpọrọgwụ ndị ezi omume,” ka Solomọn na-ekwu, “na-amị mkpụrụ,” ma ọ bụ “na-eme nke ọma.” (Ilu 12:12b; New International Version) “Mkpọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi,” ka An American Translation na-ekwu. Onye dị otú ahụ kwụsiri ike, n’enweghị ihe ga-eme ya. N’ezie, ‘ezi mmadụ na-enweta ihu ọma Chineke.’ Mgbe ahụ, ka anyị “tụkwasị Jehova obi, meekwa ezi ihe.”—Abụ Ọma 37:3.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Dị ka osisi nke dị nnọọ ndụ, okwukwe nke onye ezi omume gbanyesiri mkpọrọgwụ ike