Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Narị Afọ nke Setan?

Ọ̀ Bụ Narị Afọ nke Setan?

 Ọ̀ Bụ Narị Afọ nke Setan?

“N’IHI otú ihe si jọgbuo onwe ya ná njọ, ihe a abụwo narị afọ nke Setan. Ọ dịbeghị ọgbọ gara aga nke ndị mmadụ gosipụtara ọchịchọ, na agụụ, maka igbu ọtụtụ nde mmadụ ibe ha n’ihi ihe ndị metụtara agbụrụ, okpukpe, ma ọ bụ ọkwá na ya dị ka ha mere n’ọgbọ a.”

Ọ bụ n’ememe mgbaafọ nke 50 nke nnapụta a napụtara ndị aka ha dị ọcha a tụrụ mkpọrọ n’ogige ọnwụ ndị Nazi ka e kwuru ihe a dị n’elu nke e dere n’uche akwụkwọ akụkọ nke The New York Times nke January 26, 1995. Oké Mgbukpọ ahụ—otu n’ime mgbuchapụ a kasị mara amara n’akụkọ ihe mere eme—kpochapụrụ ihe dị ka nde ndị Juu isii. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị Poland atọ na-abụghị ndị Juu nwụrụ n’ihe a kpọworo “Oké Mgbukpọ E Chefuworo Echefu.”

“Otu atụmatụ e mere bụ na agha tara isi nde mmadụ 86 site na 1900 ruo 1989,” ka Jonathan Glover na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ Humanity—A Moral History of the Twentieth Century. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Agha ndị a lụrụ na narị afọ nke iri abụọ tara isi ndị mmadụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-adịghị ekwe nghọta. Ikwu na ọnụ ọgụgụ ndị ahụ nwụrụ bụ ná nkezi abụghị eziokwu, ebe ọ bụ na e gburu ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ (nde 58) n’agha ụwa abụọ ndị ahụ. Ma, ọ bụrụ na e kee ọnụ ọgụgụ ndị a nile nwụrụnụ ekee gaa n’ụbọchị n’ụbọchị n’oge ahụ dum, agha gburu ihe dị ka mmadụ 2,500 kwa ụbọchị, nke ahụ bụ ihe karịrị 100 mmadụ n’otu awa, n’akwụsịghị akwụsị, ruo afọ iri itoolu.”

N’ihi ya, a kpọwo narị afọ nke 20 otu n’ime narị afọ ndị a kasị kwafuo ọbara na ha ụmụ mmadụ matụworo. N’akwụkwọ bụ́ Hope Against Hope, Nadezhda Mandelstam na-ede, sị: “Anyị ahụwo mmeri ihe ọjọọ nwere mgbe e mebisịworo ma zọtọsịa ụkpụrụ omume nke ụmụ mmadụ.” N’ọgụ ezi ihe na ihe ọjọọ na-alụ, ihe ọjọọ ò meriwo n’ezie?

 [Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 2]

IHU AKWỤKWỌ: Nne na nwa ya nwanyị: J.R. Ripper/⁠SocialPhotos

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 3]

Foto nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ike Ndị E Ji Emepụta Ihe nke United States