Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A | OTÚ Ị GA-ESI AKWỤSỊ ÀGWÀ RIRILA GỊ AHỤ́

2 Zere Ihe Ndị Na-agaghị Enyere Gị Aka

2 Zere Ihe Ndị Na-agaghị Enyere Gị Aka
  • I kpebiri na ị ga na-eri nri na-edozi ahụ́, ma, ị gara na friji hụ aịs krim, ya ana-adọ gị akpịrị.

  • I kpebiri na ị ga-akwụsị ịṅụ sịga, ma, otu enyi gị nọ na-enye gị ya n’agbanyeghị na ọ ma na ị chọghịzi ịṅụ ya.

  • I kwuru na ị ga-emega ahụ́ taa, ma ike adịghị gị ịga were kanvas i ji agba ọsọ maka na ịchọwa ya bụụrụ gị oké ọrụ.

Ị̀ chọpụtara otú ihe atọ a anyị kwupụrụ ugbu a si yie ibe ha? Ihe ndị a chọpụtarala na-egosi na ihe ndị gbara anyị gburugburu na ndị anyị na ha na-anọkarị nwere ike ime ka ịkwụsị àgwà riri anyị ahụ́ dịrị anyị mfe ma ọ bụ siere anyị ike.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”Ilu 22:3.

Amaokwu Baịbụl a na-agwa anyị ka anyị kpachara anya ka anyị nwee ike izere ihe ọ bụla ga-eme ka ịkwụsị àgwà ndị anyị kpebiri ikwụsị siere anyị ike. (2 Timoti 2:22) Anyị kwesịrị ịma ebe anyị ga na-anọ, marakwa ụdị ndị anyị na ha ga na-anọ.

Na-eme ihe ga-eme ka o siere gị ike ịkpa àgwà ọjọọ na ihe ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ịna-akpa àgwà ọma

IHE I NWERE IKE IME

  • Na-eme ihe ga-eme ka o siere gị ike ime ihe ọ bụla i kpebiri na ị gaghịzi na-eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i kpebiri na ị gaghịzi eri nri na-anaghị edozi ahụ́, gbalịa ka ị ghara ịna-ewebata ụdị nri ahụ n’ụlọ gị. Iri ya agaghị adịrị gị mfe n’ihi na ọ dịghị n’ụlọ gị.

  • Na-eme ihe ga-enyere gị aka ka ọ dịrị gị mfe ime ihe ọ bụla i kpebiri na ị ga na-eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịna-emega ahụ́ kwa ụtụtụ, gbaa mbọ wepụta ákwà i ji emega ahụ́ tupu gị alakpuo. Ị malitehaala ya, ọ gaghị adị anya ya amara gị ahụ́.

  • Mara ndị gị na ha kwesịrị ịna-akpa. Ọ naghị adị anya anyị akpawa àgwà ka ndị anyị na ha na-akpa. (1 Ndị Kọrịnt 15:33) N’ihi ya, zere ndị ga-eme ka o siere gị ike ịkwụsị àgwà ndị i kpebiri ịkwụsị. Ndị enyi gị kwesịrị ịbụ ndị ga na-enyere gị aka ka ị na-akpa àgwà ọma.