Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

I Nwere Ike Ime Ka Ahụ́ Dịkwuo Gị Mma

I Nwere Ike Ime Ka Ahụ́ Dịkwuo Gị Mma

I Nwere Ike Ime Ka Ahụ́ Dịkwuo Gị Mma

RUSTAM, onye bi na Rọshịa, nwere ọtụtụ ihe ọ na-arụ. Na mbụ, ọ na-aṅụ sịga, na-aṅụkwa oké mmanya. Ma mgbe ọ chọpụtara na ihe ndị ahụ na-akpatara ya ọrịa, ọ kwụsịrị ime ha. N’agbanyeghị na ọ kwụsịla àgwà ọjọọ ndị ahụ, ike ka na-agwụkarịkwa ya n’ihi na ọrụ ya na-eme ka ọ na-anọ n’ihu kọmputa ya ọtụtụ awa n’ụbọchị.

Ọ bụ eziokwu na Rustam na-ebido ọrụ n’elekere asatọ nke ụtụtụ, ụra na-adịkarị ya n’anya ruo elekere iri nke ụtụtụ, ọ na-arịakarịkwa ọrịa. O mechara selata aka n’ihe ụfọdụ ndị ọ na-eme. Gịnị meziri? Ọ sịrị: “Kemgbe afọ asaa, ahapụbeghị m ọrụ ihe karịrị ụbọchị abụọ n’afọ n’ihi ọrịa. Ugbu a, ahụ́ na-adị m garagara, ụra anaghị atụkarịzi m, ike anaghịkwa agwụkarịzi m. Ndụ na-atọkwa m ụtọ ugbu a!”

Ram, nwunye ya, na ụmụ ya abụọ dị obere bi na Nepal. Gburugburu ebe ha bi ruru ezigbo unyi, anwụnta na ijiji jukwara n’ebe ahụ. Na mbụ, Ram na ezinụlọ ya na-arịakarị ọrịa na-eme ka ha ghara iku ume nke ọma nakwa ọrịa anya nke nje na-akpata. Hanwa mekwara mgbanwe ụfọdụ ná ndụ ha nke mere ka ahụ́ dịkwuo ha mma.

Mee Ka Ahụ́ Dịkwuo Gị Mma!

Ọtụtụ ndị, ma ndị bara ọgaranya ma ndị dara ogbenye, amaghị na e nwere ihe jikọrọ otú ha si ebi ndụ na otú ahụ́ ga-adịru ha mma. Ha nwere ike na-eche na ọ bụ ndị ọ dabaara ka ahụ́ na-esi ike ma ọ bụkwanụ na ọ dịghị ha n’aka ime ka ahụ́ na-adị ha mma. Iche echiche otú ahụ na-eme ka ọtụtụ ndị ghara ime ihe ga-enyere ha aka ka ahụ́ sie ha ike, ha enwee ike na-eme ihe dịịrị ha ná ndụ.

Nke bụ́ eziokwu bụ, ma ị̀ bụ ọgaranya ma ị̀ bụ ogbenye, e nwere ihe ndị i nwere ike ime iji chebe onwe gị na ezinụlọ gị ma mee ka unu ghara ịna-arịakarị ọrịa. È nwere uru ọ bara ime ha? Eenụ! Ndụ gị na nke ndị ezinụlọ gị ga-aka mma, unu ga-agbakwara ihe ọ bụla nwere ike ime ka unu nwụchuo ọnwụ ọsọ.

Ndị nne na nna kwesịrị isi ma n’okwu ọnụ ha ma n’omume ha kụziere ụmụ ha ihe ndị ga-enyere ha aka ka ha ghara ịna-arịakarị ọrịa. Oge ha ji kụziere ha ihe ndị a nakwa ego ha mefuru iji kụziere ha ihe ndị a efughị ọhịa, n’ihi na ọ ga-eme ka ha ghara ịna-arịakarị ọrịa. Ọ ga-ebelatakwa ego ha na-emefu n’ịzụ ọgwụ, n’ịga ụlọ ọgwụ nakwa oge ha ga-eji elekọta nwa ha na-arịa ọrịa. Ọ bụ ya mere e ji ekwu na mgbochi ọrịa ka mma karịa ọgwụgwọ ya.

N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-atụle ihe ise nyeere Rustam, Ram, na ọtụtụ ndị ọzọ aka. Ihe ndị ahụ nwekwara ike inyere gịnwa aka!

[Foto dị na peeji nke 3]

Rustam

[Foto dị na peeji nke 3]

Ram na-agbatara ezinụlọ ya ezigbo mmiri ọṅụṅụ