Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nke 4—Na-eme Ihe Ndị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịrịa Ọrịa

Nke 4—Na-eme Ihe Ndị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịrịa Ọrịa

Nke 4​—Na-eme Ihe Ndị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịrịa Ọrịa

“Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) O nwere ihe ụfọdụ na-esighị ike omume ị ga-eme, ha enyere gị aka ka ị ghara ịna-arịakarị ọrịa, meekwa ka ị ghara ịla oge gị na ego gị n’iyi n’ịgwọ ọrịa.

Na-edebe onwe gị ọcha. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa ná mba Amerịka kwuru, sị: “Ịkwọ aka mgbe niile bụ otu ihe dị ezigbo mkpa ị ga na-eme, ya enyere gị aka inwe ezigbo ahụ́ ike ma ghara ibute ọrịa.” Ihe dị ka mmadụ anọ n’ime mmadụ ise ọ bụla, ndị butere ọrịa na-efe efe, si n’aka bute ya. N’ihi ya, na-akwọ aka gị ugboro ugboro n’ụbọchị. Na-akwọ aka gị, karịchaa tupu i rie ihe ọ bụla, tupu i sie nri, ma ọ bụ tupu i tee ọgwụ n’ọnyá ma ọ bụdị metụ ọnyá aka. Kwọọkwa aka gị ma i metụ anụmanụ aka, gaa mposi, ma ọ bụ mgbe ọ bụla i hichara nwatakịrị ike.

Ọ ka mma iji ncha na mmiri akwọ aka karịa ite ihe dị ka mmanụ ndị Bekee mepụtara ka e jiri na-ehicha aka. Ahụ́ ga-aka adị ụmụaka mma ma ndị mụrụ ha kụziere ha ịna-akwọ aka ha mgbe niile nakwa ka ha ghara ịna-etinyekarị aka ha n’ọnụ ma ọ bụ n’anya. Ịsa ahụ́ kwa ụbọchị na ịhụ na ákwà ị na-eyi n’ahụ́ na ákwà ihe ndina gị na-adị ọcha ga-enye aka mee ka ị ghara ịna-arịakarị ọrịa.

Zere ihe ga-ebunye gị ọrịa na-efe efe. Gbalịa ka gị na ndị nwere azụ̀zụ̀ ghara ịna-anọkarị ma ọ bụ jiri otu iko na-aṅụ mmiri. Asọ si ha n’ọnụ ma ọ bụ imi na-agbapụta ha n’imi nwere ike ibunye gị azụ̀zụ̀. Ebe bụ́ isi e si ebute ọrịa ndị na-adị n’ọbara, ndị dị ka ịba ọcha n’anya nke B na nke C na ọrịa o biri n’ájá ọcha, bụ ná mmekọahụ, ntụtụ e ji gbaa mmadụ ọgwụ nakwa ịmịnye mmadụ ọbara. Ịgba ọgwụ mgbochi nwere ike inyere mmadụ aka ka ọ ghara ibute ọrịa ụfọdụ na-efe efe, ma onye maara ihe ka kwesịkwara ịkpachara anya mgbe ya na onye nwere ọrịa na-efe efe nọ. Ekwela ka ụmụ ahụhụ taa gị. Anọkwala ma ọ bụ hie ụra n’èzí ebe anwụnta ga-ata gị ma ọ bụrụ na i jighị ihe e ji egbochi anwụnta ma ọ bụ ahụhụ ndị ọzọ na-ebu ọrịa. Hụ na ezinụlọ gị, nke ka nke ụmụaka gị, na-arahụ n’okpuru nche anwụnta ma ọ bụ na-etenụ ihe na-achụpụ ụmụ ahụhụ na-ata ata. *

Debe ụlọ gị ọcha. Mee ihe niile i nwere ike ime iji hụ na ụlọ gị dị ọcha ma dị mma n’anya, ma n’ime ma n’èzí. Ekwela ka mmiri na-adọrọ ebe ọ bụla, ka anwụnta ghara ịnọ ebe ahụ mụjuo. Ihe ndị ruru unyi a tụsara aghara aghara, nri e ghewere oghe na ihe ndị ruru unyi e kponyere n’ihe a na-ekwuchighị ekwuchi, na-akpọta ụmụ ahụhụ na òké. Ihe ndị a nwekwara ike ibubata nje ma kpatara mmadụ ọrịa. Ọ bụrụ na unu enweghị ebe a na-aga mposi, gwuo ala ebe unu ga na-aga mposi kama ịga ya n’ime ọhịa. Hụ na ebe mposi unu nwere ihe e ji ekpuchi ya ka ijiji ghara ịna-eju ebe ahụ, n’ihi na ijiji na-ebu nje ndị na-akpata ọrịa anya nakwa ọrịa ndị ọzọ.

Zere ihe ndị ga-emerụ gị ahụ́. N’ebe ị na-arụ ọrụ, hụ na ị na-erube isi n’iwu ọ bụla e nyere ka mmadụ ghara imerụ ahụ́, hụkwa na ị na-edebe iwu gọọmenti nyere maka ndị na-agba ígwè, ọgba tum tum ma ọ bụ ụgbọala. Anyala ụgbọala gị ma ọ bụrụ na o nwere nsogbu. Mgbe ị na-arụ ọrụ, hụ na i yi ihe ndị kwesịrị ekwesị ga-eme ka ị ghara imerụ ahụ́, dị ka uwe, akpụkpọ ụkwụ, enyo anya, okpu, ma ọ bụ ihe a na-akwụnye ná ntị. Hụ na i kedoro onwe gị belt oche ụgbọala mgbe ị nọ n’ụgbọala, kpurukwa okpu mgbe ị nọ n’ọgba tum tum. Ekwela ka anwụ na-acha gị nnukwu, n’ihi na o nwere ike ịkpatara gị ọrịa kansa ma ọ bụ mee ka akpụkpọ ahụ́ gị dị ka nke onye kara nká. Ọ bụrụ na ị na-aṅụ sịga, kwụsị ya. Ị kwụsị ya ugbu a, ọ ga-enyere gị aka ka ị ghara inwe ọrịa obi, ọrịa akpa ume, nakwa ọrịa strok. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Gụọ Teta! June 8, 2003, peeji nke 13-22, bụ́ ebe e kwuru ihe mmadụ ga-eme iji zere ọrịa ụmụ ahụhụ na-ekesa.

^ par. 7 Gụọ Teta! Julaị–Septemba 2010, peeji nke 3-9, bụ́ ebe e kwuru otú e si akwụsị ịṅụ sịga.