Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nke 3—Na-emega Ahụ́

Nke 3—Na-emega Ahụ́

Nke 3​—Na-emega Ahụ́

“Á sị na imega ahụ́ bụ mkpụrụ ọgwụ, ọ gaara abụ ọgwụ ndị dọkịta ga-akacha agwa ndị mmadụ n’ụwa niile ka ha na-aṅụ.” (Emory University School of Medicine) A bịa n’ihe ndị anyị ga-eme ka ahụ́ na-adị anyị mma, imega ahụ́ so ná ndị nke kacha abara anyị uru.

Na-eme ihe ndị ga-eme ka ọsụsọ na-agba gị. Imega ahụ́ mgbe niile nwere ike ime ka obi na-adịkwu anyị mma, ka anyị na-echekwu echiche nke ọma, nwekwuo ume, ma dịkwuo garagara n’ihe ọ bụla anyị na-eme. Ọ bụrụ na anyị ana-emega ahụ́ ma na-eri nri otú kwesịrị ekwesị, o nwere ike ime ka anyị ghara ibu oké ibu. Ọ dịghị mkpa na mmadụ ga-emega ahụ́ otú ọ ga-afụ ya ụfụ n’ahụ́ ma ọ bụ mefee ya ókè tupu ya abaara ya uru. Imega ahụ́ obere obere ugboro ugboro n’izu na-aba ezigbo uru.

Ịgba mwe mwe ọsọ, ịgasi ije ike, ịgba ígwè, na igwu egwuregwu ọ bụla nke ga-eme ka ọsụsọ gbaa gị nakwa ka obi gị na-akụsi ike, ga-enyere gị aka ịmụta inwe ndidi ma mee ka ị ghara inwe obi nkụchi ma ọ bụ ịrịa ọrịa strok. Ụdị mmega ahụ́ ndị ahụ na ụdị mmega ahụ́ ndị ọzọ na-eme ka ọkpụkpụ, uru ahụ́, na ụkwụ na aka sikwuo ike. Ihe ndị a na-emekwa ka ahụ́ gị na-agbari nri nke ọma, nke ga-eme ka ị ghara ibu ókè ibu.

Na-eji ụkwụ aga ihe ndị dịịrị gị. Imega ahụ́ na-abara ma ụmụaka ma ndị toro eto uru, ọ dịghịkwa mkpa na ị ga-emefuru ya ego. Kama iji ụgbọala ma ọ bụ ọkada aga ebe ọ bụla ị chọrọ ịga, iji ụkwụ aga bụ otu ụzọ e si emega ahụ́. Ọ bụrụ na ebe ị na-aga adịghị anya, ọ́ gaghị aka mma iji ụkwụ aga kama ichewe ụgbọala? I nwedịrị ike iru ebe ahụ ngwa ngwa ma i jiri ụkwụ. Ndị nne na nna, na-agwanụ ụmụ unu ka ha na-egwu egwuregwu ndị a na-egwu n’èzí mgbe ọ bụla o kwere mee. Egwuregwu ndị a na-egwu n’èzí ga-eme ka ọkpụkpụ ha na-agbasi ike ma na-enyere ahụ́ ha aka ịrụ ọrụ nke ọma otú egwuregwu ndị a na-anọ otu ebe egwu, dị ka egwuregwu kọmputa, na-agaghị emeli.

N’agbanyeghị afọ ole ịnọ bido imega ahụ́, ọ ga-abara gị uru. Ọ bụrụ na ị katawala ahụ́ ma ọ bụ nwee ọrịa ị na-arịa, ya abụrụkwa na i bidobeghị imega ahụ́, ọ ga-adị mma ma i bu ụzọ gwa dọkịta gị ka ọ gwa gị otú ị ga-esi ebido. Ma ihe dị mkpa bụ ka i bido ebido! Mmega ahụ́ e ji nwayọọ nwayọọ bido, nakwa nke a na-emefeghị ókè nwere ike inyere anyị aka ka ọkpụkpụ anyị sikwuo ike nakwa ka ahụ́ gbasie anyị ike, ọ sọgodị ya ya bụrụ ndị karala ezigbo nká. O nwekwara ike inyere ndị agadi aka ka ha ghara ịna-adakarị ada.

Imega ahụ́ bụ ihe nyeere Rustam aka, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ. Kemgbe afọ asaa, ya na nwunye ya na-agba mwe mwe ọsọ n’ụtụtụ ọ bụla, ụbọchị ise n’izu. Rustam sịrị: “Mgbe anyị malitere, obere ihe nwere ike ime ka anyị ghara ịga. Ma, mgbe anyị nwetara onye anyị na ya so aga, o nyeere anyị aka ịna-agachi ya anya. Ugbu a, ọ marala anyị ahụ́, ọ na-atọkwa anyị ụtọ ime ya.”

[Foto dị na peeji nke 6]

Imega ahụ́ na-atọ ụtọ omume