Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Otú Unu Ga-esi Kwụsị Ịna-esekarị Okwu

Otú Unu Ga-esi Kwụsị Ịna-esekarị Okwu

IHE MERE O JI ARA AHỤ́

Ọ̀ na-esiri gị na di gị ma ọ bụ gị na nwunye gị ike imeda obi kwurịta ihe ụfọdụ? Obi ọ̀ na-ekoro gị n’elu n’ihi na ị maghị ihe ị ga-ekwu ma ọ bụ ihe ị ga-eme gị na ya esewe?

Ọ bụrụ otú ahụ, ụjọ atụla gị. Ihe nwere ike imecha dị mma. Ma, ihe mbụ ị ga-emegodị bụ ịchọpụta ihe mere gị na ya ji esekarị okwu.

IHE MERE DI NA NWUNYE JI ESEKARỊ OKWU

O nwere ike ịbụ n’ihi na unu na-aghọtahie ibe unu.

Otu nwaanyị aha ya bụ Nnenna * kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ihe m bu n’obi gwa di m ihe abụghị ihe ọ na-aghọta. E nwekwara oge ndị m na-eche na agwala m ya ihe, ma amaghị m na agwabeghị m ya ihe ahụ.”

Ihe na-amasị gị nwere ike ọ gaghị na-amasị di gị ma ọ bụ nwunye gị.

Otú ọ̀ sọkwara gị na di gị ma ọ bụ gị na nwunye gị dịrị ná mma, ọ bụghị mgbe niile ka ihe ga-adabachara unu. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na onye ọ bụla n’ime unu nwere àgwà nke ya. Ihe na-amasị di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere ike ọ gaghị na-amasị gị. Nke a nwere ike ime ka ihe na-adabara unu ma ọ bụkwanụ mee ka unu na-ese okwu. Ma, ọtụtụ mgbe, ọ na-akpata esemokwu.

Ọ bụrụ na papa gị na mama gị na-esekarị okwu.

Otu nwaanyị aha ya bụ Ngọzi kwuru, sị: “Mgbe m nọ n’ụlọ anyị, papa m na mama m na-esekarị okwu. Ha na-agwakwa ibe ha okwu ọjọọ. N’ihi ya, mgbe m lụrụ di, m na-agwa di m okwu otú ahụ mama m si agwa papa m okwu. Anaghị m akwanyere ya ùgwù.”

O nwere ike ịbụ ihe ọzọ na-esere unu okwu.

Mgbe ọ bụla mmadụ abụọ na-ese okwu, ha na-ahapụkarị ihe na-esere ha kwuwe ihe ọzọ. Dị ka ihe atụ, di nwere ike ịgwa nwunye ya sị, “Ị na-abịakarị ihe n’azụ oge.” I leruo ya anya, ị ga-achọpụta na o nwere ike ihe mere o ji kwuo ihe ahụ abụghị maka na nwunye ya na-abịa ihe n’azụ oge. O nwere ike ịbụ maka na o chere na nwunye ya anaghị eche banyere yanwa. Otú ahụ ka ọ dịkwa nwaanyị.

Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya mere gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ji esekarị okwu, o nwere ike ịkpatara unu ọrịa, ma ọ bụkwanụ mee ka unu gbaa alụkwaghịm. Olee otú unu ga-esi kwụsị ịna-esekarị okwu?

IHE Ị GA-EME

Ihe ga-aka enyere unu aka bụ ịchọpụta ihe mere unu ji esekarị okwu. Mgbe ọ bụla obi jụụrụ unu, gbalịanụ mee ihe ndị na-esonụ.

1. Mgbe ọ bụla unu sere okwu, onye ọ bụla n’ime unu were akwụkwọ dee ihe seere unu. Dị ka ihe atụ, di nwere ike ide, sị, “Ihe i ji ụbọchị taa mee bụ ịga hụ ndị enyi gị. Ị kpọghịdị m n’ekwentị gwa m ebe ị nọ.” Nwaanyị nwere ike ide, sị, “Ihe wewe gị iwe bụ na m gara hụ ndị enyi m.”

2. Kwurịtanụ ihe ndị a: Ọ̀ bụ ihe a kwesịrị isere anyị okwu? Ọ̀ bụ na anyị agaraghị eleghara ya anya? Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịhapụ ka e mejọọ gị ka udo dịrị. I nwekwara ike ịhapụ okwu ahụ. Nke a na-egosi na ị hụrụ nwunye gị ma ọ bụ di gị n’anya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 17:9.

Ma, ọ bụrụ na unu abụọ ekwurịtachaa ya kpebie na o nweghị ihe dị na ya, rịọnụ ibe unu mgbaghara ma chefuo ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 3:13, 14.

Ọ bụrụ na otu onye n’ime unu ma ọ bụ unu abụọ ka chere na unu kwesịrị ikwurịta ya, meenụ ihe nke atọ a.

3. Were akwụkwọ dee otú obi dị gị mgbe ahụ unu sere okwu. Gwakwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ka o dee otú obi dị yanwa. Di nwere ike ide, sị, “Ị chọrọ ka gị na ndị enyi gị na-anọ kama mụ na gị ịnọ.” Nwunye nwere ike ide, sị, “Ị na-eme m ka obere nwa nke ga-aga nara papa ya ike tupu ya agawa ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga.”

4. Nye di gị ma ọ bụ nwunye gị akwụkwọ ahụ i dere otú obi dị gị, narakwa ya nke ya. Gụọ ihe o dere, gwakwa ya ka ọ gụọ nke i dere. Olee ihe ọ sị na ọ bụ ya seere unu okwu? Onye ọ bụla n’ime unu kwuo ihe ọ gaara eme ka ihe ahụ ghara isere unu okwu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 29:11.

5. Unu abụọ kwurịta ihe unu mụtara n’ihe anọ a a sị unu mee. Unu see okwu, olee otú ihe unu mụtara ugbu a ga-esi nyere unu aka ka unu kpezie? Oleekwa otú ime ihe unu mụtara ga-esi nyere unu aka ka unu ghara ịna-esekarị okwu?

^ para. 7 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.