IHE GBASARA NDỊ OGE OCHIE
Plato
Pleto bụ ọkà ihe ọmụma. Ọ bụ onye Gris, bụrụkwa ọgọ mmụọ. A mụrụ ya n’Atens n’ihe dị ka n’afọ 427 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ọ nwụrụ n’ihe dị ka n’afọ 347 Tupu Oge Ndị Kraịst. Nna ya nwere ezigbo ego. Ọ gara akwụkwọ ebe ndị Gris nna ha nwere ego na-aga akwụkwọ. Ọ mụtara ọtụtụ ihe n’aka Sọkretiz, bụ́ ọkà ihe ọmụma a ma ama. Ndị ọzọ ọ mụtara ihe n’aka ha bụ ụmụazụ Paịtagoras. Paịtagoras bụ ọkà ihe ọmụma na ọkà n’ihe gbasara mgbakọ na mwepụ.
PLETO gara ọtụtụ ebe. Ọ gara obodo ndị dị n’ikpere Oké Osimiri Mediterenian. O tinyekwara aka n’ọchịchị na Sirakus, bụ́ obodo ndị Gris na-achị n’oge ahụ. Obodo a dị na Sisili. Mgbe o mechara ihe ndị a, ọ laghachiri Atens ma rụọ otu ụlọ akwụkwọ. A na-akpọkarị ya mahadum mbụ e nwere na Yurop. A na-anọ n’ebe ahụ azụ ndị ọkà ihe ọmụma. A na-anọkwa ya akụzi gbasara mgbakọ na mwepụ.
GỊNỊ MERE Ị KWESỊRỊ IJI MARA ONYE PLETO BỤ?
Ọtụtụ nde ndị na-aga chọọchị nakwa ndị na-ekpe okpukpe ndị ọzọ kweere na ihe ndị Pleto kụziri bụ eziokwu. Ọtụtụ ndị na-aga chọọchị na-ekwudị na ihe ndị ọ kụziri dị na Baịbụl. Otu n’ime ha bụ na o nwere ihe a na-akpọ mkpụrụ obi nke na-esi n’ahụ́ mmadụ pụọ ma onye ahụ nwụọ. Ọ sị na ihe ahụ na-aga dịrị ndụ ebighị ebi n’ebe ọzọ.
Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Otu n’ime isiokwu ndị Pleto na-akụzikarị bụ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ.”
Pleto na-akụziri ndị mmadụ ihe na-eme onye nwụrụ anwụ. Otu akwụkwọ kwuru na otu n’ime ihe ndị ọ na-akụzi bụ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. O kwukwara na Pleto kwetasiri ike na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, mkpụrụ obi onye ahụ na-aga ka e kpee ya ikpe. Ọ bụrụ na onye ahụ mere ihe dị mma mgbe ọ dị ndụ, a ga-akwụ ya ụgwọ ihe ọma o mere. Ma, ọ bụrụ na o mere ihe ọjọọ, a ga-ata ya ahụhụ. *
OLEE OTÚ IHE A PLETO KỤZIRI SI RUO EBE NIILE?
Ụlọ akwụkwọ ahụ Pleto rụrụ dịruru narị afọ itoolu. Mgbe ahụ ọ dị, a nọ na ya akụziri ọtụtụ ndị ihe ndị ahụ Pleto kweere. Ọ bụ otú a ka ihe ndị ahụ ọ na-akụzi si gbasaa ebe niile ndị Gris na ndị Rom chịrị. Onye Juu bụ́ ọkà ihe ọmụma aha ya bụ Filo na ọtụtụ ndị isi chọọchị dị iche iche bịara kweta na ihe Pleto na-akụzi bụ eziokwu. Ha bidokwara kụziwe ya. Ọ bụ otú a ka e si malite ịkụzi na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ n’okpukpe ndị Juu nakwa na chọọchị dị iche iche. A malitekwara ịkụzi ozizi ndị ọgọ mmụọ ndị ọzọ.
Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na ebe e si nweta ọtụtụ ihe ndị chọọchị kweere taa bụ n’ozizi ndị Gris, nke ka nke n’ihe ndị ahụ Pleto kụziri. Ọ bụ ihe ndị ahụ ọ kụziri ka ndị isi chọọchị ụfọdụ na-akụzi. Ka anyị lee ihe akwụkwọ ụfọdụ kwuru.
Ihe Pleto kwuru: Otu akwụkwọ kwuru na Pleto sịrị na “o nwere ihe na-anaghị anwụ anwụ nke dị n’ime mmadụ. Onye ahụ nwụọ, ihe ahụ na-agakwuru chi ọ na-efe. N’ebe ahụ, ọ na-aza ajụjụ ihe o mere. Ụjọ agaghị atụ ya ma ya bụrụ ezigbo mmadụ. Ma, ya bụrụ onye ọjọọ, ụjọ ga na-atụ ya.”
Ihe Baịbụl kwuru: Ma mmadụ ma anụmanụ bụ mkpụrụ obi. Ndụ ha dị bụkwa mkpụrụ obi. Mmadụ ma ọ bụ anụmanụ nwụọ, ọ bụ mkpụrụ obi nwụrụ. * Ka anyị lee amaokwu Baịbụl ndị kwadoro ihe a anyị kwuru:
-
“Nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.”—1 Ndị Kọrịnt 15:45.
-
“Chineke wee sị: ‘Ka ala wepụta mkpụrụ obi dị ndụ n’ụdị ha dị iche iche, anụ ụlọ na anụ ndị ọzọ na-agagharị agagharị na anụ ọhịa nke ụwa.’”—Jenesis 1:24.
-
“Ka mkpụrụ obi m nwụọ.”—Ọnụ Ọgụgụ 23:10.
-
“Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.”—Ezikiel 18:4.
Ị̀ hụrụ na Baịbụl kwuru na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ? N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ̀ bụ ihe Baịbụl kwuru ka m kweere ka ọ̀ bụ ihe Pleto kwuru?’
^ para. 7 Pleto kụziiri ọtụtụ ndị na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, ma ọ bụghị ya bụ onye mbụ kụziri ụdị ihe a. O teela ndị ọgọ mmụọ kụziwere ya, ma ndị ọgọ mmụọ ndị Ijipt ma ndị nke Babịlọn.
^ para. 12 Baịbụl kwuru na onye nwụrụ anwụ dị ka onye nọ n’ụra. Ọ bụ naanị mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ ka ọ ga-adị ndụ ọzọ. (Ekliziastis 9:5; Jọn 11:11-14; Ọrụ Ndịozi 24:15) Ma, ọ bụrụ na e nwere ihe na-anaghị anwụ anwụ nke dị n’ime mmadụ, ọ pụtaranụ na e kwesịghị ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.