Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

E Nye M Ọrụ, Olee Otú M Ga-esi Rụwa Ya Ozugbo Kama Ịna-asị Mgbe E Mechara?

E Nye M Ọrụ, Olee Otú M Ga-esi Rụwa Ya Ozugbo Kama Ịna-asị Mgbe E Mechara?

Ọ̀ na-abụ papa gị ma ọ bụ mama gị nye gị ọrụ, ya ana-esiri gị ike ọrụrụ? Ọ̀ na-abụ onye nkụzi gị nye gị ihe ị ga-ede n’ụlọ, ya ana-esiri gị ike ide? Nke bụ́ eziokwu bụ na isiokwu a ga-enyere gị aka ịna-eme ihe a sị gị mee kama ịna-asị mgbe e mechara gị emee ya, ọ bụrụgodị na

Ị gụchaa isiokwu a, gbaa mbọ zaa  ajụjụ ndị anyị jụrụ gbasara mmadụ ịsị mgbe e mechara.

 Baịbụl gosiri na mmadụ ịhapụ ihe o kwesịrị ime na-ekwu na ya ga-eme ya ma e mechaa adịghị mma. O kwuru, sị: “Onye na-ele ifufe agaghị agha mkpụrụ; onye na-ele ígwé ojii agaghịkwa ewe ihe ubi.”​—Ekliziastis 11:4.

 Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka mmadụ na-asị e mechaa ya emee ihe a sị ya mee nakwa ihe ga-enyere ya aka ịkwụsị àgwà a.

 I chere na ị gaghị emeli ya.

 Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ihe e nwere ike ịsị mmadụ mee ya adị ya ka ọ̀ bụ ya hapụgodi ya e mechaa ya emee ya. Ihe ụfọdụ nwere ike inyere gị aka bụ:

  •   Emela ihe ahụ otu mgbe, mewe ya obere obere. Amarachi kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ asị m mee ihe ma oge m kwesịrị iji eme ya agawala, anaghị m eme ihe ahụ niile otu mgbe. M na-eme ya obere obere.”

  •   Bido ozugbo mewe ya. Chinasa kwuru, sị: “A sị gị mee ihe, mewe ya ozugbo. Ọ bụrụ na o nwere ihe ọzọ ị na-eme, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, dee ihe ahụ a sị gi mee n’akwụkwọ ka ị ghara ichefu ya.”

  •   Jụọ ndị ọzọ otú ị ga-esi eme ya. Papa gị, mama gị, ma ọ bụ onye nkụzi gị nye gị ọrụ, i nwere ike ịjụ ya otú ị ga-esi eme ya. Ha ga-enyere gị aka ịma otú ị ga-esi eme ya.

 Ihe I Nwere Ike Ime Adaeze kwuru, sị: “A sị gị mee ihe, dee otú ị ga-esi eme ya n’akwụkwọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ga-eme ka ị ghara izu ike ma i mebeghị ya. Ma, ọ bara uru. Ọ ga-enyere gị aka ime ihe ahụ mgbe i kwesịrị ime ya.”

 Ị chọghị ime ya.

 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ihe a sị gị mee bụ ihe ị na-anaghị achọ ime. N’ihi ya, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na a sị gị mee ihe ị na-achọghị ime? Ihe i nwere ike ime bụ:

  •   Gbalịa mara ihe mere i kwesịrị iji mee ihe ahụ n’oge. Dị ka ihe atụ, obi ga-adị gị ụtọ ma i mechaa ya. Ebere kwuru, sị: “Obi na-adị m ụtọ mgbe ọ bụla m mechara ihe a sị m mee n’oge. Obi na-adịkwa m ụtọ ma m mechaa ya tupu oge e nyere m eruo. Nke a na-eme ka obi ruo m ala.”

  •   Cheta ihe ga-eme ma ọ bụrụ na i meghị ihe ahụ n’oge. Ọ bụrụ na ị meghị ya n’oge, ọ ga-eme ka ọrụ zuo gị ahụ́. O nwekwara ike ime ka ị ghara ịmete ihe ahụ. Baịbụl kwuru, sị: ‘Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọ.’​—Ndị Galeshia 6:​7.

  •   Gbalịa ka i mechaa ya tupu oge e nyere gị eruo. Nneka kwuru, sị: “Ọ na-abụ a sị m mee ihe ma gwa m mgbe m ga-emecha ya, m na-agba mbọ mechaa ya otu abalị ma ọ bụ abalị abụọ tupu ụbọchị e nyere m eruo. Nke a na-abara m uru. M na-eji oge fọdụrụnụ legharịa ya anya, jirikwa ya mee ihe ndị ọzọ bara uru.”

 Ihe I Nwere Ike Ime Ezinne kwuru, sị: “Ị ga-emecha ihe a sị gị mee ma ọ bụrụ na i kpebie na ị ga-emecha ya. Ọ bụrụ na i jiri obi gị niile na-eme ihe ahụ, o nweghị ihe ga-eme ka ị ghara imecha ya. Ọ bụ ihe a ka m na-eme. M na-emechakwa ihe a sị m mee tupu oge e nyere m eruo.”

 I nweghị efe.

 Chibuike kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-ekwukarị na ọ na-abụ a sị m mee ihe mụ ahapụgodi ya na-eme ihe ọzọ. Ma, ha amaghị na anaghị m enwe efe.” Ọ bụrụ na ihe mere na ị naghị eme ihe a sị gị mee ozugbo a gwara gị ya bụ na ị naghị enwe efe, gbalịa mee ihe ndị anyị ga-agwa gị ugbu a.

  •   Buru ụzọ rụọ ọrụ ndị na-ataghị akpụ. Chidimma kwuru, sị: “O nwere onye gwara m na ọ bụrụ na mmadụ a sị m mee ihe na-agaghị ewe m nkeji ise, m kwesịrị ime ihe ahụ ozugbo. O nwere ike ịbụ idowe ụlọ ọcha, ikowe uwe gị, ịsa efere, na ịkpọ mmadụ n’ekwentị.”

  •   Mara ihe ndị ị ga-ebu ụzọ eme. Baịbụl kwuru, sị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Olee otú ị ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru? Nkiru kwuru, sị: “Ana m ede ọrụ niile m nwere n’akwụkwọ. M na-edekwa mgbe m kwesịrị ịrụ ha. Ihe ọzọ bụ na m na-ede mgbe m bu n’obi ịrụ nke ọ bụla na mgbe m ga-arụcha ya.”

 Ì chere na otú a Nkiru si eme agaghị ekwe ya mee ihe ọ bụla ọ chọrọ ime? Nke bụ́ eziokwu bụ na i dee ihe a sị gị mee n’akwụkwọ, ọ ga-enyere gị aka ịhazi onwe gị, gị amarakwa mgbe ị ga-eme nke ọ bụla. Nke a ga-eme ka obi ghara ikoro gị n’elu. Amaka kwuru, sị: “Ide ihe m chọrọ ime n’akwụkwọ na-eme ka obi ruo m ala. Ọ na-emekwa ka m mara mgbe m ga-eme nke ọ bụla.”

  •   Ekwela ka ihe ọ bụla megharịa gị anya. Nwakaego kwuru, sị: “Ọ na-abụ onye nkụzi anyị nye m ihe m ga-ede n’ụlọ, m na-agwa papa m na mama na ụmụnne m tupu mụ amalite ya. M na-ebukwa ụzọ rụọ ihe ọ bụla ha ga-achọ ka m rụọ. M na-agbanyụkwa ekwentị m.”

 Ihe I Nwere Ike Ime Eze kwuru, sị: “Ọrụ gị ga na-eche gị, ọ gwụkwala ma ị rụrụ ya. Kama ịhapụ ya e mechaa gị arụọ ya, rụwa ya ozugbo. Ị rụchazie ya, gị ezuwe ike.”.