Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Ihe M Anaghị Amasị Ndị Ọzọ?

Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Ihe M Anaghị Amasị Ndị Ọzọ?

“I kwesịrị ịgbalị na-eme ka ibe gị, ma ọ̀ bụghị ya, ị gaghị enwe ndị enyi, ndụ agaghị na-atọ gị ụtọ, ihe agaghịkwa agaziri gị. O nweghị onye ga na-eche banyere gị, owu ga na-amakwa gị.”—Carl.

Ihe a o kwuru, ọ̀ bụ eziokwu? Ọ bụchaghị eziokwu. Ma, ụfọdụ ndị ga-eme ihe ọ bụla ka ihe ahụ Carl kwuru ghara ime ha. Gịnị ka gịnwa ga-eme? Isiokwu a ga-enyere gị aka ịma otú ka mma ị ga-esi emeta ndị enyi.

 Gịnị mere ndị mmadụ ji agbalị ka ihe ha na-amasị ndị ọzọ?

  • N’ihi na ha achọghị ka ndị ọzọ jụ ha. “Mgbe m gara n’Ịntanet, ahụrụ m foto ụfọdụ ndị enyi m sere mgbe ha mere mkpapụ, ma ha akpọghị m. Nke a mere ka m na ajụ onwe m ma è nwere ihe na-eme m. Naanị ihe obi m gwara m bụ na ihe m anaghị amasị ha ma ọ bụkwanụ na ha achọghị ka mụ na ha na-anọ.”—Natalie.

    IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ọ̀ dịtụla mgbe ọ dị gị ka ụfọdụ ndị hà jụrụ gị ajụ? Ò nwere ihe i mere ka ha nwewe mmasị n’ebe ị nọ? Gịnị ka i mere?

  • N’ihi na ha achọghị ịdị iche n’ebe ndị ọzọ nọ. “Ndị mụrụ m ekweghị azụrụ m ekwentị. Ọ na-abụ ụmụaka ibe m jụọ m nọmba ekwentị m, m na-agwa ha na enweghị m ekwentị. Ọ na-agbagwoju ha anya, ha ajụọ m, si: ‘Ị̀ sị gịnị? Ị̀ ka bụ taata?’ M gwa ha na adị m afọ iri na atọ, ha emetewere m ebere.”—Mary.

    IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee ihe nne na nna gị ga-asị gị emela nwere ike ime ka i chee na ị gbapụrụ iche n’ebe ndị ọzọ nọ? Olee ihe ị ga-eme?

  • N’ihi na ha achọghị ka ndị ọzọ na-achọ ha okwu. “Ụmụ akwụkwọ ibe m anaghị enwekarị mmasị n’ebe onye àgwà ya dị iche na nke ha nọ, onye na-anaghị ekwu okwu otú ha si ekwu, nakwa onye ha na ya na-anaghị ekpe otu okpukpe. Ha chọpụta na ị dị iche, ha nwere ike ịchọwa gị okwu.”—Olivia.

    IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ò nwetụla mgbe a chọrọ gị okwu n’ihi na ị dị iche? Gịnị ka i mere mgbe ahụ?

  • N’ihi na ha achọghị ka ndị enyi ha hapụ ha. “M na-agbalị ka m na-eme ihe otú ibe m si eme, na-ekwu okwu otú ha si ekwu ma na-eso ha na-achị ọchị mgbe ihe mere ha ji achị ọchị atọghị m ọchị. M na-esokwa ha mgbe ha na-achị ndị mmadụ ọchị, ọ bụ eziokwu na m makwa na ọ ga-ewute onye ahụ.”—Rachel.

    IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ka ndị ọgbọ gị nwee mmasị n’ebe ị nọ? Ò nweela mgbe ị gbanwere otú i si ekwu okwu ma ọ bụ otú i si akpa àgwà naanị ka ị ghara ịgbapụ iche?

 Ihe i kwesịrị ịma

  • Ime ka ndị ọzọ naanị ka ị ghara ịdị iche nwere ike ịkụ gị ahịa. Maka gịnị? N’ihi na ndị mmadụ na-achọpụtakarị na ihe ahụ esighị gị n’obi. Otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ aha ya bụ Brian kwuru, sị, “M mewa ka ụmụ klas ibe m ma mụ na ha nọrọ, m ka na-agbapụtụkwa iche. M chọpụtara na ọ kacha mma ime ihe otú m si eme ihe n’ihi na ndị ọzọ ga-ama na m na-achọ ime ka onye ọzọ.”

    IHE KA MMA Ị GA-EME: Chebara ihe ka gị mkpa echiche. Baịbụl kwuru, sị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka mụ mkpa? Ọ̀ bụ ịgbalị mewe ihe otú ndị ọzọ si eme ka m ghara ịdị iche, ka ọ̀ bụ ịnọ na-eme ihe otú m si eme?’

    “Ịgbalị imewe ka ndị ọzọ agaghị abara gị uru. Ọ gaghị eme ka ndị mmadụ hụkwuo gị na anya, ma ọ bụkwanụ mee ka ị ghọkwuo ezigbo mmadụ.”—James

  • Ịchọ ịdị ka ibe gị nwere ike ime ka ndị ọzọ na-atụrụ gị ụka. O nwere ike ime ka ị bụrụ onye na-eme ihe ọ bụla ndị ọzọ sịrị gị mee iji mee ka ha nwewa mmasị n’ebe ị nọ. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Jeremy, sịrị: “M na-emebu ihe ọ bụla m nwere ike ime ka m ghara ịdị iche n’ebe ndị ọzọ nọ, n’agbanyeghị ma ọ̀ ga-eme ka a kpọwa m aha ọjọọ. O mere ka ndị ọzọ na-atụrụ m ụka. M na-eme ihe ha chọrọ, na-ekwukwa ihe ha chọrọ.”

    IHE KA MMA Ị GA-EME: Mara ihe i kwesịrị ime ma na-eme ya eme, kama ime ka ogwumagala na-abụ ya hụ ụcha ya achaa ụcha, ya ahụ ojii ya ejie oji. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Emela ihe naanị n’ihi na onye ọ bụla na-eme ya.”—Ọpụpụ 23:2, Holy Bible—Easy-to-Read Version.

    “M gbalịrị nwewa mmasị n’ihe niile na-amasị ndị enyi m, ma egwú, egwuregwu, ejiji, fim na ihe ndị ha ji achọ mma. . . . M gbalịrị ịdị ka ha. Echere m na ha ma na ihe ndị a m na-eme esighị m n’obi. Ma mụ ma ndị ọzọ makwa na m na-ejije ndị ọzọ. O mechara mewe m obi ọjọọ, owu ana-amakwa m, amaghịzi m onwe m. Amaghịkwa m ihe m chọrọ achọ. Abịara m mụta na ọ bụghị mmadụ niile ị hụrụ ka ihe ga-adabara gị na ha, ọ bụghịkwa ha niile ka ihe gị ga-amasị. Nke a apụtaghị na ị ga-akwụsị imeta ndị enyi. Naanị ihe ọ chọrọ gị n’aka bụ inwe ndidi. Cheta na imeta ezigbo ndị enyi na mmadụ ịma nke a na-akọ na-ewe oge.”—Melinda.

  • Ịchọ ịdị ka ibe nwere ike ime ka ị kpawa àgwà ọjọọ. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Chris chọpụtara na ihe mere otu onye ikwu ha gosiri na ihe a bụ eziokwu. Chris kwuru, sị: “Ọ malitere ime ihe ọ na-anaghị emebu, dị ka ịṅụ ọgwụ ike, naanị ka ọ ghara ịdị iche. Ọgwụ ike bịara rie ya ahụ́, ọ fọkwara obere ka ọ taa isi ya.”

    IHE KA MMA Ị GA-EME: Gbaara ndị okwu ọnụ ha na omume ha na-adịghị mma ọsọ. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”—Ilu 13:20.

    “Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mma ime ihe ga-eme ka ị ghara ịdị iche n’ebe ndị ọzọ nọ. Ma i kwesịghị ime ya ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka i mee ihe na-adịghị mma. Ndị bụ́ ezigbo mmadụ ga-emeta gị enyi n’ihi àgwà ọma gị.”—Melanie.

    Aro: Ị chọọ imeta ndị enyi, achọla naanị ndị ihe na-amasị gị na-amasị. Chọọ ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ma na-akpakwa àgwà ọma ka gị.

    Ọ bụghị ákwà niile ga-adị gị mma n’ahụ́. Otú ahụkwa ka ọ na-abụghị mmadụ niile ga-eme ka ị bụrụ ezigbo mmadụ