Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka?​—Nke 1: Na-agụ Baịbụl Gị

Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka?​—Nke 1: Na-agụ Baịbụl Gị

 “Agbaala m mbọ ka m bido ịgụ Baịbụl. Ma m lechaa otú ọ hà, ike agwụ m.”​—Briana, ọ dị afọ 15.

 Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka.

 Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agụ Baịbụl?

 E kwute okwu ịgụ Baịbụl, ọ̀ na-agwụ gị ike? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị ghọtara. O nwere ike ịbụ na ị na-echeta na Baịbụl buru ezigbo ibu, na mkpụrụ akwụkwọ ya dị ntakịrị, nakwa na e nweghị foto dị na ya. Ọ dịghịkwa ụtọ ka ile tiivi ma ọ bụ fim.

 Mana, weregodị ya na ị hụrụ otu igbe oge ochie buru ezigbo ibu nke akụ̀ dị iche iche bara ezigbo uru juru n’ime ya. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịma ihe dị ya n’ime?

 Baịbụl dị nnọọ ka igbe ahụ akụ̀ juru n’ime ya. Ihe ndị e dere na ya dị ka akụ̀. Ha ga-enyere gị aka

  •   Ime mkpebi ndị dị mma

  •   Ka gị na ndị mụrụ gị na-ebi n’udo

  •   Imeta ezi ndị enyi

  •   Ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị

 Gịnị mere akwụkwọ a e dere n’oge ochie ji baa ezigbo uru otú a n’oge anyị? Ọ bụ maka na “ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) Ọ pụtara na ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl si n’aka Onye kacha mara ihe.

Baịbụl dị ka igbe akụ̀ ndị bara ezigbo uru juru. O kwuru ihe ndị bara ezigbo uru

 Olee otú m kwesịrị isi na-agụ Baịbụl?

 Nke mbụ bụ ịgbalị gụọ Baịbụl, si n’isi ruo ná ngwụcha. Ọ ga-eme ka ị mata isi ihe Baịbụl na-ekwu. E nwere ọtụtụ ụzọ i nwere ike isi gụọ Baịbụl. Lee abụọ n’ime ha:

  •    I nwere ike ịgụ akwụkwọ iri isii na isii dị na Baịbụl n’usoro ha si dị, ya bụ, malite na Jenesis ruo ná Mkpughe.

  •    I nwere ike ịgụ Baịbụl n’usoro ihe ndị a kọrọ na ya si mee.

 Ihe ga-enyere gị aka: Ị gaa na A7 na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, ị ga-ahụ ebe e depụtara ihe ndị mere ná ndụ Jizọs mgbe ọ nọ n’ụwa n’usoro ha si mee.

 Ụzọ nke abụọ i nwere ike isi gụọ Baịbụl bụ ịgụ akụkọ kwuru gbasara ihe bụ́ mkpa gị ná ndụ. Dị ka ihe atụ:

 Ihe ga-enyere gị aka: Ị gụwa Baịbụl, nọrọ ebe ụzụ na-adịghị ka a ghara inwe ihe ga-eme ka uche gị pụọ n’ihe ị na-agụ.

 Ụzọ nke atọ i nwere ike isi gụọ Baịbụl bụ ịhọrọ otu akụkọ Baịbụl ma ọ bụkwanụ otu ebe n’abụ ọma. Ị gụchaa ya, gị echee otú o si gbasa gị. Jụọkwa onwe gị ajụjụ ndị a:

  •    Gịnị mere Jehova ji hụ na e denyere akụkọ a na Baịbụl?

  •    Gịnị ka ọ na-egosi banyere ụdị onye Jehova bụ ma ọ bụ otú o si eme ihe?

  •    Olee otú m ga-esi eme ihe a m mụtara?

 Ihe ga-enyere gị aka: Kpebie na ị ga na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Dee ụbọchị ị ga-achọ ịmalite ma jiri Usoro Ọgụgụ Baịbụl nke dị na jw.org na-agụ ya.