Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

È Nwere Ihe Ụdị Egwú M Na-akpọ Mere?

È Nwere Ihe Ụdị Egwú M Na-akpọ Mere?

“Mgbe ọ bụla m jikechara ịgawa ebe m na-aga, m na-agbanye egwú. M banye n’ụgbọala, m gbanye egwú. Mgbe ọ bụla m nọ n’ụlọ na-ezu ike, na-ehicha ihe ma ọ bụ na-agụ akwụkwọ, m na-akpọnye egwú. M na-ege egwú mgbe ọ bụla.”​—Carla.

Egwú ọ̀ na-amasị gị otú o si amasị Carla? Ya bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka ịhụ uru egwú bara, otú ị ga-esi ezere nsogbu ndị dị́ na ya, na otú ị ga-esi na-akpachapụ anya ahọrọ ụdị egwú ị ga na-ege.

 Uru egwú bara

E nwere ike iji ige egwú tụnyere iri nri. Iri nri bara uru ma iribiga ya oké na-akpata nsogbu. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ige egwú. Tụlee uru egwú bara:

  • Egwú nwere ike ime ka obi dị́ gị mma.

    “Ọ bụrụ na obi adịghị m mma, m gbanyehaala egwú kacha atọ m ụtọ, obi na-adị m mma ozugbo.”​—Mark.

  • Egwú nwere ike ime ka i cheta ihe mere n’oge gara.

    “E nwere otu egwú ọ na-abụ m nụ, m cheta ihe mere m obi ụtọ n’oge gara aga. Obi na-adị m ezigbo ụtọ mgbe ọ bụla m nụrụ egwú ahụ.”​—Sheila.

  • Egwú nwere ike ime ka ndị mmadụ na ibe ha dịrị n’otu.

    “Mgbe m gara otu mgbakọ mba niile nke Ndịàmà Jehova, anyị mmiri gbara m mgbe ndị niile bịara ya na-abụ abụ mmechi. Anyị niile na-asụ asụsụ dị́ iche iche, ma abụ ahụ mere ka anyị dịrị n’otu.”​—Tammy.

  • Egwú nwere ike ime ka ị mụta ịkpa ọtụtụ àgwà ọma.

    “Ịmụ otú e si eji ngwá egwú akụ egwú na-eme ka mmadụ mụta inwe ndidi. Ọ bụghị ihe mmadụ na-amụta ngwa ngwa. Naanị ihe ga-eme ka mmadụ mụta ya bụ onye ahụ inwe ndidi.”​—Anna.

Ị̀ maara? Akwụkwọ Baịbụl kacha buo ibu bụ akwụkwọ Abụ Ọma. Abụ dị́ na ya dị otu narị na iri ise.

Otú ahụ ị na-ahọ nri ị na-eri ahọ ka i kwesịkwara ịna-ahọ ụdị egwú ị na-ege ahọ

 Nsogbu ndị dị́ n’egwú

Ụfọdụ egwú dị ka nri mebiri emebi, ha nwere ike ịkpatara mmadụ nsogbu. Lee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ.

  • Ihe a na-ekwu n’ọtụtụ egwú bụ gbasara omume rụrụ arụ.

    “O yiziri ka egwú ndị kacha ewu ewu bụ ndị na-ekwu naanị gbasara mmekọahụ rụrụ arụ. Ha anaghịzidi ezo ọnụ.”​—Hannah.

    Baịbụl kwuru, sị: “Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 5:⁠3) Jụọ onwe gị, sị: ‘Ụdị egwú m na-ege ọ̀ na-eme ka m ghara irube isi na ndụmọdụ a Baịbụl nyere?’

  • Egwú ụfọdụ nwere ike ime ka obi na-ajọ gị njọ.

    “Mgbe ụfọdụ, m na-amụ anya n’abalị na-ege egwú na-eme ka m na-eche banyere ihe ndị na-eme ka ike ụwa gwụ m. Ụdị egwú a nwere ike ime ka ihe ọjọọ na-abata m n’obi.”​—Tammy.

    Baịbụl kwuru, sị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị.” (Ilu 4:​23) Jụọ onwe gị, sị: ‘Egwú m na-ege ọ̀ na-eme ka m chewe ihe na-adịghị mma n’obi m?’

  • Egwú ụfọdụ nwere ike ime ka ị na-ewe iwe.

    “Egwú ndị na-eme ka mmadụ na-ewe iwe, kpọọ ndị ọzọ asị, ma ọ bụ leda onwe ya anya na-akpatara m nsogbu. M na-achọpụta na obi anaghị adịzi m mma ma m gehaala ụdị egwú ahụ. Ndị ezinụlọ anyị achọpụtakwala ya.”​—John.

    Baịbụl kwuru, sị: “Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ, ya bụ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu.” (Ndị Kọlọsi 3:⁠8) Jụọ onwe gị, sị: ‘Egwú m na-ege ọ̀ na-eme ka m na-ewe iwe ma ọ bụ ghara ịna-echebara ndị ọzọ echiche?’

Gịnị ka i kwesịrị ime? Na-ahọ ụdị egwú ị na-ege ahọ. Ọ bụ ihe otu nwa agbọghọ a na-akpọ Julie na-agbalị ime. Ọ sịrị: “M na-elerukarị egwú ndị m nwere anya, na-ewepụkwa nke ọ bụla na-adịghị mma. Ọ naghị adị mfe mgbe niile, ma ama m na ọ bụ ihe m kwesịrị ime.”

Otu nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Tara na-eme ụdị ihe a. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịna-akụ egwú ụda ya na-atọ ezigbo ụtọ na redio. Ma, m gee ntị nụ ihe ha na-agụ, m na-etinye redio ahụ n’ebe a na-eme ihe ọzọ. Ihe a m na-eme dị ka mmadụ ịgbụpụ nri dị́ ụtọ ọ kpụ n’ọnụ. Ma, ọ bụrụ na m nwee ike izere egwú ndị na-ekwu gbasara omume rụrụ arụ, ọ ga-adịrị m mfe izere ime omume rụrụ arụ. Achọghị m ịna-eche na e nweghị ihe ụdị egwú m na-ege nwere ike ime m.”