Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe ndị a bụ obere ụlọ yiri ụlọikwuu. Ha dị n’ala ala ugwu Tash Rabat

OBODO NA NDỊ BI NA YA

Mgbe M Gara Kegịstan

Mgbe M Gara Kegịstan

KEGỊSTAN dị n’etiti Eshia. Ọtụtụ ugwu gbara ya gburugburu, snoo na-ekpuchikarịkwa ugwu ndị ahụ. Obodo ndị gbara ya gburugburu bụ Kazakstan, Uzbekịstan, Tajikistan, na Chaịna. Kegịstan bụ nnọọ ugwu ugwu. Ọ dị n’elu elu otu ugwu a na-akpọ Tian Shan. Ugwu a dị n’ọtụtụ obodo dị n’Eshia. Ọhịa adịchaghị n’obodo a. Ma, otu ihe pụrụ iche bụ na ụkpa juru n’ọhịa ndị nke dị na ya. O so n’obodo ndị ụkpa hiri nne na ha.

Ndịàmà Jehova na-amụrụ ọtụtụ puku ndị bi na Kegịstan Baịbụl

Ihe e ji mara ndị Kegịstan bụ na ha na-anabata mmadụ nke ọma, na-akwanyekwara mmadụ ùgwù. Ha na-akwanyere onye tọrọ ha ùgwù ma ha gwawa ya okwu. Ha na-ebiliri ya n’oche, na-ahapụkwara ya oche kacha mma.

Ndị obodo ahụ na-amụ ụmụ atọ ma ọ bụ karịa. Nwa ha nwoke nke ọdụdụ na nne ya na nna ya na-ebikarị, ma ọ̀ lụrụ nwaanyị ma ọ lụghị. Ọ bụkwa ya ga-ele ha nká.

Ha na-ebido mgbe nwa ha nwaanyị ka dị obere kụziwere ya otú nwaanyị kwesịrị isi na-arụ ọrụ n’ụlọ. Mgbe nwa ahụ na-erule afọ iri na ise, o nweghị ọrụ nwaanyị na-arụ n’ụlọ ọ na-agaghị ama otú e si arụ ya. Ọ lawa di, a na-edu ya ụlọ. Ihe ụfọdụ ha nwere ike inye ya bụ ákwà dị iche iche, ma ndị nke e ji ehi ụra, ma ndị nke a na-eyi eyi, nakwa kapet ndị e ji aka kpaa. Di na-alụ ya nwere ike iji ego ma ọ bụ anụmanụ kwụọ ụgwọ isi ya.

Ha na-egbukarị atụrụ ma ọ bụ ịnyịnya ma ha liwe ozu ma ọ bụ mewe ememme ndị ọzọ. Ha na-eke anụ ya, mpaghara nke ọ bụla nwere onye a na-ekenye ya. A na-esi n’onye nke tọchara ma ọ bụkwanụ onye nke ọkwá ya kacha kere gbadawa n’ihi otú ha na-esi akwanyere mmadụ ùgwù. Ha na-erikwa nri ha na-akpọ beshbamak n’ememme ha. Ọ bụ aka ka ha na-eji eri ya.

Ha na-akpọ ihe a Komuz. Ha na-ejikarị ya akpọ egwú