ISIOKWU TETA! A | OTÚ Ị GA-ESI AKWỤSỊ ÀGWÀ RIRILA GỊ AHỤ́
3 Adala Mbà
O nwere otu ọkachamara kwuru na ịmụta àgwà ọhụrụ na-ewe mmadụ ụbọchị iri abụọ na otu. Ma, ihe ndị a chọpụtarala na-egosi na ndị ụfọdụ anaghị eru ụbọchi ole ahụ tupu ha amụta àgwà ọhụrụ. O nwekwara ndị nke ha na-akarị ụbọchị ole ahụ. Ma, ihe a ekwesịghị ime ka anyị daa mbà.
Ka e were ya na ị chọrọ ịna-emega ahụ́ ugboro atọ n’izu.
-
N’izu nke mbụ, i megara ahụ́ ugboro atọ ahụ i kpebiri.
-
N’izu nke abụọ, gị emee ya ugboro abụọ.
-
N’izu nke atọ gị emezuokwa ya ugboro atọ.
-
N’izu nke anọ, gị ejisie ike mee ya naanị otu ugboro.
-
N’izu nke ise, gị emezuokwa ya ugboro atọ ahụ ọzọ. Malite mgbe ahụ gawa, ị nọzi na-emezu ya otú ahụ ị chọrọ.
Ihe ọ pụtara bụ na o were gị izu ise tupu ya amara gị ahụ́. O nwere ike ịdị gị ka à ga-asị na o were gị oge hiri nne. Ma, obi ga-adị gị ụtọ na i mewela ihe ọhụrụ i kpebiri ịna-eme.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.”—Ilu 24:16.
Amaokwu Baịbụl a na-ekwu na anyị ekwesịghị ịda mbà. Ihe ka mkpa bụ na anyị mechara mewe ihe anyị kpebiri ime, ya amarakwa anyị ahụ́, ọ bụghị ugboro ole anyị dara.
Ihe ka mkpa abụghị ugboro ole ị dara, kama ọ bụ ugboro ole i biliri mgbe ị dara
IHE I NWERE IKE IME
-
Ọ bụrụ na i kpebiri ịkwụsị otu ihe ririla gị ahụ́, gị emechaa mee ya ọzọ, echekwala na ọ pụtara na ị gaghị akwụsịli ya. Buru n’obi na i nwere ike ịda mgbe ụfọdụ.
-
Na-echeta oge ndị i mere nke ọma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i kpebiri na ị gaghịzi eji olu ike na-agwa ụmụ gị okwu, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee mgbe ikpeazụ iwe juru m obi, mụ ejide onwe m kama ịbawara ụmụ m mba? Gịnị ka m mere mgbe ahụ? Olee otú m ga-esi eme ya ọzọ?’ Ichebara ụdị ajụjụ ndị a echiche ga-eme ka ị na-emekwu nke ọma.
Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịma ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ná ndụ, dị ka otú ị ga-esi kwụsị ịna-echegbu onwe gị, otú unu ga-esi na-ebi n’udo n’ezinụlọ unu, nakwa otú ị ga-esi na-enwe ezigbo obi ụtọ, gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ma ọ bụ gị agaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig.

