Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ntụziaka Ndị Na-eme Ka E Nwee Ezi Obi Ụtọ

Ntụziaka Ndị Na-eme Ka E Nwee Ezi Obi Ụtọ

Ntụziaka Ndị Na-eme Ka E Nwee Ezi Obi Ụtọ

I JI nwee ike isi nri dị ezigbo ụtọ, ọ dị mkpa inwe ntụziaka dị mma banyere otú a ga-esi sie ya, nweekwa onye bụ́ aka ochie n’isi nri nke ga-esi ya! N’ụzọ ụfọdụ, otú ahụ ka ọ dị ma a bịa n’inweta obi ụtọ. Ọ bụghị nanị otu ihe na-eme ka e nwee obi ụtọ, kama ọtụtụ ihe ná ndụ na-agbakọ aka eme ka e nwee ya. Ihe ndị a bụ ọrụ, egwuregwu, iwepụta oge iji soro ezinụlọ na ndị enyi nọkọọ, na ịrụ ọrụ Chineke. Ma e nwekwara ihe ndị ọzọ na-apụtachaghị ìhè bụ́ ndị na-eso eme ka mmadụ nwee obi ụtọ, ihe ndị dị ka àgwà mmadụ, ọchịchọ ya, na ihe mgbaru ọsọ ndị o setịpụụrụ onwe ya ná ndụ.

Anyị nwere ekele na ọ dịghị mkpa ka anyị gaa chọgharịwa ntụziaka ndị ọ ga-abụ anyị gbasoo, anyị enwee ezi obi ụtọ. N’ihi gịnị? N’ihi na Onye Okike anyị enyela anyị ọmarịcha akwụkwọ ntụziaka, bụ́ Bible, bụ́ nke e nwere ugbu a n’ozuzu ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ n’asụsụ karịrị puku abụọ na narị atọ na iri asaa na asaa. Ọ dịghịkwa akwụkwọ ọzọ e bipụtarala n’asụsụ há otú ahụ n’ụwa nile!

Imerime ọnụ ọgụgụ na asụsụ a e bipụtarala Bible na-egosi na Chineke chọrọ ka mmadụ nile nwee obi ụtọ, chọọkwa ka ya na ha dị ná mma. (Ọrụ 10:34, 35; 17:26, 27) Chineke kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ . . . Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru.” Ọ bụrụ na anyị edebe ihe ndị o nyere n’iwu, ọ na-ekwe nkwa inye anyị udo nke ga-aha “ka osimiri.”—Aịsaịa 48:17, 18.

Nkwa ahụ na-echetara anyị okwu Jizọs e hotara n’isiokwu bu ụzọ, nke bụ́: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ịma mkpa ime mmụọ e kwuru banyere ya ebe a abụghị mmadụ ime nsọ nsọ iji mezuo iwu. Kama, o kwesịrị imetụta akụkụ nile nke ndụ anyị. Ọ na-egosi na anyị chọrọ ige Chineke ntị, chọọkwa ka o zie anyị ihe n’ihi na anyị ghọtara na ọ maara anyị nnọọ nke ọma karịa ka anyị maara onwe anyị. Errol, bụ́ onye nọrọla na-amụ Bible ruo ihe karịrị afọ 50 ugbu a, kwuru, sị, “Ihe kasị eme ka m kwenyesie ike na Bible sitere n’aka Chineke bụ na mgbe ọ bụla i tinyere ihe ọ na-akụzi n’ọrụ, ọ na-arụpụta ihe dị mma!” Dị ka ihe atụ, tụlee ndụmọdụ magburu onwe ya Bible nyere n’ihe ndị dị ka ịchụso akụ̀ na ụba na ihe ụtọ.

Nduzi Amamihe Dị na Ya n’Ihe Banyere Ego

Jizọs kwuru, sị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ihe n’ụba, ndụ ya adịghị esi n’ihe ndị o nwere apụta.” (Luk 12:15) Ee, ihe na-ekpebi uru ị bara dị ka mmadụ, karịsịa uru ị bara n’anya Chineke, abụtụghị otú ego i nwere n’ụlọ akụ̀ haruru. N’ezie, ọ bụrụ na mmadụ achụwa akụ̀ na ụba, ọ ga na-akpatakwuru ya nchekasị mgbe nile. Nchekasị ahụ ga-eme ka ọ ghara inwe ọṅụ ná ndụ ma na-anapụ ya oge ọ gaara eji eme ihe ndị ka mkpa.—Mak 10:25; 1 Timoti 6:10.

Dị ka Richard Ryan nke United States, bụ́ prọfesọ n’ihe banyere akparamàgwà mmadụ, si kwuo, ka ndị mmadụ na-agbalịkwu inweta afọ ojuju site n’ịchụso ihe onwunwe, otú ahụ ka ha na-akụkwu afọ n’ala n’inweta ya ebe ahụ. Solomọn, bụ́ onye so dee Bible, si otú a kwuo ya: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ.” (Eklisiastis 5:10) A pụrụ iji ọnọdụ a tụnyere ọkọ anwụnta—gị na-akọ ya, ya ana-akọkwu gị ọkọ ruo mgbe ị kọpuru ya.

Bible na-agba anyị ume ịrụsi ọrụ ike na inweta obi ụtọ ná ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ. (Eklisiastis 3:12, 13) Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwekwu ùgwù, nke bụ́ ihe ọzọ dị mkpa nke na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Anyị nwekwara ike inweta ụfọdụ n’ime ihe ndị na-eme ka ndụ dị ezigbo ụtọ. Otú ọ dị, e nwere ọdịiche dị n’ịnụ ụtọ ihe ọma ndị ego pụrụ ịzụta na ime ka ịchụso akụ̀ na ụba bụrụ ihe mbụ ná ndụ anyị.

Ihe Ụtọ Nwere Ọnọdụ Ya

Iji ihe ndị metụtara Chineke akpọrọ ihe ná ndụ na-enyere anyị aka irite uru kasịnụ ná ntụrụndụ nakwa n’ihe ndị ọzọ na-eme ka ndụ dị ụtọ. Jizọs gara ntụrụndụ dị iche iche, bụ́ oge ndị e riri nri ma ṅụọ mmanya na ha. (Luk 5:29; Jọn 2:1-10) Ma, ihe ndị a abụtụghị ihe ndị kasị nye ya ọṅụ ná ndụ. Kama nke ahụ, ihe kasị nye ya obi ụtọ bụ ịrụ ọrụ Chineke, bụ́ nke gụnyere inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Chineke na nzube Ya maka ụmụ mmadụ.—Jọn 4:34.

Eze Solomọn mikpuru onwe ya n’ihe ụtọ iji mara ma ọ̀ bụ ya bụ isi ihe na-akpata obi ụtọ. O kwuru, sị: “M ga-emikpu n’ihe ụtọ ma kporie ndụ.” Eze a bara ọgaranya ejighị anya ụra nwee ihe ụtọ. N’ezie, o mikpuru onwe ya n’ihe ụtọ! Gịnịzi ka ọ chọpụtara n’ikpeazụ? O dere, sị: “Nke a bụkwa ihe efu.”—Eklisiastis 2:1, New English Bible.

Ihe efu na ịtọgbọ chakoo—nke ahụ bụ mmetụta ndị na-achụso ihe ụtọ na-enwekarị. N’ezie, mgbe ndị na-eme nchọpụta ji mmetụta ndị ha gbara ajụjụ ọnụ na-enwe n’ịchụso ihe ụtọ tụnyere nke ha na-enwe n’ịrụ ezigbo ọrụ ego, n’ịrụ ọrụ Chineke, nakwa n’iso ezinụlọ ha nọkọọ, ha chọpụtara na obi ụtọ ha na-enweta n’ihe ndị ọzọ ahụ karịrị nke ha na-enweta n’ịchụso ihe ụtọ.

Na-emesapụ Aka Ma Na-enwe Ekele

Kama ịdị na-eche nanị banyere onwe ha, ndị nwere obi ụtọ na-emesapụ aka ma na-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Jizọs kwuru, sị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) E wezụga inye ihe onwunwe, anyị pụrụ inye oge na ike anyị, bụ́ nke a pụdịrị ịka jiri kpọrọ ihe, karịsịa n’ime ezinụlọ. Di na nwunye kwesịrị ịdị na-ewepụta oge iji nọkọọ ka alụmdi na nwunye ha wee nọgide na-esi ike ma bụrụ nke obi ụtọ. Ndị mụrụ ụmụ kwesịkwara ịdị na-ewepụta oge zuru ezu iji soro ụmụ ha nọrịa, soro ha na-ekwurịta okwu, na-egosi ha ịhụnanya, ma na-akụziri ha ihe. Mgbe onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ si otú ahụ na-enye ihe, ihe na-agara ha nke ọma, ezinụlọ ahụ na-aghọkwa nke obi ụtọ.

N’aka nke ọzọ, mgbe ndị ọzọ nyere gị ihe—ma ọ̀ bụ site n’iwepụta oge ha meere gị ihe ma ọ bụkwanụ site n’ụzọ ndị ọzọ—ị̀ ‘na-egosi onwe gị ịbụ onye nwere ekele’? (Ndị Kọlọsi 3:15) Anyị ịbụ ndị na-enwe ekele pụrụ ime ka mmekọrịta anyị na ndị ọzọ kawanye mma, meekwa ka anyị nwekwuo nnọọ ọṅụ. Mgbe mmadụ ji obi ya nile kelee gị maka ihe i meere ya, obi ọ́ naghị adị gị ụtọ nke ukwuu?

Inwe ekele na-emekwa ka anyị mara ihe ọma ndị meere anyị. Ná nnyocha otu onye na-eme nchọpụta, nke na-arụ na Mahadum California, bụ́ nke dị n’obodo Riverside, U.S.A., ji nlezianya mee, ọ gwara ndị o ji mee nnyocha ahụ ka ha nwee “akwụkwọ ekele”—nke bụ́ akwụkwọ ha ga-eji na-edetu ihe ndị ha nwere ekele maka ya. Ọ bụghị ihe ijuanya na ruo ihe karịrị izu isii, i lee ndị ahụ o ji mee nnyocha anya, ị ga-ahụ na ha nwekwuru afọ ojuju ná ndụ.

Gịnị ka nke a na-akụzi? Ụdị ọnọdụ ọ sọrọ gị nọrọ, mụta ịgbakọ uru ndị ị na-erite ná ndụ. N’ezie, Bible na-agba gị ime otú ahụ mgbe o kwuru, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe nile. . . . Na-enyenụ ekele banyere ihe ọ bụla.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:16, 18) N’ezie, ka anyị wee nwee ike ime nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịgbalịsi ike ịdị na-echeta ihe ọma ndị meere anyị ná ndụ. Ọ́ gaghị adị mma ka ị malite mewe ya site ugbu a gawa?

Ịhụnanya na Olileanya—Ihe Ndị Dị Oké Mkpa Iji Na-enwe Obi Ụtọ

N’ụzọ dabara adaba, e kwuola na ahụ́ mmadụ na-achọsi ịhụnanya ike malite n’oge a mụrụ ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Ọ bụrụ na e gosighị ha ịhụnanya, ahụ́ anaghị adị ha mma. Ma, gịnị n’ezie bụ ịhụnanya? Ọ bụ ezie na n’oge a, ndị mmadụ na-akọwa okwu ahụ otú o si masị ha, Bible kọwara ya n’ụzọ magburu onwe ya, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrịrị ajọ omume ọṅụ, kama ọ na-aṅụrịrị eziokwu ọṅụ. Ọ na-edi ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-enwe olileanya ihe nile, na-atachiri ihe nile obi.”—1 Ndị Kọrint 13:4-8.

Lee ka ezi ịhụnanya si bụrụ nke na-adịghị achọ nanị ọdịmma nke ya! Ebe ọ bụ na “ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya,” ọ na-ebu ụzọ eme ihe ga-enye ndị ọzọ obi ụtọ tupu ya emewe nke ya. Ọ dị mwute ikwu na ụdị ịhụnanya a na-adịwanye ụkọ. N’ezie, ná nnukwu amụma Jizọs buru banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe a, o kwuru na “ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ [ga-ajụ] oyi.”—Matiu 24:3, 12; 2 Timoti 3:1-5.

Ma, ọnọdụ a agaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na ọ na-ebutere Onye Okike—onye bụ́ ịhụnanya n’onwe ya—mkparị! (1 Jọn 4:8) N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ekpochapụ ndị nile na-akpọ ibe ha asị ma ọ bụ ndị na-ebi ndụ anyaukwu, n’ụwa. Nanị ndị ọ ga-echebe bụ ndị na-agbalịsi ike inwe ụdị ịhụnanya ahụ a kọwara na Bible. N’ihi ya, a ga-enwe udo na obi ụtọ n’ụwa nile. Nkwa a Bible kwere ga-emezurịrị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:10, 11.

Chegodị echiche banyere ibi ndụ ‘na-atọ ụtọ’ kwa ụbọchị! Ka a sịkwa ihe mere Bible ji kwuo, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’olileanya ahụ.” (Ndị Rom 12:12) Ọ̀ ga-amasị gị ịmatakwu banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke kwuru ka ụmụ mmadụ na-erube isi nwewe olileanya maka ha? Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị, biko gụọ isiokwu na-esonụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

“A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Akụkọ Banyere Ndị Ihe Gaziiri ná Ndụ—Ihe Ọ̀ Gaziiri Ha n’Eziokwu?

Mgbe ụfọdụ, anyị na-anụ akụkọ banyere ndị tolitere n’ezinụlọ ihe na-esiri ike, ma ha agbasie mbọ ike ma mechaa baa nnọọ ọgaranya. Otu akụkọ banyere obi ụtọ, bụ́ nke gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ San Francisco Chronicle, na-akọwa, sị: “A na-ehota ụdị akụkọ a mgbe ụfọdụ dị ka ihe àmà na-egosi na ndị dị otú ahụ ji ọnọdụ ọjọọ ha mee ihe n’ụzọ kasị mma, na ihe mesịrị gaziere ha n’agbanyeghị na ha tara ahụhụ mgbe ha dị obere ma ọ bụkwanụ n’ihi ahụhụ ahụ ha tara. Otu nnyocha e mere gosiri na nsogbu dị ná nkọwa a bụ na ihe nwere ike ọ gazichaghịrị ndị a otú ahụ e chere. Ihe ha mere bụ nanị ịba ọgaranya.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Obi Ụtọ Na-eme Ka E Nwee Ezi Ahụ́ Ike

Obi ụtọ bụ ezigbo ọgwụ. Otu akụkọ e dere na magazin bụ́ Time kwuru na “obi ụtọ ma ọ bụ ihe ndị yiri ya, dị ka inwe olileanya, nchekwube, na afọ ojuju yiri ka hà pụrụ ime ka mmadụ ghara ịrịa ọrịa obi, ọrịa akpa ume, ọrịa shuga, ọbara mgbali elu, ahụ́ ọkụ, na ọrịa ndị dị ka azụ̀zụ̀, ma ọ bụkwanụ mee ka ọrịa ndị ahụ ghara ịkpụ ọkụ n’ọnụ ma onye ahụ rịawa ha.” Ọzọkwa, otu nnyocha e ji ndị agadi na-arịa ọrịa na Holland mee gosiri na, n’ime ihe karịrị afọ itoolu, ndụ ha gbatịkwuru n’ụzọ dị ịtụnanya ruo pasent 50 n’ihi obi ụtọ na olileanya ha nwere!

A chọpụtabeghị otú ọnọdụ uche mmadụ si emetụta ahụ́ ya. Ma, nnyocha e mere na-egosi na ahụ́ nke ndị na-enwe nchekwube na olileanya ná ndụ adịghị emepụtakebe mmiri ọgwụ ahụ́ a na-akpọ cortisol, bụ́ nke na-ebelata ike ahụ́ nwere ịlụso ọrịa ọgụ.

[Foto dị na peeji nke 4, 5]

Dị nnọọ ka ịgbaso ntụziaka dị mma banyere isi nri pụrụ isi mee ka e sie nri dị ezigbo ụtọ, otú ahụ ka ịgbaso nduzi Chineke pụrụ isi mee ka e nwee obi ụtọ