Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị Tesalonaịka 5:1-28

  • Ụbọchị Jehova ga-abịa (1-5)

    • “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!” (3)

  • Mụrụ anya ma na-eche echiche nke ọma (6-11)

  • Agbamume (12-24)

  • Ekele mmechi (25-28)

5  Ụmụnna anyị, ọ dịghị mkpa ka e detara unu ihe ọ bụla banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-eme. 2  N’ihi na unu ma nke ọma na ụbọchị Jehova*+ ga-abịa nnọọ otú onye ohi si abịa n’abalị.+ 3  Mgbe ọ bụla ha na-asị, “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!” a ga-ebibi ha na mberede mgbe ha na-atụghị anya ya,+ otú ahụ ime si eme nwaanyị dị ime na mberede. Ha agaghị agbanahụ ya. 4  Ma ụmụnna anyị, unu anọghị n’ọchịchịrị. N’ihi ya, ụbọchị ahụ agaghị abịa unu na mberede otú chi si abọkwute ndị ohi, 5  n’ihi na unu niile bụ ụmụ nke ìhè na nke ehihie.+ Anyị abụghị ụmụ nke abalị ma ọ bụ nke ọchịchịrị.+ 6  N’ihi ya, ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra otú ndị ọzọ na-ehi,+ kama ka anyị mụrụ anya+ ma na-eche echiche nke ọma.+ 7  N’ihi na ndị na-ehi ụra na-ehi ya n’abalị, ndị na-aṅụbigakwa mmanya ókè na-aṅụbiga ya ókè n’abalị.+ 8  Ma anyị ndị bụ́ ụmụ nke ehihie, ka anyị na-eche echiche nke ọma ma yiri ihe e ji echebe obi bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa okpu agha bụ́ olileanya nzọpụta+ 9  n’ihi na Chineke họọrọ anyị, ọ bụghị ka o wesa anyị iwe, kama ka o si n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst zọpụta anyị.+ 10  Jizọs nwụrụ maka anyị,+ ka anyị na ya wee dịkọọ ndụ,+ ma ànyị mụ anya ma ànyị na-ehi ụra.* 11  N’ihi ya, na-agbanụ ibe unu ume* ma na-emenụ ka ibe unu dị ike,+ otú unu na-eme n’eziokwu. 12  Ụmụnna anyị, anyị na-arịọ unu ka unu na-akwanyere ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti unu ùgwù, bụ́ ndị na-eduzi unu n’ọrụ Onyenwe anyị ma na-adụ unu ọdụ. 13  Anyị na-arịọkwa unu ka unu jiri ha kpọrọ ihe ma na-ahụ ha n’anya nke ukwuu n’ihi ọrụ ha.+ Unu na ibe unu na-adị n’udo.+ 14  Ma anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, ka unu na-adọ ndị na-enupụ isi aka ná ntị,+ na-agụgụ ndị dara mbà, na-enyere ndị na-adịghị ike aka, na-enwekwara mmadụ niile ndidi.+ 15  Hụnụ na e nweghị onye ji ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ,+ kama na-emerenụ ibe unu na ndị ọzọ niile ihe ọma mgbe niile.+ 16  Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile.+ 17  Na-ekpenụ ekpere mgbe niile.+ 18  Na-ekelenụ Chineke maka ihe niile.+ Ihe a bụ ihe Chineke chọrọ ka unu na-eme ebe unu bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs. 19  Unu akwụsịla ọrụ mmụọ nsọ na-arụ n’ime unu.*+ 20  Unu eledala amụma anya.+ 21  Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile;+ jidesienụ ihe dị mma aka ike. 22  Gbaaranụ ụdị ajọ omume niile ọsọ.+ 23  Ka Chineke nke udo mee ka unu dị nsọ otú zuru ezu. Ụmụnna anyị, ka e meekwa ka àgwà ọma* unu na ndụ* unu na ahụ́ unu ghara inwe ntụpọ ọ bụla n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 24  Onye na-akpọ unu na-emezu ihe o kwuru. N’eziokwu, ọ ga-eme ya. 25  Ụmụnna anyị, na-ekperenụ anyị ekpere.+ 26  Susuonụ ụmụnna niile ọnụ mgbe unu na-ekele ha.* 27  Eji m aha Onyenwe anyị na-agwasi unu ike ka unu hụ na a gụụrụ ụmụnna niile akwụkwọ ozi a.+ 28  Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-ehi ụra ọnwụ.”
Ma ọ bụ “na-akasinụ ibe unu obi.”
Na Grik, “Unu emenyụla ọkụ nke mmụọ nsọ.”
Na Grik, “mmụọ.”
Na Grik, “mkpụrụ obi.”
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.