Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Enyi M Nwoke Imegbu M?

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Enyi M Nwoke Imegbu M?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Enyi M Nwoke Imegbu M?

“Taa, enyi m nwoke tiri m ihe na nke mbụ ya. Ọ rịọrọ mgbaghara, ma amaghị m ihe m ga-eme ugbu a.”—Stella. *

“IHE dị ka 1 onye n’ime ụmụ akwụkwọ ndị inyom 5,” ka otu akụkọ dị na magazin bụ́ The Journal of the American Medical Association na-ekwu, “kwuru na onye ha na ha na-eme mkpapụ etiwo ha ihe ma/ma ọ bụ metọọ ha n’ụzọ mmekọahụ́.” N’otu nnyocha e mere na Germany n’etiti ndị ntorobịa nọ n’agbata afọ 17 ruo 20, ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụmụ agbọghọ ahụ kwuru na e jiwo ime ihe ike, okwu ọnụ, ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya mee ka ha nwee mmekọahụ ha na-achọghị. Dị ka otu nnyocha e mere na United States na-egosi, pasent 40 nke ndị nọ n’afọ iri na ụma a jụtara echiche ha ahụwo ebe onye klas ha “kparịrị onye ha na ya na-eme mkpapụ n’ụzọ na-ewute ewute.” *

Ị̀ bụ nwa agbọghọ nke nwere mmasị ịlụ di, o wee bụrụ na onye ị chọrọ ịlụ na-akparị gị ma ọ bụ na-abakasị gị ahụ́ ma ọ bụ na-eweda gị ala, na-akwa gị aka, ma ọ bụ na-ama gị ụra? Isiokwu bu nke a ụzọ n’usoro isiokwu a na-egosi na mmegbu dị otú ahụ zuru ebe nile n’ụzọ na-eju anya. * Ọ gakwara n’ihu igosi na Jehova Chineke adịghị anabata okwu mkparị ma ọ bụ mmegbu, nakwa na ndị a na-emeso ya ekwesịghị ile àgwà ọjọọ ndị dị otú ahụ anya dị ka ihe dị otú kwesịrịnụ ma ọ bụ dị ka ihe si ha n’aka. (Ndị Efesọs 4:31) Otú o sina dị, ịmara ihe ị ga-eme n’ọnọdụ dị otú ahụ adịghị mfe. Ị ka pụrụ inwe ịhụnanya dị ukwuu n’ebe enyi gị nwoke nọ—n’agbanyeghị àgwà ya. Ma ọ bụ, nke ka njọ, ị pụrụ ịdị na-atụ ụjọ ihe ga-abụ mmeghachi omume ya ma ọ bụrụ na ị katọọ ihe ọ na-eme. Gịnị ka i kwesịrị ime?

Tụlee Ọnọdụ Ahụ

Nke mbụ, ọ dị gị mkpa iwetu obi ala ma jiri obi ọcha tụlee ihe meworonụ. (Eklisiastis 2:14) À kparịrị gị n’ezie? Enyi gị nwoke ò leziri nnọọ anya na-emegbu gị, ka ihe o mere ọ̀ bụ nanị ‘ikwu okwu n’echeghị eche’? (Ilu 12:18) Ugbo ole ka o meworo nke a? Ọ̀ bụ mmehie o mere otu ugbo nke ị pụrụ nnọọ ileghara anya? Ka ọ̀ na-ekwukarị okwu ndị na-eweda mmadụ ala ma ọ bụ okwu mkparị?

Ọ bụrụ na ị maghị mmetụta ị na-enwe n’akụkụ a, kọọrọ ya mmadụ—ọ bụghị onye ọgbọ gị, kama onye tọrọ gị nke ka gị mara ihe. Ikekwe ị pụrụ ịkọrọ ya nne na nna gị ma ọ bụ Onye Kraịst ibe gị tozuru okè. Nkwurịta okwu dị otú ahụ pụrụ inyere gị aka ịmata ma ị̀ na-emeghachi omume n’ụzọ gabigara ókè ma ọ bụ ma è nwere nsogbu dị oké njọ.

Ọ bụrụ na ọ dịghị ize ndụ ime otú ahụ, mee ndokwa iso enyi gị nwoke kwurịta banyere ya. (Ilu 25:9) Wetuo obi ala gwa ya mmetụta àgwà ya na-enwe n’ebe ị nọ. Gwa ya kpọmkwem ihe kpatara ihe o mere ji wee gị iwe. Gwa ya n’ụzọ doro anya ihe ndị ị na-agaghị anabata. Olee otú o si meghachi omume? Ò mere ntị ka ọ nụghị ihe i kwuru ma ọ bụ ọbụna gwakwuo gị okwu iwe? Nke a bụ ihe àmà doro anya na ọ chọghị ịgbanwe.

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na o gosipụta obi umeala kwesịrị onye na-asọpụrụ Chineke nakwa ezi nchegharị? Mgbe ahụ, ọ pụrụ ikwe omume mmekọrịta ahụ ịga n’ihu. Otú ọ dị, kpachakwara anya! Ndị na-agwakasịkarị mmadụ okwu ahụ́ na-ewepụtakarị oge kwuo ihe ndị yiri ka hà nwere ezi ịkwa ụta mgbe ha kwusịrị ihe wutere mmadụ—e mesịakwa ha ekwughachi okwu ọjọọ ahụ mgbe ọzọ a kpasuru ha iwe. Ka oge na-aga, ọ ga-apụta ìhè ma ọ̀ chọrọ n’ezie ịgbanwe. Otu ihe ga-egosi n’ụzọ dị mma ma ọ̀ chọsiri ike n’ezie ime otú ahụ ga-abụ njikere ọ dị inweta enyemaka n’aka Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye.—Jems 5:14-16.

Ghọta na “mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Chọọ elu chọọ ala, ị gaghị ahụ onye zuru okè. Ndị nile lụrụ di na nwunye ga-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha” n’ihi ezughị okè. (1 Ndị Kọrint 7:28) Mee elu mee ala, ị ghaghị ikpebi ma ntụpọ ya há bụ́ ndị ị ga-eji obi ụtọ nagide. Ọzọkwa, ikwe ka oge ụfọdụ gafee bụ ụzọ kasị mma isi chọpụta nke a.

Mgbe E Mesoro Gị Ihe Ike

Otú ọ dị, ọ bụ okwu ọzọ dị iche ma ọ bụrụ na okwu ọjọọ ahụ na-agụnye okwu rere ure e kwuru n’iwe ma ọ bụ gị abụrụ onye a na-eyi egwu imeso ihe ike ma ọ bụkwanụ gị abụrụ onye e mesoro ihe ike—ikekwe site n’ịkwa gị aka ma ọ bụ ịma gị ụra. Nke a na-egosi enweghị njide onwe onye bụ́ nke dị ize ndụ; ihe pụrụ ịka njọ n’ụzọ dị mfe gaa ọbụna n’ime ihe ike ndị ka njọ.

Ọ kasị mma ka ndị na-abụghị di na nwunye zere ịnọ nanị ha n’ebe ndị mmadụ na-anọghị. Ma ọ bụrụ na ọ dị otú i si hụ nanị onwe gị n’ebe nwoke na-eme ihe ike nọ, ‘ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ.’ (Ndị Rom 12:17) Chetakwa: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) Amala jijiji. Gwa ya ka ọ kpọlaa gị. Ya dị mkpa, jiri ije—ma ọ bụ ọsọ—pụọ!

Gịnị ma ọ bụrụ na nwoke anwaa ịmanye nwanyị isoro ya nwee mmekọahụ? N’ezie, ọ bụ ihe amamihe dị na ya nwoke na nwanyị ịkpa ókè doro anya ná ngosipụta ịhụnanya ha ná mmalite nke mbedo. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-5) Ọ bụrụ na nwa okoro arụgide nwa agbọghọ imebi ụkpụrụ Bible, nwa agbọghọ ahụ kwesịrị ịgwa ya n’ụzọ doro anya na ya agaghị ekwe. (Jenesis 39:7-13) “Ekwela,” ka Anne, bụ́ onye a rụgidere otú ahụ o wee nwee mmekọahụ, na-arịọ. “Mee onwe gị ka i nwee ùgwù. Biko, ehiela ụzọ otú a, n’agbanyeghị otú ị hụruru ya n’anya!” Ọ bụrụ na o leghara ọjụjụ ị jụrụ anya, gwa ya na ị ga-ele mgbalị ọzọ ọ ga-eme anya dị ka ndina n’ike. Ọ bụrụ na ọ kwụsịghị, tie mkpu enyemaka ma gbalịa iguzogide ya dị ka ị ga-eguzogide onye ọ bụla ọzọ chọrọ idina gị n’ike. *

N’ọnọdụ nke ọ bụla, ndụmọdụ Bible dị n’Ilu 22:24 dabara adaba: “Gị na onye iwe abụla enyi; ị gaghị esokwa onye ọnụma baa n’ụlọ.” Iwu ejighị gị n’ụzọ ọ bụla ịnọgide ná mmekọrịta a na-emegbu gị. N’ụzọ doro anya, ọ ga-abụ nzuzu nanị gị ịgakwuru nwoke na-emegbu gị iji gwa ya ka ọ gawara nke ya. Ma eleghị anya, ihe kasị mma ị ga-eme bụ ime ka nne na nna gị mara ihe merenụ. Dị ka o kwesịrị ịdị, iwe ga-ewe ha n’ihi mmegbu e megburu gị. Ma ha pụrụ inyere gị aka ikpebi ihe ndị ọzọ ọ dị mkpa ka e mee. *

Ịnwa Ịgbanwe Ya

Ka o sina dị, ọ bụghị ọrụ gị ime ka enyi gị nwoke gbanwee. Irena na-ekweta, sị: “I chere na ị hụrụ ya n’anya, na ị ga-edi ya, nakwa na ị pụrụ inyere ya aka. Ma ị pụghị nnọọ.” Nadine kwupụtakwara, sị: “Ana m eche mgbe nile na m pụrụ ịgbanwe ya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ nanị ya pụrụ ‘ime ka uche ya dị ọhụrụ’ ma gbanwee. (Ndị Rom 12:2) Ime otú ahụ ga-ewekwa oge na mgbalị siri ike.

Ya mere, kwụsie ike ná mkpebi gị, n’egeghị ntị n’ihe ọ bụla ọ pụrụ ikwu iji nweta obi gị. Gbalịa ịdị na-agbara ya ọsọ ruo n’ókè o kwere mee—n’ụzọ mmetụta uche nakwa n’ụzọ anụ ahụ́. Ekwela ka ọ gwa gị okwu, rịọ gị arịrịọ, ma ọ bụ yie gị egwu ịlaghachikwa ná mmekọrịta ahụ. Mgbe Irena gwara enyi ya nwoke na-eme ihe ike ka ọ gawara nke ya, o yiri egwu na ọ ga-egbu onwe ya. N’ụzọ doro anya, enyemaka dị onye dị otú ahụ mkpa, ma ọ bụghị enyemaka gị. Aka kasị mma ị ga-enyere ya bụ iguzogide àgwà na-ekwesịghị Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ịgbanwe, o nwere onwe ya ịchọ enyemaka.

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-eche na ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-egbo mkpa ahụ. Otu onye nnyocha na-ekwu, sị: “Ndị inyom bụ́ ndị lụrụ enyi ha nwoke na-emegbu ha na ndị ikom bụ́ ndị lụrụ enyi ha nwanyị na-emegbu ha na-enwekarị ihe ijuanya ịchọpụta na ime ihe ike ahụ adịghị akwụsị. Ọtụtụ ndị kweere n’echiche ụgha ahụ bụ́ na ozugbo ha lụrụ di na nwunye, nsogbu nile dị otú ahụ ga-emi ala. Ekwenyela ya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na, iti ihe nke malitere n’oge mbedo yikarịrị ka ọ̀ ga-adịgide ma a lụsịa di na nwunye.

“Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 22:3) Ịgwa onye ị hụrụ n’anya ka ọ gawara nke ya siri ike omume. Ma ịbụ onye tọrọ atọ n’alụmdi na nwunye a na-emegbu gị na ya siri ike ọbụna karị. E wezụga nke ahụ, ọ dịghị gị mkpa ịtụwa ụjọ na ị gaghị ahụ onye kwesịrị ekwesị. Site ná nghọta i nwetaworo, ị̀ ga-aka elerukwu anya n’ịchọta onye dị nwayọọ, obiọma, ma nwee njide onwe onye.

Ịgwọ Obi Mgbawa Ọ Ga-akpata

Ịbụ onye a na-agwakasị okwu ahụ́ ma ọ bụ onye a na-eti ihe pụrụ ịbụ ihe na-egbu mgbu. Otu onye a na-emeso otú ahụ nke aha ya bụ Mary na-adụ ọdụ, sị: “Chọọ enyemaka—kọọrọ ya mmadụ ozugbo. Echere m na apụrụ m ime ya n’onwe m, ma ịkọsara ndị ọzọ banyere ya enyeworo m aka.” Kọọrọ ya ndị mụrụ gị, enyi gị tozuru okè nke ị tụkwasịrị obi, ma ọ bụ Onye Kraịst bụ́ okenye. *

Ụfọdụ ndị ahụwokwa ya dị ka ihe na-enye aka bụ́ iji ọrụ n’aka site n’ikere òkè n’ihe ndị dị ka ịgụ akwụkwọ, ime egwuregwu, ma ọ bụ ihe omume ntụrụndụ ndị na-ewuli elu. “Nke kasị mkpa,” ka Irena na-echeta, “bụ ịmụ Bible na ịga nzukọ Ndị Kraịst.”

N’ụzọ doro anya, Jehova adịghị anabata okwu ma ọ bụ omume mkparị. Site n’enyemaka ya, ị pụrụ ichebe onwe gị pụọ n’ịbụ onye e megburu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 4 Ọ bụ ezie na a pụrụ ịgwakasị ma ndị nwoke ma ndị nwanyị okwu ahụ́ ma ọ bụ mesoo ha ihe ike, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa na United States na-ekwu na “a na-emerụ ndị inyom ahụ́ n’ụzọ dị ukwuu karịa ka a na-emerụ ndị ikom.” Ka o sina dị, iji mee ka ihe dị mfe, n’isiokwu a, anyị ga-ezo onye na-emegbu emegbu aka dị ka nwoke.

^ par. 5 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . N’ihi Gịnị Ka O Ji Emegbu M?” ná mbipụta Teta! nke June 8, 2004.

^ par. 15 Teta! nke July 8, 1993, nwere ihe ọmụma banyere iguzogide ndina n’ike.

^ par. 16 N’ọnọdụ ụfọdụ, dị ka mgbe mmadụ nwara idina gị n’ike, nne na nna gị pụrụ ikpebi ịga kọọrọ ndị uwe ojii. Nke a pụrụ igbochi ụmụ agbọghọ ndị ọzọ ịgabiga ahụmahụ ọjọọ dị otú ahụ.

^ par. 23 N’ọnọdụ ebe e nwere mkpasasị uche, ụfọdụ ndị pụrụ ịhọrọ ka onye dọkịta lebara ha anya.

[Foto dị na peeji nke 28]

Mmegbu a na-enwe n’oge mbedo na-adịgidekarị mgbe a lụsịrị di na nwunye

[Foto dị na peeji nke 29]

Abụla onye a manyere igosipụta ịhụnanya n’ụzọ ndị na-ekwesịghị ekwesị