Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ịbụ Onyeisi Ezinụlọ Pụtara?

Gịnị Ka Ịbụ Onyeisi Ezinụlọ Pụtara?

 Echiche nke Bible

Gịnị Ka Ịbụ Onyeisi Ezinụlọ Pụtara?

DỊ KA Bible si kwuo, “isi nke nwanyị bụ nwoke.” (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 5:23) Ma ọtụtụ, bụ́ ndị na-azọrọ na ha na-akwanyere Bible ùgwù na-eche na ụkpụrụ a nke mere di onyeisi abụghị nanị na ọ bụzi ihe mgbe ochie kamakwa na ọ dị ize ndụ. “Ozizi bụ́ na ụmụ nwanyị kwesịrị ‘iji obiọma na-edo onwe ha n’okpuru’ [di ha], ọ bụrụ na e mesie ya ike gabiga ókè, pụrụ iduga ná mmekpọ ọnụ, ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’ụzọ mmetụta uche,” ka otu di na nwunye na-ekwu. N’ụzọ dị mwute, iji ịbụisi eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi jupụtara nnọọ ebe nile. Otu onye edemede na-ede, sị: “N’ọtụtụ mba, a na-ewere mmadụ iti nwunye ya ihe dị ka ihe na-adịghị ihe o mere—ihe ruuru ndị ikom bụ́ nke a na-aja mma n’abụ, n’ilu, nakwa n’ememe agbamakwụkwọ.”

Ụfọdụ na-atụ aro na ọ bụ ụkpụrụ Bible nke metụtara ịbụisi kpatara mmekpọ ọnụ ndị a. Ozizi Bible nke ịbụisi ọ̀ na-ewetu ụmụ nwanyị ala ma na-akwado ime ihe ike n’ebe obibi? Gịnị n’ezie ka ịbụ onyeisi ezinụlọ pụtara? *

Ịbụisi Abụghị Ọchịchị Aka Ike

Ịbụisi nke Bible kwuru banyere ya bụ ndokwa ịhụnanya, ọ pụtaghị ọchịchị aka ike. Ọ bụ ileghara ịbụisi nke Chineke setịpụrụ anya mere ndị ikom na-ejikarị achị ndị inyom n’aka ike. (Jenesis 3:16) Kemgbe a chụpụsịrị mmadụ n’ogige Iden, ndị ikom ejiwo ike ha mee ihe ugboro ugboro  n’ụzọ na-ezighị ezi, jiri obi ịta mmiri na-emegbu ndị ọzọ, nke na-agụnye ndị inyom na ụmụaka.

Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe nke ahụ so ná nzube Chineke. Jehova na-akpọ ndị na-eji ikike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi asị. Ọ katọrọ ndị ikom Izrel bụ́ ndị “ghọgbuworo” nwunye ha. (Malakaị 2:13-16) Ọzọkwa, Chineke na-ekwu na “onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) Ya mere, ndị na-eti nwunye ha ihe na ndị na-emegbu nwunye ha n’ụzọ ndị ọzọ apụghị n’ụzọ ọ bụla iji Bible kwadoo omume ihe ike ha.

Gịnị Ka Ịbụisi n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị Na-agụnye?

Ịbụisi bụ ndokwa bụ́ isi nke Chineke na-eji eme ka ihe na-aga n’usoro n’eluigwe na ala. Onye ọ bụla, e wezụga Chineke, nwere onye ha na-edo onwe ha n’okpuru ya. Ndị ikom na-edo onwe ha n’okpuru Kraịst, ụmụ na-edo onwe ha n’okpuru nne na nna ha, Ndị Kraịst nile na-edo onwe ha n’okpuru ndị ọchịchị. Ọbụna Jizọs na-edo onwe ya n’okpuru Chineke.—Ndị Rom 13:1; 1 Ndị Kọrint 11:3; 15:28; Ndị Efesọs 6:1.

Ido onwe onye n’okpuru ndị na-edu ndú dị mkpa iji nwee obodo na-aga nke ọma, nke kwụsiri ike. N’otu aka ahụ, ido onwe onye n’okpuru onyeisi ezinụlọ dị oké mkpa iji mee ka e nwee ezinụlọ kwụsịrị ike, nke obi ụtọ na nke dị n’udo. Enweghị di ma ọ bụ nna n’ime ezinụlọ adịghị agbanwe eziokwu a. N’ezinụlọ ndị dị otú ahụ, nne na-aghọ onyeisi ezinụlọ. Mgbe ma nne ma nna na-anọghị, nwa mbụ ma ọ bụ onye ikwu ọzọ pụrụ ịrụ ọrụ dị ka onyeisi ezinụlọ. N’ọnọdụ nile, ndị òtù ezinụlọ na-erite uru mgbe ha na-akwanyere onye ahụ e nyere ikike ịbụ onyeisi ezinụlọ ùgwù kwesịrị ekwesị.

Ya mere, ihe dị mkpa abụghị ịjụ ụkpụrụ ịbụisi, kama, ịmụ otú e si abụ isi nakwa ile ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Pọl onyeozi na-agba Ndị Kraịst bụ́ di ume ịbụ isi n’ezinụlọ ha “dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ.” (Ndị Efesọs 5:21-23) N’ụzọ dị otú a, Pọl na-ezo ụzọ Kraịst si mesoo ọgbakọ ya aka dị ka ihe nlereanya nke ịbụisi zuru okè. Gịnị bụ ihe nlereanya nke Kraịst setịpụrụ?

Ọ bụ ezie na dị ka Mezaịa na Eze ọdịnihu, Jizọs nwetara ikike site n’aka Chineke n’onwe ya, nweekwa nnọọ ọgụgụ isi na ahụmahụ ná ndụ karịa ndị na-eso ụzọ ya, o nwere ịhụnanya na ọmịiko. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ dị aka ike, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụ onye na-adịghị ekwenyere ndị ọzọ, ma ọ bụ onye na-achọbiga ihe ókè n’aka ndị mmadụ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o mere ihe iji gosi na ya bụ onye dị ike, na-echetara onye ọ bụla mgbe nile na ya bụ Ọkpara Chineke. Jizọs dị umeala n’obi. Ya mere, ‘yok ya adịghị egbu mgbu, ibu ya dịkwa mfe.’ (Matiu 11:28-30) N’ihi ya, ọ bụ onye na-adị mfe njekwuru na onye nwere ezi uche. N’eziokwu, Pọl na-ekwu na Jizọs hụrụ ọgbakọ ahụ n’anya nke ukwuu nke na o ‘nyefere onwe ya maka ya.’—Ndị Efesọs 5:25.

Olee Otú Mmadụ Pụrụ Isi Ṅomie Ịbụisi Jizọs?

Olee otú ndị isi ezinụlọ pụrụ isi ṅomie àgwà Kraịst? Onyeisi ezinụlọ nke ji ihe akpọrọ ihe na-enwe nchegbu maka ọdịmma anụ ahụ́ nakwa nke ime mmụọ nke ezinụlọ ya. Ọ na-ewepụta onwe ya site n’itinye oge kwesịrị ekwesị n’ilebara mkpa ndị ezinụlọ ya n’otu n’otu nakwa n’ozuzu anya. Ọ na-ebute ọdịmma nke nwunye na ụmụ ya ụzọ karịa nke ya. * (1 Ndị Kọrint 10:24; Ndị Filipaị 2:4) Site n’itinye ụkpụrụ na ozizi Bible n’ọrụ ná ndụ ọ na-adị kwa ụbọchị, di ahụ ga-enweta nkwanye ùgwù na nkwado nke nwunye ya na ụmụ ya. Site n’iji ịhụnanya na-abụ isi, mgbalị ha jikọtara aka na-eme iji nagide nsogbu pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. Ya mere, site n’ịbụ isi ya n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro, di ahụ na-ewulite ezinụlọ obi ụtọ, nke na-enwe ihe ịga nke ọma ma na-ewetara Chineke otuto.

Onyeisi ezinụlọ nke maara ihe na-adịkwa umeala n’obi. Mgbe ọ dị mkpa, ọ na-adịrị ya mfe ịrịọ mgbaghara, ọ bụ ezie na ọ pụrụ isiri ya ike ikweta na ya mejọrọ ihe. Bible na-ekwu na nzọpụta dị “n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ.” (Ilu 24:6) Ee, ịdị umeala n’obi ga-akwali onyeisi ezinụlọ ịṅa nwunye na ụmụ ya ntị ma na-achọsi arọ ha ike mgbe ọ dị mkpa. Site n’iṅomi Jizọs, Onye Kraịst bụ́ onyeisi ezinụlọ ga-ahụrịrị na ịbụisi ya abụghị nanị na ọ ga-ewetara ezinụlọ ya obi ụtọ na nchebe, kama ọ ga-ewetakwara Jehova Chineke, bụ́ Onye ezinụlọ nile sitere n’aka ya, nsọpụrụ na otuto.—Ndị Efesọs 3:14, 15.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ bụ ezie na isiokwu a na-ekwu kpọmkwem banyere ọrụ dịịrị di na nna n’ime ezinụlọ, ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ na ụmụ mgbei ndị na-aghaghị ilekọta ụmụnne ha anya pụkwara irite uru n’ụkpụrụ ndị ahụ e nyere ndị isi ezinụlọ.

^ par. 14 Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara na-atụ aro ndị bara uru banyere otú a pụrụ isi jiri ịhụnanya na-elekọta ezinụlọ.

[Foto dị na peeji nke 22]

Di nke nwere ezi uche na-elebara aro nke nwunye na ụmụ ya anya