Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bịa n’Oge!

Bịa n’Oge!

 Bịa n’Oge!

“ỊBỊA n’azụ oge bụ nsogbu e ji mara ndị bụ́ ọga kpata kpata,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today na-akọ. “Ha na-abịa n’azụ oge ná nzukọ isii n’ime nzukọ 10 ọ bụla,” ka ọ na-agbakwụnye, na-ezo aka ná nnyocha e mere n’ebe ndị ọga kpata kpata dị 2,700 nọ.

N’ógbè achụmnta ego, a dịghị ele ịbịa n’azụ oge anya dị ka àgwà ọjọọ nanị. N’otu nnyocha e mere n’ebe mmadụ 81,000 tinyere akwụkwọ maka iwe ha n’ọrụ nọ, e kwubiri, sị: “Awa ndị na-efunụ n’ihi ịbịa n’azụ oge nakwa ịhapụ ọrụ n’anataghị ikike bụ isi ihe na-akpata mfu ego.” Otú ọ dị, ọ bụghị nanị n’ógbè achụmnta ego ka ịbịa n’azụ oge na-akpata nsogbu. Nnyocha e mere n’ebe ndị isi ụlọ akwụkwọ sekọndrị nọ, gosiri na “ụmụ akwụkwọ ịbịa akwụkwọ n’azụ oge bụ isi ihe na-akpatakarị inye ha ntaramahụhụ mgbe mgbe.”

Onye Okike anyị chọrọ ka anyị jiri oge kpọrọ ihe. O kere “ihe ukwu abụọ ahụ nke na-enye ìhè”—anyanwụ na ọnwa—iji nyere anyị aka ịgụ oge. (Jenesis 1:14-16) N’ụbọchị ndị a, elekere ọgbara ọhụrụ ndị e nwere na-eme ka anyị nwee ike ịgụ oge anyị na minit nakwa na sekọnd. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nkà na ụzụ, ọtụtụ n’ime anyị ka nwere nsogbu ịbịa n’oge—n’ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’àgbà ndị ọzọ dị mkpa.

Ihe na-akpata nsogbu ahụ ọ̀ bụ enwechaghị oge? N’eziokwu, oge a na-etinye n’ọrụ nakwa n’ezinụlọ pụrụ iri anyị ọnụ. Ka ọ sina dị, otu nne na-arụ ọrụ Bekee aha ya bụ Wanda Rosseland na-ekwu, sị: “Akwụsịrị m ime mkpesa banyere enweghị oge zuru ezu mgbe m chọpụtara na anyị nile nwechara awa 24 n’ụbọchị. Echewo m banyere ya ma kwubie na n’ụwa nke oge anyị a, ọ bụghị na anyị nwere oge dị nnọọ nta, kama anyị nwere nnọọ ọtụtụ ihe ndị na-egbochi anyị ọrụ nakwa ihe ndị na-adọpụ uche.”

Tụleekwa ihe banyere Renee, * nne nke ụmụ ise, onye bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ na-echeta, sị: “Mgbe ụmụ m dị obere, ịkwadebe ha maka ịga akwụkwọ na nzukọ Ndị Kraịst bụụrụ m ihe ịma aka. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị nsogbu m na-enwe n’ịbịa n’oge. Ma ugbu a ha nile mecharala okenye, azụlitewo m àgwà ọjọọ nke ịbịa n’azụ oge.” Gị onwe gị ì nwere àgwà ọjọọ a? Ọ bụrụ otú ahụ́, ọ pụrụ  ikwe gị omume ịgbanwe! Lee ụfọdụ ihe ndị ị pụrụ ime.

CHEE BANYERE IHE NDỊ Ọ PỤRỤ ỊKPATA. Àgwà nke ịbịa n’azụ oge mgbe mgbe pụrụ iyi obere ihe. Ma tụlee okwu Bible a: “Ijiji nwụrụ anwụ na-eme ka mmanụ onye na-asụgwa mmanụ otite nke na-esi ísì ụtọ sie ísì ọjọọ, reekwa ure: otú a ka nzuzu nta dị arọ karịa amamihe, karịakwa nsọpụrụ.” (Eklisiastis 10:1) Ee, nanị “nzuzu nta” n’ụdị nke echebaraghị ndị ọzọ echiche pụrụ imebi aha ọma gị n’ebe onye nkụzi ma ọ bụ onye were gị n’ọrụ nọ.

Mgbe ọ na-amụ otu ihe ọmụmụ na mahadum dị n’ógbè ya, otu nwanyị aha ya bụ Marie chọpụtara na ụfọdụ ụmụ klas ya “anaghị eji oge akpọrọ ihe,” ha na-abịakarị klas n’azụ oge. “Ma ọ dịghị anya tupu ha agbanwee,” ka ọ na-echeta. “Mmadụ abụọ n’ime ndị prọfesọ anyị na-eji nnọọ oge akpọrọ ihe. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ dị ụmụ akwụkwọ ndị ji minit ole na ole bịa n’azụ oge, ndị prọfesọ ahụ na-ede aha ha dị ka ndị na-abịaghị akwụkwọ. Ha na-akwatukwa ndị na-abịaghị akwụkwọ ọtụtụ ugboro n’ule.”

Ịbịakarị n’azụ oge pụkwara imebi aha ọma gị n’ebe ndị enyi na ndị ọgbọ gị nọ. Otu nwoke katatụrụ ahụ́ aha ya bụ Josef na-echeta banyere otu Onye Kraịst ibe ya ọ maara ọtụtụ iri afọ gara aga. Ọ bụ ezie na a na-akwanyere nwoke a ùgwù n’ihi nkà izi ihe o nwere dị ka onye ozizi, o nwere àgwà na-emechu ihu. “Ọ na-abịakarị n’azụ oge,” ka Josef na-echeta. “Ihe m na-ekwu bụ na ọ na-abịakarị n’azụ oge n’ihe nile! O yikwara ka ọ dịghị echegbu onwe ya banyere ya. Ndị mmadụ na-eji ịbịa n’azụ oge ya eme ihe ọchị.” Ndị mmadụ, hà amalitela ịrụ gị aka dị ka onye na-abịakarị n’azụ oge? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịdịrị ha mfe ileghara àgwà ọma ndị i nwere anya.

NA-ECHEBARA NDỊ ỌZỌ ECHICHE. Ịbịa n’azụ oge bụ àgwà ọjọọ, ọ na-adọpụkwa uche ndị ọzọ. Ọ pụkwara inye echiche na ị na-eche na ị ka ndị ọzọ elu. N’ịkọwa ihe kpatara ọtụtụ ndị ọga kpata kpata n’ógbè achụmnta ego ji abịakarị nzukọ n’azụ oge, otu onye ọchụ ntá ego kwuru, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị dị nnọọ mpako.” N’ụzọ dị iche na nke a, Ndị Kraịst na-emeso ndị ọzọ omume dị ka ndị ka ha onwe ha. (Ndị Filipaị 2:3) Ha na-ejikwa Ụkpụrụ Ọma ahụ eme ihe ma na-emeso ndị ọzọ omume otú ha ga-achọ ka a na-emeso ha. (Matiu 7:12) Ahụ́ ọ̀ naghị agbakasị gị mgbe ị na-echere ndị ọzọ? Ya mere, emela ihe ndị ọzọ ga-eji na-eche gị.

MỤTA NKÀ NKE ỊHAZI OGE NKE ỌMA. Ị̀ na-eyigharịkarị ihe ma na-agbagharịzi mgbe oge gachawarala? Ị̀ na-enye onwe gị ọrụ karịrị akarị, na-anwa ime ọtụtụ ihe n’oge dị nnọọ nta? Ụkpụrụ ahụ dị n’Eklisiastis 3:1 pụrụ inyere gị aka: “Ihe ọ bụla nwere oge.” Ihe ọ bụla inwe “oge” na-enye gị ohere ime ha n’ụzọ dị n’usoro.

Nke mbụ, depụtasịa ihe nile ọ dị mkpa ka i mee. Nke abụọ, gbasoo ụkpụrụ ahụ dị ná Ndị Filipaị 1:10: “Jide ihe ndị ka mkpa n’aka.” Ee,  na-ebute ihe ndị ka mkpa ụzọ. Olee ihe ndị ọ dị nnọọ mkpa ka e mee? Olee ihe ụfọdụ na-agaghị emebi ihe a pụrụ ime mgbe e mesiri? N’ikpeazụ, gbakọọ oge ọ ga-ewe gị iji mee ha na mgbe ị pụrụ ime ha. Jiri ezi uche na-eme ihe, ma na-ezere ime atụmatụ ime ọtụtụ ihe n’oge dị nnọọ nta.

Otu nwanyị aha ya bụ Dorothy kwuru na ọ bụ ndị mụrụ ya kụziiri ya iji oge eme ihe. Ọ na-akọ, sị: “Ọ bụrụ na anyị ga-anọ ná nzukọ Ndị Kraịst n’elekere 7:30 nke abalị, nne m na-amalite ịkwadebe anyị otu awa na minit 45 tupu oge ahụ eruo. Anyị na-enye oge maka iri nri abalị, ịsa efere, iyiri uwe, nakwa ịnyara ụgbọala gaa nzukọ. Ịbịa n’oge bịara mara anyị nnọọ ahụ́.” Mgbe ụfọdụ, ọ na-enye aka inye oge maka ihe ndị a na-atụghị anya ha. Dorothy na-echeta, sị: “Mgbe na-adịbeghị anya, m gawara iburu mmadụ ole na ole maka nzukọ. Ka m na-aga n’ụzọ, ụgbọala m dara afọ. Edozichara m ya ma g̣aruokwa n’oge iburu ha. Ana m ewepụtakarị oge maka nsogbu ụgbọala ma ọ bụ nsogbu agaghị ihu ma ọ bụ azụ nke ụgbọala.”

GWA NDỊ ỌZỌ KA HA TỤỌRỌ GỊ ARO. Bible na-ekwu n’Ilu 27:17, sị: “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.” N’ikwekọ n’ụkpụrụ ahụ, soro ndị ọzọ ọnọdụ ha yiri nke gị kwurịta okwu—bụ́ ndị na-ejisi ike abịa ihe n’oge. Mgbe mgbe, ha ga-enwe ọtụtụ aro ndị ga-abara gị uru.

Renee, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ya ná mmalite, kpebisiri ike ịgbanwe àgwà ịbịa n’azụ oge ya. Ọ na-ekwu, sị: “N’oge na-adịbeghị anya, ekpebiri m ime nke ọma karị. Ọ bụ ezie na ọ dịbereghị m mfe, ana m enwe ụfọdụ ihe ịga nke ọma.” Gị onwe gị pụkwara ime otú ahụ. Site n’inwe àgwà ziri ezi na ime mgbalị siri ike, ị pụrụ ịmụta ịdị na-abịa n’oge!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 A gbanwewo ụfọdụ aha ndị ahụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ịbịakarị n’azụ oge pụrụ inye gị aha ọjọọ n’ebe ndị were gị n’ọrụ nọ ma na-egosi na ị dịghị echebara ndị ọzọ echiche

[Foto dị na peeji nke 26]

Ịkpakọ onwe gị ọnụ nke ọma pụrụ inyere gị aka izere igbu oge