Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Buru Onye Okike Gị n’Uche”

“Buru Onye Okike Gị n’Uche”

 “Buru Onye Okike Gị n’Uche”

“Buru Onye Okike gị n’uche mgbe ị ka na-eto eto! N’afọ ndị na-abịanụ, nsogbu ga-akarị gị akarị, i wee kwuo, sị, ‘Ndụ adịghịzi m ụtọ.’”Eklisiastis 12:1, “Contemporary English Version.”

AKỤKỤ ihe odide ahụ nke sitere na Bible na-akpali nnọọ iche echiche. Ị gaghị abụ ntorobịa ugboro abụọ. E mesịa, ị ga-eleghachi anya azụ n’oge uto gị, ma ọ́ bụghị n’afọ ojuju na-enye ọṅụ ọ̀ bụrụ n’ịkwa ụta. Olee nke ọ ga-abụrụ gị? Ị̀ ga-esi aṅaa chịkwaa ihe ga-esi n’oge uto gị pụta?

“Buru Onye Okike gị n’uche,” ka Bible na-agba ume, dị ka e hotara n’elu. Ị̀ pụrụ isi aṅaa mee ya? Ọ bụ site n’ịgbaso iwu na ụkpụrụ Chineke, bụ́ ndị e depụtara n’Okwu ya, bụ́ Bible. Nke a apụtaghị na ị ga na-ebi ndụ nke ịnapụ onwe gị ihe ụtọ nile n’ihi ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè. N’ụzọ dị iche, iburu Onye Okike gị n’uche ga-eme ka i nwee obi ụtọ kasịnụ ruo ókè o kwere mee. Olee otú nke ahụ pụrụ isi bụrụ eziokwu?

Iji maa atụ, were ya na e bunyere gị ụgbọala ma nye gị laịsensị ịkwọ ụgbọala. I nwetala nnwere onwe ọhụrụ na-akpali akpali, bụ́ nke pụrụ inye gị obi ụtọ dị ukwuu. Chegodị nnọọ ebe ndị ị pụrụ ịgagasị! Otú ọ dị, ibu ọrụ dị mkpa so nnwere onwe ọhụrụ gị aga. Ka ị na-akwọ ụgbọala, ị ghaghị irube isi n’iwu ndị na-achịkwa okporo ụzọ ma na-elezi anya n’ihe àmà okporo ụzọ, n’ókè ị ga-agbadebe ọsọ, nakwa n’ihe àmà ịdọ aka ná ntị. Ibu ọrụ a ọ̀ na-eme ka ị ghara inwe ọṅụ n’ịkwọ ụgbọala? Ọ dịghị ma ọlị! N’ezie, ọ bụụrụ gị ihe nchebe. Inwe ihe mberede okporo ụzọ adịghị enye ọṅụ n’ezie, ka ọ̀ na-enye?

Otú ahụ ka ọ dị n’ihe banyere nnwere onwe Onye Okike gị, bụ́ Jehova Chineke, nyeworo gị. Ka ị na-etolite ịghọ okenye, ọ na-ekwe ka ị họrọ ụzọ ị ga-esi jiri ndụ gị mee ihe. (Deuterọnọmi 30:19; Ilu 27:11) Lee ihe ùgwù magburu onwe ya nke ahụ bụ! Ma ibu ọrụ dị ukwuu so nnwere onwe ahụ aga. N’Okwu ya, Jehova esetịpụwo ‘iwu ndị na-achịkwa okporo ụzọ’—ụkpụrụ ndị ọ chọrọ ka ị gbasoo. Ụkpụrụ ndị a hà na-egbochi gị inwe obi ụtọ? Mbanụ! Kama nke ahụ, ha na-echebe gị pụọ n’obi mgbawa na ihe mgbu ndị na-akpa ọtụtụ ndị ntorobịa ezé taa.

 Federico, bụ́ onye nọ ugbu a ná mmalite afọ ndị nke 30 ya, maara na nke ahụ bụ eziokwu. Mgbe ọ ka na-eto eto, ọ hụrụ ka ụmụ akwụkwọ ibe ya na-etinye aka n’ọtụtụ ihe omume ndị ọ maara na ya kwesịrị izere. “Ọ na-eyi ka hà na-ekpori ndụ,” ka ọ na-ekwu, “ma ọ dịghị mgbe ọ dị m ka hà na-enwe ezigbo obi ụtọ.” N’ileghachi anya azụ, obi dị Federico ụtọ na ụkpụrụ Bible duziri ya n’oge uto ya. “N’ezie, dị ka onye ọ bụla ọzọ na-eto eto, m nwere nsogbu ndị mụ na ha nọ na-alụ,” ka ọ na-ekwu. “Ma Bible chebere m n’ezie. Onye Kraịst ibe m na-anọkwa ya mgbe nile inyere m aka. Ịgbaso ụkpụrụ Bible enyewo m obi ụtọ karịrị ihe m pụrụ ichetụwo n’echiche!”

Jehova Chineke chọrọ ka i nwee obi ụtọ—ezigbo obi ụtọ. Nke ahụ na-agụnye ihe karịrị ọchị ezé nkịtị bụ́ nke a na-eji nnọọ amachi ụwa jọọjị. Bible na-ekwu, sị: “Nụ ụtọ oge ntorobịa gị. Nwee obi ụtọ mgbe ị ka na-eto eto.” Ma otu amaokwu Bible ahụ na-agbakwụnye okwu ịdọ aka ná ntị. “Cheta,” ka ọ na-ekwu, “na Chineke gaje ikpe gị ikpe maka ihe ọ bụla ị na-eme.”—Eklisiastis 11:9, Today’s English Version.

Buru Onye Okike gị n’uche site n’iji nnwere onwe o nyere gị na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị pụrụ ijide n’aka na Onye Okike gị ga-eburu gị n’uche nakwa na ọ ga-eme ka i nweta obi ụtọ kasịnụ. Bible na-ekwu, sị: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—Ilu 10:22.

Iji nyere ndị na-eto eto aka ịnagide ọnwụnwa nke oge uto, Ndịàmà Jehova ebipụtawo akwụkwọ dị peeji 320 nke aha ya bụ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ . . . Azịza Ndị Na-adị Irè. Ka ọ dị ugbu a, e bipụtawo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde 34 nke akwụkwọ a n’asụsụ 77. Ị pụrụ inweta otu site n’ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị.

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Iji Nyere Gị Aka Inwe Ihe Ịga nke Ọma Dị Ka Onye Nọ n’Oge Uto

Na-ewepụta oge ịgụ Okwu Chineke

Na-adị uchu n’ozi

Zere mkpakọrịta ọjọọ

Soro ndị mụrụ gị na-enwe nkwurịta okwu n’ụzọ chiri anya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mkpo broshuọ: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.