Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere M Ji Kwere na Bible—Onye Ọkà Mmụta Sayensị Na-amụ Banyere Atọm Akọọ Banyere Onwe Ya

Ihe Mere M Ji Kwere na Bible—Onye Ọkà Mmụta Sayensị Na-amụ Banyere Atọm Akọọ Banyere Onwe Ya

 Ihe Mere M Ji Kwere na Bible—Onye Ọkà Mmụta Sayensị Na-amụ Banyere Atọm Akọọ Banyere Onwe Ya

DỊ KA ALTON WILLIAMS SI KỌỌ

N’AFỌ 1978, ihe abụọ dị ịrịba ama mere ná ndụ m. Na September, enwetara m akara ugo mmụta dị ka ọkà n’ihe ọmụmụ physics metụtara atọm, na December kwa, aghọrọ m onye ozi a họpụtara ahọpụta nke Ndịàmà Jehova.

Mgbe ndị mmadụ matara na m bụ onye ọkà mmụta sayensị, bụrụkwa Onyeàmà, ọ na-ejukarị ha anya otú m si mee ka ihe ọmụma sayensị m nwere kwekọọ n’ihe ndị m kweere na Bible. N’eziokwu, ruo ọtụtụ afọ, mụ onwe m nọkwa na-eche ma ihe ọmụma sayensị na nkwenkwe Bible hà pụrụ inwe nkwekọ. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, abịara m kwenyesie ike na Bible na eziokwu sayensị nwere nkwekọ. Olee otú m si ruo ná nkwubi okwu ahụ? Biko kwe ka m buru ụzọ kọọ otú m si ghọọ onye ọkà mmụta sayensị.

Ihe Ọmụmụ nke Were Afọ 19

A mụrụ m n’afọ 1953 na Jackson, Mississippi, U.S.A., abụ m nwa nke atọ n’ime ụmụ 11. Ezinụlọ anyị dara ogbenye. Anyị na-akwagharịkarị site n’otu ụlọ gaa n’ọzọ n’ihi na nne na nna m apụghị ịkwụ ụgwọ ụlọ. Anyị nwetara ihe ka ukwuu n’ihe oriri anyị site n’usoro onyinye ihe oriri gọọmenti, ọ bụkwa ndị nne m na-ehichara ebe obibi na ọfịs ha na-achịnye anyị uwe ndị e yitụworo eyi bụ́ ndị anyị na-eyi.

Nne na nna m na-echetarakarị anyị bụ́ ụmụaka na nanị ụzọ anyị pụrụ isi nwere onwe anyị pụọ n’ogbenye bụ site n’ịgụ akwụkwọ ma gụta ya nke ọma. N’ihi ya, malite n’oge m dị obere, esetịpụrụ m inweta akara ugo mmụta mahadum dị ka ihe mgbaru ọsọ m. Amalitere m ịga akwụkwọ mgbe m dị afọ isii, agagidekwara m akwụkwọ n’akwụsịghị akwụsị ruo afọ 19 sochirinụ. Enwere m mmasị n’ihe ọmụmụ sayensị

 nakwa ná mgbakọ na mwepụ, n’ihi ya, ozugbo m banyere mahadum, amalitere m ịmụ ihe ọmụmụ ga-eme ka m ghọọ ọkà mmụta sayensị.

Mgbe m nọ na mahadum, ezutere m otu nwa agbọghọ aha ya bụ Del. Ọ bụ otu prọfesọ sayensị gwara Del ka ọ gakwuru m iji nweta enyemaka ụfọdụ n’ihe ọmụmụ sayensị ọ nọ na-enwe. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, mkparịta ụka anyị gafere nke sayensị, anyị bịakwara hụ onwe anyị n’anya. Anyị lụrụ na January 10, 1974—mgbe e nwere nkwụsịtụ were awa abụọ tupu a malite ihe ọmụmụ nke ọzọ! Afọ anọ mgbe nke ahụ gasịrị, na 1978, emesịrị m nweta akara ugo mmụta doctorate.

Enwetawo m ihe m chere bụ mkpịsị ugodi na-eduga n’inwe ihe ịga nke ọma. Abụ m onye ọkà mmụta sayensị—ga-abụ abụ bụrụ ọkà n’ihe ọmụmụ physics metụtara atọm! Ebe ọ bụ na m kpa akara ugo mmụta m nwetara ọhụrụ n’ihe ọmụmụ physics metụtara atọm n’aka, apụziri m ịmalite ịghọrọ mkpụrụ nke ogologo oge m ji gụọ akwụkwọ. Achọsiri m ike imere onwe m aha ma a bịa n’ógbè sayensị. Tụkwasị na nke ahụ, apụziri m ịhọrọ ọrụ site n’ọtụtụ ọrụ a na-akwụ ezigbo ego na ha bụ́ ndị ụlọ ọrụ dị iche iche nke ndị nkịtị nwe nakwa ndị nke gọọmenti na-achọ inye m.

Otú ọ dị, mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, na December 30, 1978, eweere m nzọụkwụ nke bịara nwee ọbụna mmetụta ka ukwuu ná ndụ m nakwa n’ọdịnihu m karịa ka akara ugo mmụta m nwetara ọhụrụ nwere. N’ụbọchị ahụ, araara m ndụ m nye Jehova Chineke site na baptizim ime mmiri ma si otú ahụ ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Olee otú m si weere nzọụkwụ ahụ?

Otu Akwụkwọ Kpaliri Mmasị M

Ná ngwụsị afọ 1977, mgbe m na-aga akwụkwọ na Mahadum Massachusetts nke dị n’Amherst, Ndịàmà abụọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ nke ebe obibi m. Anọghị m ya, ma nwunye m na ụmụ anyị, otu nke dị afọ atọ na nke a mụrụ ọhụrụ, nọ n’ụlọ. Del nabatara Ndịàmà ahụ. Mgbe ha nwesịrị mkparịta ụka tọrọ ụtọ, o kwetara ka Ndịàmà ahụ na-abịa eleta ya otu ugbo n’izu iji na-eduziri ya ọmụmụ Bible.

Mgbe nwunye m gwara m banyere ndokwa a, emegidere m ya ozugbo. Egbochighị m ya ikpe okpukpe ọ bụla ọ chọrọ ikpe—ma ọ bụnụghị Ndịàmà Jehova! N’eziokwu, amachaghị m banyere Ndịàmà, ma enwere m echiche a dị mbụ kụnye n’ime m na ha bụ òtù gbapụrụ iche nke na-eji Bible eduhie ndị mmadụ. Ya mere, iji mee ka nwunye m nwere onwe ya pụọ n’ihe m weere dị ka njichi nke Ndịàmà jichiri ya, abịara m chee na m ga-eji ihe ọmụma sayensị m nwere gbaghaa ozizi ha.

Otu izu, akwụsịtụrụ m nnyocha m nọ na-eme na mahadum ma laa ụlọ iji nọrọ ya mgbe nwunye m ga-enwe ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, erutere m ụlọ n’azụ oge otú m na-ebughị n’uche, nwanyị nke na-eduzi ọmụmụ Bible ahụ nọ na-achọzi ịla. O nyere m otu akwụkwọ aha ya bụ Did Man Get Here by Evolution or by Creation? * Ọzọkwa, ọ gwara nwunye m na n’oge ọmụmụ Bible ọzọ ha ga-enwe n’izu na-abịanụ, ha ga-atụle otu amụma Bible nke na-egosi na 1914 bụ afọ dị ịrịba ama. Nke ahụ bụ kpọmkwem ohere m nọ na-achọ! Agwara m Onyeàmà ahụ na m ga-anọ n’ụlọ maka nkwurịta okwu Bible ọzọ ha ga-enwe. Achọrọ m ịchọpụta izi ezi nke mgbakọ na mwepụ ndị ọ ga-eme mgbe ọ ga-atụle banyere afọ 1914.

N’abalị ụbọchị ahụ, amalitere m ịgụ akwụkwọ ahụ Onyeàmà ahụ nyere m. N’ikwu eziokwu, ihe akwụkwọ ahụ na-ekwu masịrị m. E dere ya n’ụzọ ezi uche dị na ya, o nwekwara  ọtụtụ ebe e zoro aka n’ihe ọmụma sayensị banyere evolushọn. N’ụzọ tụrụ m n’anya, achọpụtara m na Bible nwere ihe ọmụma ziri ezi banyere okike karịa ka m cheburu. Agụsịrị m akwụkwọ ahụ n’ime ụbọchị ole na ole ma kweta na ihe Bible na-ekwu n’ezie banyere okike adịghị emegide eziokwu sayensị ndị a ma ama banyere ndụ n’elu ala.

Ekpebisiri M Ike Ịchọpụta Ebe Ndị A Na-enweghị Nkwekọ

Ka o sina dị, m ka na-enwe obi abụọ banyere ozizi nke Ndịàmà, anọkwa m na-atụ anya ịtụle mgbakọ na mwepụ ndị metụtara amụma Bible banyere afọ 1914. Echere m na nke a ga-emenyerịrị Onyeàmà ahụ ụjọ, ma eleghịkwa anya, nyere nwunye m aka ịhụ ebe ozizi Ndịàmà hiere ụzọ.

N’izu sochirinụ, Onyeàmà ahụ na otu nwoke nke bụ́ otu n’ime ndị okenye nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ sooro bịa. Onye okenye ahụ duziri ọmụmụ Bible ahụ. Ọ tụlere amụma ndị dị n’isi nke 4 na isi nke 9 n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel, banyere mpụta nke Jizọs dị ka Mezaịa na Eze. Ekpebisiri m ike ịchọpụta ebe mgbakọ na mwepụ ndị o mere na-enweghị nkwekọ, ma ọ dịghị nke m hụrụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, ezi uche nke dị n’ihe ọmụma ndị dị na Bible masịrị m ọzọ.

Ruo mgbe ahụ, echere m na inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ dabeere nnọọ ná mkpali karịa ka ọ na-adabere n’ihe mgbakwasị ụkwụ. Adara m ya nnọọ! Ekelere m Ndịàmà ahụ maka nkwurịta okwu ahụ na-enye ihe ọmụma ma kwuo na ọ ga-amasị m ịnọgide na-ekere òkè n’ọmụmụ ihe ahụ ha na-enwe kwa izu. Ya mere, site mgbe ahụ gaa n’ihu, anọgidere m na-aga akwụkwọ na mahadum, mụ na nwunye m nọgidekwara na-eso Ndịàmà amụ Bible. Ọzọkwa, mụ na nwunye m malitere ịga nzukọ Ndịàmà bụ́ ndị ha na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

N’ime ọnwa ole na ole, amụtara m ọtụtụ eziokwu ọhụrụ sitere na Bible, n’oge na-adịghịkwa anya, abịara m ruo eru isonyere Ndịàmà n’ozi ụlọ n’ụlọ. Emere m nke a n’agbanyeghị na m nọ ná ngwụsị nke oge m ga-enweta akara ugo mmụta doctorate m na mahadum, bụ́ nke na-eri m oge dị ukwuu. Agụsịrị m akwụkwọ n’afọ 1978 ma kwaga na steeti Alabama, bụ́ ebe m malitere ịkụzi ihe ọmụmụ physics na mahadum Alabama A. & M. University nke dị na Huntsville. Anyị kpọtụụrụ Ndịàmà nọ n’ógbè ọhụrụ anyị, otu onye okenye na nwunye ya gakwara n’ihu n’ịmụrụ anyị Bible. Ọnwa ole na ole mgbe e mesịrị, e mere mụ na nwunye m baptizim, n’ime otu ụbọchị.

Ịrụsi Ọrụ Ike Dị Ka Onye Ọkà Mmụta Sayensị na Onye Ozi

Nye m, ọbụbụ m bụ onye ọkà mmụta sayensị nakwa Onyeàmà Jehova abụwo nke nwere nkwekọ. N’afọ 1983, amalitere m ịrụ ọrụ dị ka ọkà n’ihe ọmụmụ physics metụtara mbara igwe ná ngalaba George C. Marshall Space Flight Center nke NASA (Ụlọ Ọrụ Mba nke Na-ahụ Maka Mbara Igwe Nakwa Ịrụpụta Ụgbọelu), bụ́ nke dịkwa na Huntsville. * Arụrụ m ọrụ ma ná ngalaba na-eme nnwale ma ná ngalaba na-enye ihe ọmụma banyere ígwè  ọrụ teliskop e ji enyocha X-ray. (N’afọ 1999, e ji ụgbọ mbara igwe bụ́ Columbia buga teliskop ahụ—Chandra X-ray Observatory—na mbara igwe n’ụzọ gara nke ọma.) Anụrụ m ụtọ ọrụ ahụ, bụ́ nke gụnyere ịtụle X-ray ndị kpakpando na ụyọkọ kpakpando dị iche iche na-ewepụta ná mgbalị iji mata mbara igwe nke ọma karị.

Ana m anụ ụtọ ọrụ m okpukpu abụọ n’ihi na ọ bụghị nanị na ọrụ sayensị m na-arụ bụ nke tara akpụ ma na-akpali mmasị, kamakwa ana m aghọtakwu ike na amamihe nke Onye Okike. N’eziokwu, abịara m ghọta okwu Jehova kwuru site n’ọnụ onye amụma oge ochie bụ́ Aịzaịa n’ụzọ pụrụ iche. Onye Okike na-ekwu, sị: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a? ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.” (Aịsaịa 40:26) Ka m ‘na-ewelikwu anya elu’ iji hụperetụ ịsa mbara, ịdị mgbagwoju anya, na ịma mma nke mbara igwe, otú ahụ ka m na-ejikwu aka ọrụ nke Onye nwere ọgụgụ isi nke mere ha ma guzobe iwu ndị na-eme ka ha na-arụkọ ọrụ, akpọrọ oké ihe.

N’oge ahụ, eji m nnọọ ọrụ n’aka n’ide, n’akwụkwọ sayensị dị iche iche, ihe ọmụma ndị ọhụrụ dabeere ná nnyocha ndị m mere n’ihe ọmụmụ physics metụtara X-ray nke mbara igwe. Otú ọ dị, anọkwa m na-ekerechi òkè anya n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ejere m ozi dị ka onye okenye, tinyekwa awa 20 kwa ọnwa n’ọrụ nkwusa ihu ọha. Ka ọ dịgodị, nwunye m rụrụ ọrụ ịkụzi Bible n’oge nile.

Mgbe m rụsịrị ọrụ na NASA ruo ihe dị ka afọ anọ, abịara m na-enwewanye mkpa nke iwepụtakwu oge m iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu ndị dị ebube dị na Bible. Ma olee otú m pụrụ isi mee nke ahụ? Mgbe m so nwunye m kwurịtasịa ọchịchọ m ma wegasịara Jehova okwu ahụ n’ekpere, ọ bịara doo m anya na aghaghị m ime mkpebi ụfọdụ dị mkpa.

Mkpebi Ndị Dị Mkpa

Agakwuuru m onyeisi ọrụ m na NASA ma gwa ya na m chọrọ ịgbanwe oge ndị m na-arụ ọrụ n’izu site n’ụbọchị ise gaa n’ụbọchị anọ. N’ezie, aga m ekwe ma e belata ụgwọ ọnwa m. A kọwaara m onyeisi ọrụ m na achọrọ m iji ụbọchị atọ ndị ọzọ fọrọ n’izu jee ozi m. Onyeisi ọrụ m kwere, n’agbanyeghị na ọ dịtụbeghị onye ọkà mmụta sayensị ọ bụla nọ na NASA mere otú ahụ mbụ. Otú ọ dị, ọ gwara m na ọ ga-adị mkpa ka m soro onyeisi ọrụ ya kwurịta ya. Emere m otú ahụ, ọ tụkwara m n’anya n’ụzọ tọrọ m ụtọ mgbe onyeisi ọrụ ahụ nke nọ n’ọkwá ka elu nabatakwara ihe m rịọrọ. Ya mere, na September 1987, amalitere m ọrụ m dị ka onye ozi oge nile, na-etinye ihe dị ka awa 90 n’ọnwa n’ikwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke ozi ahụ.

Mgbe e mesịrị, otu onye ntụzi ọrụ na mahadum Alabama A. & M. University nke dị na Huntsville kpọrọ m na fon. O nyere m ọrụ nkụzi ná ngalaba physics. Azaghachiri m na m ga-anakwere ọrụ ahụ nanị ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka m nwee ike ịdị na-etinye ihe ka ukwuu n’oge m n’ozi m. Otú ọ dị, emesiri m ya obi ike na ozi m agaghị eme ka ihe m ga na-akụzi ghara ịbụ ịgba. Onye ntụzi ọrụ ahụ kwetara. Taa, m ka na-akụzi na mahadum ahụ ma na-eje ozi dị ka onye ozi oge nile. Ọbụna enwere m ohere ịmụ asụsụ Spanish. Ka ọ dị ugbu a, mụ na nwunye m na-eje ozi n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Huntsville nke na-eji asụsụ Spanish eme ihe.

Sayensị na Okwukwe

N’ọtụtụ afọ ndị m tinyeworo n’ime nnyocha sayensị, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla m hụrụ ebe sayensị a nwapụtara anwapụta na ozizi Bible na-enweghị nkwekọ. Mgbe mgbe, ihe na-akpata  ihe ndị na-eyi ka hà bụ enweghị nkwekọ bụ enweghị ihe ọmụma—ma ọ́ bụghị banyere ihe sayensị kụziri, ọ bụrụ banyere ihe Bible kwuru n’ezie. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na ndị ọzọ na-eche n’ụzọ hiere ụzọ na Bible na-akụzi na ahịhịa, ụmụ anụmanụ, na ụmụ mmadụ pụtara n’ụwa n’ime ụbọchị isi nkịtị nwegasịrị awa 24. Nke a ga-emegide eziokwu sayensị ndị a ma ama. Ma Bible adịghị akụzi nke ahụ. Kama nke ahụ, ọ na-ekpughe na “ụbọchị” okike ndị ahụ ruru ọtụtụ puku afọ. *

Ihe ọzọ na-akpata ihe mgbagwoju anya bụ echiche ahụ hiere ụzọ nke bụ́ na inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ bụ nanị ihe a na-eme ná mkpali. N’ụzọ dị nnọọ iche, okwukwe n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe Bible dị na-adabere n’ihe ndị bụ́ eziokwu bụ́ ndị a pụrụ ịnwapụta anwapụta. Dị ka a kọwara ya n’ime Bible, “okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka nke ihe ndị a na-ele anya ha, ngosipụta pụtara ìhè nke ihe ndị bụ ezie n’agbanyeghị na a dịghị ahụ ha anya.” (Ndị Hibru 11:1) Ee, okwukwe dabeere n’ihe pụtara ìhè. E mezuwo ọtụtụ narị amụma n’oge gara aga nakwa n’oge anyị. Ya mere, ọ bụrụgodị na anyị ejiri usoro nkà mmụta sayensị, bụ́ nke ndị ọkà mmụta sayensị nile na-eji anwapụta echiche nkà mmụta sayensị mee ihe, anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu ná mmezu nke amụma Bible ndị metụtara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

Otu n’ime amụma ndị dị otú ahụ na-agụnye nkwa e kwere na anyị ga-enwe ike ịnụ ụtọ ọnọdụ Paradaịs n’elu ala n’ọdịnihu dị nso. Mmetụta na-ebibi ihe nke ịka nká, ọrịa, ọnwụ, agha, na ikpe na-ezighị ezi agaghị adị ọzọ. (Mkpughe 21:3, 4) Mgbe ahụ, anyị ga-enwe oge inyocha na ịmụ n’ụzọ zuru ezu banyere ihe ndị dị ebube Jehova Chineke kere nakwa ọtụtụ iwu ndị o guzobere iji chịkwaa eluigwe na ala a dị ịtụnanya.

Enwere m obi ụtọ n’ebe Jehova Chineke nọ maka inyere m aka ịchọta mkpịsị ugodi nke na-eduga n’obi ụtọ—eziokwu ndị dị ebube dị n’Okwu ya, bụ́ Bible. Ekpere m bụ ka ọtụtụ ndị ọzọ, gụnyere ndị ọkà mmụta sayensị, chọta mkpịsị ugodi ahụ dị oké ọnụ ahịa.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.

^ par. 23 NASA bụ ụlọ ọrụ gọọmenti mba United States bụ́ nke nọpụụrụ nnọọ onwe ya iche n’ebe ụlọ ọrụ gọọmenti ndị ọzọ dị.

^ par. 31 Lee isi nke 6, bụ́ “An Ancient Creation Record—Can You Trust It?” (Ihe Ndekọ Oge Ochie Banyere Okike—Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Ya Obi), n’akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]

Echere m na inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ dabeere nnọọ ná mkpali karịa ka ọ na-adabere n’ihe mgbakwasị ụkwụ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]

Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla m hụrụ ebe sayensị a nwapụtara anwapụta na ozizi Bible na-enweghị nkwekọ

[Foto dị na peeji nke 19]

Ana m akwado ezinụlọ m site n’ịkụzi ihe oge ụfọdụ

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ka Chandra X-ray Observatory nke NASA nọ n’ụzọ ya nakwa ụzarị X-ray nke kpakpando abụọ jikọrọ ọnụ nke otu n’ime ha bụ kpakpando nwere oghere ojii

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

NASA Photo

NASA/CfA/J. McClintock et al.

[Foto dị na peeji nke 21]

Mụ na nwunye m na-anụ ụtọ ozi oge nile