Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Aha Chineke Gbanwere Ndụ M!

Aha Chineke Gbanwere Ndụ M!

Aha Chineke Gbanwere Ndụ M!

DỊ KA SANDY YAZZIE TSOSIE SI KỌỌ

MỤ NA ụmụnne m ndị inyom nọ n’okpuru àkwà na-agbalị izo, na-achị ọchị ma na-akụ ibe anyị aka mgbe ndị Mormon kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị. * Mgbe m mesịrị meghee ụzọ, eji m ọnụ ọjọọ gwa ha na anyị bụ ndị Navajo ji ọdịnala kpọrọ ihe nakwa na anyị achọghị ka ha gwa anyị okwu banyere okpukpe ndị ọcha ọ bụla.

Nne na nna anyị gara ahịa ịzụta ihe ndị dị anyị mkpa. Ha ga-alọta mgbe anyanwụ dara. Mgbe ha lọtara, ha nụrụ na m mesoro ndị Mormon n’ụzọ na-adịghị mma. Ha dụsiri m ọdụ ike ịghara imeso onye ọ bụla n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù ọzọ ma ọlị. A kụziiri anyị imeso ndị mmadụ n’ụzọ nkwanye ùgwù na obiọma. Echetara m mgbe otu onye ọbịa anyị na-atụghị anya ya bịara na nke anyị otu ụbọchị. Nne na nna m siri ihe n’èzí. Ha ji ụzọ ile ọbịa kpọọ onye ọbịa ahụ ka o buru ụzọ rie, mgbe o risịrị, anyị riziri nke anyị.

Ndụ n’Ala Ọha

Anyị biri na Howell Mesa, Arizona, nke dị kilomita 15 site n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Ala Ọha ndị Hopi India, bụ́ nke dị anya site n’obodo ukwu nakwa n’obodo ndị ụmụ mmadụ bijupụtara. Nke a dị n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ United States, bụ́ ebe e nwere ọdịdị ọzara dị ịrịba ama, nke ikpo nkume uhie dị ịtụnanya dịgasị na ya. E nwere ọtụtụ ugwu ndị dị elu bụ́ ndị elu ha dị larịị. Anyị pụrụ ịnọ na ha na-ekiri ka atụrụ anyị na-ata nri n’ebe dị kilomita asatọ site n’ebe ahụ. Lee mmasị m nwere n’ịdị jụụ nke mba a, ala nna m!

N’oge m na-aga kọleji, mụ na ụmụ nwanne mama m bụ́ ndị na-akwado Òtù Ndị American Indian (AIM) malitere ịkpachi nnọọ anya. * Obi dị m nnọọ ụtọ ịbụ onye American Indian, m na-agwakwa ndị ọcha uche m banyere ọtụtụ iri afọ nke mmegbu, bụ́ nke m kweere na ọ bụ Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Banyere Ihe Omume Ndị India (BIA) kpatara. Egosipụtaghị m ịkpọasị m dị ka ụmụ nwanne mama m mere. Eburu m ya n’obi. Nke ahụ mere ka m kpọọ onye ọ bụla nwere Bible asị.

Echere m na ọ bụ Bible mere ka ndị ọcha nwee ikike iwere ala anyị na ihe ndị ruuru anyị nakwa ịnapụ anyị nnwere onwe anyị ime ememe nsọ nke anyị! Ọbụna eji m ụzọ wayo jiri akara nna m na-eji abịanye aka n’akwụkwọ mee ihe iji zere ikere òkè n’ememe okpukpe ndị Protestant na ndị Katọlik n’oge a manyere anyị ịga chọọchị mgbe m bi n’ụlọ akwụkwọ. E zubere ka ụlọ akwụkwọ ndị ahụ mee ka anyị gbasowazie omenala ndị ọcha ma chefuzie na anyị bụ ndị India. E kweghịdị ka anyị na-asụ asụsụ anyị!

Anyị nwere nkwanye ùgwù dị ukwuu maka okike na gburugburu ebe anyị nọ na ya. Kwa ụtụtụ, anyị na-eche ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ, kpee ekpere, ma nye ekele site n’ịwụsa ifuru ọka dị nsọ n’ala. * Nke a bụ ọzụzụ e nyere m n’ife ofufe n’ụzọ nke ndị Navajo, ejikwa m obi m nile nakwere ya n’obi ụtọ. Echiche Krisendọm nke ịga eluigwe amasịghị m, ekweghịkwa m ná mmekpa ahụ n’ime hel na-ere ọkụ. Obi m digidere n’ibi n’elu ala.

N’oge ezumike ụlọ akwụkwọ, ana m anọnyere ndị ezinụlọ m. Ikpocha hogan—ụdị ụlọ ndị Navajo nke anyị bi na ya—ịkpa ákwà, na ilekọta atụrụ bụ ọrụ m na-arụ kwa ụbọchị. Anyị bụ́ ndị Navajo abụwo ndị ọzụzụ atụrụ ruo ọtụtụ narị afọ. Mgbe ọ bụla m na-ekpocha hogan anyị (lee foto ya n’okpuru), ana m ahụ otu obere akwụkwọ uhie nke nwere akwụkwọ Bible bụ́ Abụ Ọma nakwa ọtụtụ akwụkwọ nke “Agba Ọhụrụ.” M na-agba ya ụkwụ site n’ebe a gaa n’ebe a, n’echetụghị echiche ma ọlị banyere ihe ndị dị na ya na ihe ha pụtara. Ma atụfughị m ya.

Ịlụ Di—Nghọgbu na Nkụda Mmụọ

Mgbe m gụsịrị akwụkwọ na kọleji, emere m atụmatụ ịgụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a na-amụ aka ọrụ dị na Albuquerque, New Mexico. Otú ọ dị, tupu m gawa ezutere m onye mesịrị ghọọ di m. Alọghachitere m n’ala ọha ndị Navajo ahụ, bụ́ nke anyị na-akpọ Rez, iji lụọ di. Nne na nna m alụwo di na nwunye ruo ọtụtụ afọ. Achọrọ m ịgbaso nzọụkwụ ha, ya mere alụrụ m di. Ọ masịrị m ịbụ onye na-edozi ụlọ, ụdị ndụ anyị na-ebi n’ụlọ tọkwara m ụtọ, karịsịa mgbe a mụrụ nwa anyị nwoke bụ́ Lionel. Mụ na di m nwere nnọọ obi ụtọ—ruo otu ụbọchị mgbe m nụrụ akụkọ na-agbawa obi!

Di m nwere iko nwanyị! Omume ekwesịghị ntụkwasị obi ya tisara alụmdi na nwunye anyị. Enwere m oké nsogbu mmetụta uche ma bịa kpọọ ya nnọọ asị. Achọrọ m imegwara! Ma n’oge anyị nọ n’ọgụ ịgba alụkwaghịm maka nwa anyị nwoke nakwa maka nkwado ego, amalitere m inwe mwute, na-enwe mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe na onye na-enweghị olileanya. Ana m agba ọsọ ruo ọtụtụ kilomita iji mee ka iru újú m belata. Ọ dịghị ara ahụ mụ ebewa ákwá, agụụ adịghịzi agụ m. Ọ dị m nnọọ ka ụwa ọ̀ gbaarala m ọsọ.

Oge ụfọdụ mgbe e mesịrị, enwetara m otu enyi nwoke nke nwere nsogbu alụmdi na nwunye yiri nke m. Anyị abụọ nọcha ná mwute. O nwere mmetụta n’ebe m nọ ma nye m nkwado mmetụta uche bụ́ nke dị m mkpa. Agwara m ya ihe nile dị m n’uche na mmetụta ndị m na-enwe banyere ndụ. O gere m ntị, bụ́ nke gosiri m na ihe banyere m na-emetụ ya. Anyị mere atụmatụ ịlụ di na nwunye.

Mgbe ahụ, achọpụtara m na ya onwe ya kwa ekwesịghị ntụkwasị obi! N’agbanyeghị na o siiri m ike ma wute m nke ukwuu, akwụsịrị m mmekọrịta ahụ. Enwere m mmetụta nke ịbụ onye a jụrụ ajụ, daakwa mbà n’obi nke ukwuu. Amalitere m inwe obi ilu nke ukwuu, na-achọ imegwara, na-achọkwa igbu onwe m. Agbalịrị m ugboro abụọ igbu onwe m. Achọrọ m nnọọ ịnwụ.

Mgbe Mbụ M Matara Banyere Otu Ezi Chineke

Anya mmiri na-agba m ọtụtụ ugboro ka m na-ekpegara Chineke m na-amaghị ekpere. Ma, ekwetụrụ m na e nwere Onye Kachasị Elu nke kere eluigwe na ala nke dị ebube. Ọdịda nke anyanwụ mara mma na-akpali mmasị m, atụgharịkwara m uche n’otú Onye ahụ na-aghaghị isi bụrụ onye dị ebube iji kwe ka anyị nụ ụtọ ihe ndị a dị ebube. Abịara m hụ onye ahụ n’anya bụ́ onye m na-amaghị. Amalitere m ịgwa ya, sị: “Chineke, ọ bụrụ na ị dị adị n’ezie, nyere m aka, duzie m, ma meekwa ka m nwetaghachi obi ụtọ.”

Ka ọ dịgodị, ezinụlọ m nwere nchegbu, karịsịa nna m. Nne na nna m goro ndị dibịa ọrụ ịgwọ m. Nna m sịrị na ezi onye dibịa agaghị asị gị weta ego, ọ ga-emekwa ihe o kwuru. Iji mee nne na nna m obi ụtọ, ekeere m òkè ọtụtụ ugboro n’ememe okpukpe Ụzọ Ngọzi Ndị Navajo.

Anọpụụrụ m onwe m iche ọtụtụ ụbọchị n’ime hogan anyị, na-enwe nanị redio n’akụkụ àkwà m. Eji m ịkpọasị gee okwu amamikpe nke otu ụkọchukwu n’ihi na anabataghị m Jisọs n’obi m. Enweghị m nnọọ mmasị n’okwu ahụ! Ike okpukpe ndị ọcha nakwa ọbụna okpukpe nke m gwụrụ m! Ekpebiri m ịchọ Chineke n’ụzọ nke m.

N’oge ahụ m nọpụụrụ onwe m iche, ahụrụ m obere akwụkwọ uhie ahụ ọzọ. Achọpụtara m na ọ bụ akụkụ Bible. Site n’ịgụ Abụ Ọma, amụtara m ihe banyere ahụhụ na ịda mbà n’obi Eze Devid, ọ kasikwara m obi. (Abụ Ọma 38:1-22; 51:1-19) Otú ọ dị, n’ihi nganga, ewepụrụ m uche ngwa ngwa n’ihe m gụrụ. Agaghị m anabata okpukpe ndị ọcha.

N’agbanyeghị ịda mbà n’obi m, agbalịrị m ilekọta nwa m nwoke anya nke ọma. Ọ ghọọrọ m onye nkasị obi. Amalitere m ikiri ihe omume ekpere nke ndị okpukpe na-eme na TV. N’enweghịzi olileanya, eweliri m fon ma jiri nọmba a na-adịghị ana ego maka ya kpọọ maka enyemaka. Eji m iwe tọgbọ fon ahụ mgbe a gwara m ka m kwe nkwa inye onyinye $50 ma ọ bụ $100!

Ikpe ịgba alụkwaghịm ahụ mere ka m daa mbà n’obi, karịsịa mgbe m hụrụ na di m anaghị agwa ọkàikpe ahụ na-akpa ókè agbụrụ eziokwu. O were anyị ogologo oge ịgbacha alụkwaghịm n’ihi ịzọ onye ga-akpọrọ nwa anyị nwoke. Ma enwere m mmeri. Nna m ji ịhụnanya kwadoo m n’oge ikpe ahụ n’ekwughị ihe ọ bụla. Ọ hụrụ na m nwere mwute nke ukwuu.

Mgbe Mbụ M Zutere Ndịàmà Jehova

Ekpebiri m iwere ndụ otú m si hụ ya. N’otu oge, ahụrụ m ka otu ezinụlọ bụ́ ndị Navajo na-agwa ndị agbata obi m okwu. Ezoro m ezo na-enyo ihe ha na-eme. Ndị ọbịa ahụ nọ na-ekere òkè n’ihe dị ka ọrụ isite n’ọnụ ụzọ aga n’ọnụ ụzọ. Ha bịakwara n’ebe obibi m. Sandra, bụ́ onye Navajo, kọwara onwe ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Aha ahụ bụ́ Jehova dọọrọ mmasị m karịa ihe ọ bụla ọzọ. Asịrị m: “Ònye bụ Jehova? Okpukpe unu aghaghị ịbụ okpukpe ọhụrụ. Gịnị mere na a kụzighịrị m aha Chineke na chọọchị?”

O ji obiọma meghee Bible ya n’Abụ Ọma 83:18, bụ́ nke na-asị: “Ka ha wee mara na Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” Ọ kọwara na Chineke nwere aha aka nakwa na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ onye àmà Jehova. O kwuru na ya ga-akụziri m banyere Jehova na Jisọs ma hapụrụ m akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. * N’oké mkpali, asịrị m: “Ee. Aga m achọ ịnwale okpukpe ọhụrụ a!”

Agụchara m akwụkwọ ahụ tupu chi ọbụbọ. Ihe e kwuru n’ime ya bụ ihe ọhụrụ nye m ma dị iche. Ọ kọwara na ndụ nwere nzube, ọ bụkwa ihe dị m mkpa iji nweghachi mmasị ná ndụ. Amalitere m ịmụ Bible, n’ịbụkwa ihe obi ụtọ nye m, e ji Bible zaa ọtụtụ n’ime ajụjụ m. Ekweere m ihe nile m mụtara. Ezi uche dị na ya, ọ ghaghịkwa ịbụ eziokwu!

Amalitere m ịkụziri Lionel eziokwu Bible mgbe ọ dị afọ isii. Anyị na-ekpekọ ekpere ọnụ. Anyị na-eji echiche bụ́ na Jehova na-eche banyere anyị nakwa na ọ dị anyị mkpa ịtụkwasị ya obi na-agbarịta ibe anyị ume. Mgbe ụfọdụ ike adịghịzi adị m ịnagide ihe. Ma, obere aka ya ọ na-atụkwasị m, tinyere okwu obi ike ya nke na-emesighachi obi ike, bụ́, “Mama, ebela ákwá, Jehova ga-elekọta anyị,” nwere mmetụta dị nnọọ ukwuu n’ebe m nọ. Lee ka nke ahụ si kasie m obi ma mee ka m kpebisie ike ịnọgide na-amụ Bible! Ekpere m ekpere n’esepụghị aka maka nduzi.

Mmetụta nke Nzukọ Ndị Kraịst

Ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ kpaliri anyị ime njem dị kilomita 240 iji gaa ma lọta nzukọ Ndịàmà Jehova na-enwe na Tuba City. Anyị na-aga ugboro abụọ n’izu n’oge okpomọkụ, na-agakwa nanị na Sunday ma nọgide site n’ụtụtụ ruo ná mgbede n’ọnwa ndị bụ́ oge oyi n’ihi ihu igwe na-adịghị mma. N’otu oge mgbe ụgbọala anyị mebiri, anyị rịọrọ onye ọzọ o wee buruo anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ogologo oge ndị ahụ anyị na-anya ụgbọala na-agwụ ike, ma okwu Lionel kwuru na anyị ekwesịghị ịhapụ nzukọ ọ gwụla ma anyị na-anwụ anwụ mere ka m mata mkpa ọ dị ịghara iji ntụziaka ime mmụọ sitere n’aka Jehova akpọrọ obere ihe.

Ná nzukọ, anya mmiri adịghị ara ahụ agba m mgbe ọ bụla anyị na-abụ abụ Alaeze ndị na-ekwu banyere ịdị ndụ ebighị ebi n’enweghị nhụsianya ná ndụ. Enwetara m nkasi obi na agbamume site n’aka Ndịàmà Jehova. Ha gbasoro ụzọ nke ile ọbịa site n’ịkpọ anyị ịbịa n’ụlọ ha maka nri ehihie na oriri ntụrụndụ, anyị na-ekerekwa òkè n’ọmụmụ Bible ezinụlọ ha. Ha gosịrị mmasị n’ebe anyị nọ ma na-ege anyị ntị. Karịsịa ndị okenye keere òkè bụ́ isi n’igosi anyị ọmịiko na ime ka anyị kwenyesikwuo ike na Jehova Chineke na-eche banyere anyị. Enwere m obi ụtọ inweta ezi ndị enyi. Ha na-eme ka anyị nwee ume ọhụrụ, ọbụnakwa soro m kwaa ákwá mgbe m chere na ike agwụla m.—Matiu 11:28-30.

Nnukwu Mkpebi Abụọ

Mgbe m malitere nnọọ inwe afọ ojuju ná ndokwa Jehova, enyi m nwoke lọghachiri ka anyị kpezie. M ka hụrụ ya n’anya, apụghịkwa m ịjụ arịrịọ ya. Anyị mere atụmatụ ịlụ di na nwunye. Echere m na eziokwu ahụ ga-agbanwe ya. Ma adara m ya, dawaa afọ! Enweghị m obi ụtọ. Akọ na uche m nyere m nsogbu. N’ịbụ ihe mwute nye m, ọ nabataghị eziokwu ahụ.

Akọọrọ m otu n’ime ndị okenye. O sooro m tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ, sorokwa m kpee ekpere maka mkpebi m. Ekwubiri m na Jehova agaghị eme m ihe ga-ewute m ma ọlị kama ọ bụ ndị na-ezughị okè ga-eme otú ahụ, n’agbanyeghị otú anyị na-akwanyeruru ha ùgwù. N’eziokwu, amụtara m na a pụghị ịtụkwasị ihe ahụ a sị na ọ bụ alụmdi na nwunye mbikọ ọnụ obi. Emere m mkpebi. O siiri m ike ma wute m nke ukwuu ịkwụsị mmekọrịta a. N’agbanyeghị na m ga-enwe ihe isi ike n’ụzọ ego, ọ dị m mkpa ịtụkwasị Jehova obi m nile.

Ahụrụ m Jehova n’anya ma kpebie ijere ya ozi. Na May 19, 1984, egosipụtara m nrara m raara ndụ m nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri. Nwa m nwoke, bụ́ Lionel, bụkwa Onyeàmà Jehova e mere baptism. Anyị nwetara mkpagbu dị ukwuu site n’aka ezinụlọ m na di m ochie, ma anyị nọgidere na-enyefe Jehova ihe nile n’aka. O mechughị anyị ihu. Ezinụlọ m weturu obi ma nakwere ụzọ ndụ ọhụrụ anyị mgbe ogologo afọ 11 gasịrị.

Ahụrụ m ha n’anya nke ukwuu, nanị ihe m chọkwara bụ ka ha mụta banyere Jehova ka ha onwe ha kwa wee nwee obi ụtọ. Nna m, bụ́ onye cheburu na mụ efunahụwo ya n’ihi na m ga-anọgide na-ada mbà n’obi ma gbuo onwe m, ji obi ike na-agbachitere m. O nwere afọ ojuju ịhụ ka obi dị m ụtọ ọzọ. Achọpụtara m na ikpeku Jehova ekpere, ịga nzukọ Ndịàmà Jehova, na itinye Okwu Chineke n’ọrụ dịcha oké mkpa n’usoro mgbake ahụ.

Olileanya Maka Ọdịnihu

Ana m atụ anya oge mgbe nhụjuanya, ezughị okè, ịgha ụgha, na ịkpọasị nile ga-akwụsị kpam kpam. Ana m ese onyinyo ebe ala Navajo anyị jupụtara n’akwụkwọ ndụ, na osisi peach na apricot bụ́ ndị na-adịbu ebe a. Ana m ese onyinyo ọṅụ agbụrụ dị iche iche ga-enwe bụ́ ndị ga-ekere òkè n’ịgbanwe ala nna ha kpọrọ nkụ gaa na paradaịs mara mma site n’enyemaka nke osimiri na mmiri ozuzo. Ana m ese onyinyo ka anyị na ndị agbata obi anyị bụ́ ndị Hopi na agbụrụ ndị ọzọ na-ekerịta ala kama ịbụ ndị na-asọrịta mpi dị ka anyị meworo n’oge ndị na-etebeghị aka. Ana m ahụ ugbu a otú Okwu Chineke si ejikọta agbụrụ, ebo, na ógbè nile. N’ọdịnihu, aga m ahụ ka e jikọtaghachiri ezinụlọ na ndị enyi dị iche iche, ha na ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ site ná mbilite n’ọnwụ. Ọ ga-abụ oge oké ọṅụ mgbe a ga-enwe atụmanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Apụghị m iche echiche otú mmadụ ọ bụla ga-esi ghara ịchọ ịmụta banyere atụmanya a dị ebube.

Mmụba Ọchịchị Chineke n’Ala Navajo

Ọ bụwo ihe na-akpali akpali ịhụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Tuba City nakwa ịhụ ka ọgbakọ anọ tolitere n’ala ọha ndị Navajo na Hopi ndị ahụ *—Chinle, Kayenta, Tuba City, na Keams Canyon. Mgbe mbụ m denyere aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na 1983, anọ m nnọọ na-eche na otu ụbọchị, a ga-enwe ya na Navajo. Ọ bụghịzi ihe m na-eche n’echiche. Kemgbe 1998, a nọwo na-eduzi ụlọ akwụkwọ ahụ n’asụsụ Navajo.

Ịgwa ndị ọzọ na Chineke nwere aha aka ewetawo ngọzi na-adịghị agwụ agwụ. Inwe ike ịgụ na ịgwa ndị ọzọ okwu ndị na-ewusi okwukwe ike n’asụsụ ala anyị ndị a na-ahụ na broshuọ ndị bụ́ Nihookáá’gi Hooláágóó liná Bahózhoóodoo! (Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!), Ha’át’fíísh éí God Nihá yee Hool’a’? (Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?), na nke kasị ọhụrụ, bụ́ Ni Éí God Bik’is Dííleelgo Át’é! (Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!), dị nnọọ egwu ikwu ya n’ọnụ. Enwere m ekele n’ebe ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche nọ maka ibute ụzọ n’ọrụ nkụzi Bible a iji mee ka mba nile na ebo nile na asụsụ nile rite uru, gụnyere ndị Navajo, ndị Diné.—Matiu 24:45-47.

Ana m arụ ọrụ mgbe nile iji kwadoo onwe m ma na-asụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge. Ọnọdụ alụghị di m nọ na ya dị m mma, enwekwara m ọchịchọ ijere Jehova ozi n’enweghị ihe ndọpụ uche. Enwere m afọ ojuju na obi ụtọ ịgwa ndị nke m nakwa ndị ọzọ, karịsịa ndị nwere obi nkoropụ, na “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

Adịghịzi m eche na Bible bụ okpukpe ndị ọcha. Okwu Chineke, bụ́ Bible, dịịrị onye ọ bụla chọrọ ịmụ banyere ya na itinye ya n’ọrụ. Mgbe Ndịàmà Jehova bịakwutere gị, kwe ka ha gosi gị otú ị ga-esi nwee ezi obi ụtọ. Ha na-ewetara gị ozi ọma nke aha Chineke, bụ́ Jehova, aha nke gbanwere ndụ m! “Aoo,’ Diyin God bízhi’ Jiihóvah wolyé.” (“Ee, aha Chineke bụ Jehova.”)

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Iji nweta ihe ọmụma zuru ezu banyere okpukpe ndị Mormon, lee Teta! (Bekee), November 8, 1995.

^ par. 7 AIM bụ òtù na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ nke otu onye American Indian guzobere na 1968. Òtù ahụ na-akatọkarị BIA, bụ́ ụlọ ọrụ gọọmentị guzobere na 1824, o doro anya na ọ bụ iji kwalite ọdịmma nke ndị India nọ ná mba ahụ. Ụlọ ọrụ BIA na-agbazinyekarị ndị na-abụghị ndị India akụ̀ dị n’ime ala, mmiri, na ihe ndị ọzọ dị n’ala ọha mmadụ ahụ.—World Book Encyclopedia.

^ par. 9 A na-ele ifuru ọka anya dị ka ihe dị nsọ ma jiri ya na-eme ihe n’ekpere nakwa n’ememe okpukpe dị iche iche, ọ na-anọchi anya ndụ na ime ka ihe dị ọhụrụ. Ndị Navajo kweere na ahụ na-aghọ ihe dị nsọ mgbe mmadụ si n’ụzọ a wụsasịrị ifuru na ya gafere.—The Encyclopedia of Native American Religions.

^ par. 25 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara, ma a dịghịzi ebipụta ya.

^ par. 39 Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee usoro isiokwu bụ́ “Ndị American Indian—Gịnị Ka Ọdịnihu Ha Ga-abụ?” ná mbipụta Teta! nke September 8, 1996.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ụdị ụlọ “hogan” ndị Navajo

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na nwa m nwoke, bụ́ Lionel

[Foto dị na peeji nke 27]

Mụ na ndị enyi m bụ́ ndị Russia ná mgbakọ mba nile e nwere na Moscow na 1993

[Foto dị na peeji nke 28]

Mụ na ezinụlọ ime mmụọ m n’Ọgbakọ Kayenta, Arizona