Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Ga-enye Ụwa Ihe Oriri?

Ònye Ga-enye Ụwa Ihe Oriri?

Ònye Ga-enye Ụwa Ihe Oriri?

Ọ̀ DỊ mgbe ihe a kpọrọ mmadụ ga-amalite ichebe ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ kama ibibi ha? Dị ka ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ John Tuxill si kwuo, nke ahụ ga-achọ “oké mgbanwe n’usoro ime ihe.” Otú ọ dị, o kwukwara na ‘o yighị ka a ga-enwe mgbanwe dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ emeghị ezigbo mgbanwe n’ihe ọmụma ha banyere abamuru nke ụdị dị iche iche nke ihe ọkụkụ, mgbanwe n’ọchịchọ ha ịgbanwe ụzọ e si arụ ọrụ ugbu a, nakwa mgbanwe n’ịdị njikere ịnwale usoro ọhụrụ dị iche iche.’

Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta na oké mgbanwe ndị dị otú ahụ ga-ewere ọnọdụ. Ọtụtụ ndị ekweghịkwa n’ihe Tuxill kwubiri. E nwere ndị ọkà mmụta sayensị banyere gburugburu ebe obibi bụ́ ndị na-eche na a ghọtachabeghị ọrụ ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ na-arụ nakwa na ikekwe ụfọdụ ndị ibe ha na-ekwubiga okwu ókè. Ma, ka ndị ọkà mmụta sayensị na-arụ ụka banyere okwu ahụ, o yiri ka ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịrịba egwu na-atụ ụfọdụ ndị ọkachamara n’akụkụ a ama. O yiri ka ha na-enwe nchegbu, ọ bụghị nanị maka enweghịzikwa ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ kamakwa maka anyaukwu na elepụghị anya n’ihu ha hụrụ na-akpata ịpụ n’anya dị otú ahụ. Rịba okwu ndị a ndị edemede dị iche iche kwuru ama.

“Nanị otu narị afọ gara aga, ọtụtụ narị ndị ọrụ ugbo, bụ́ ndị nọgasị n’ebe dị iche iche na mbara ala, na-achịkwa ọbá mkpụrụ akụ́kụ́ ha. . . . Taa, ụlọ ọrụ ndị dị n’ụwa nile ewebatawo, megharịa, ma nweta ihe ka ukwuu n’ọbá mkpụrụ akụ́kụ́ ndị ahụ ma debe ha dị ka ihe ha ji ọgụgụ isi ha mepụta. . . . Site n’ilekwasị anya n’ihe ndị na-eweta uru ozugbo, ụlọ ọrụ nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ yiri ka hà ga-ebibi mkpụrụ ndụ ihe nketa nke mkpụrụ akụ́kụ́ ndị a bu pụta ụwa ndị pụrụ imecha otu ụbọchị baa ezigbo uru dị ka ihe nchebe pụọ n’ọrịa ma ọ bụ akịka ndị bụ́ ọnyịrị ọnwụ.”—Onye edemede sayensị bụ́ Jeremy Rifkin.

“Ihe a na-ekwu n’usoro mgbasa ozi ugboro ugboro bụ na ihe dị mkpa n’ụzọ bụ́ isi aghaghị ịbụ ógbè azụmahịa, nzụkọrịta ahịa nakwa akụ̀ na ụba ụwa. Mgbe ụlọ ọrụ mgbasa ozi lekwasịrị anya n’akụ̀ na ụba na n’ọdịmma nke nnukwu ụlọ ọrụ ndị bụ́ ọkpọka, obi ike a e nwere n’ebe akụ̀ na ụba dị na-eyi nkwenkwe okpukpe, ọ na-esikwa ike ka a gbaghaa ya.”—Ọkà n’ihe banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa bụ́ David Suzuki.

N’akwụkwọ ya bụ́ Seeds of Change—The Living Treasure, Kenny Ausubel bụ́ onye na-ede akwụkwọ, na-akọwa omume ihu abụọ dị ná mba ndị mepere emepe mgbe “gọọmenti na ụlọ ọrụ ha na-ekwupụta mwute ha banyere ihe ize ndụ zuru ụwa ọnụ nke mkpochapụ dị oké nso nke ‘ihe nketa ụmụ mmadụ nwekọrọ ọnụ’ bụ́ nkwakọba nke mkpụrụ ndụ ihe nketa.” Ọ na-ekwu na ha onwe ha kwa na-eyi ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ egwu site n’ịkwalite usoro ọrụ ugbo ọgbara ọhụrụ nakwa ịkọ nanị otu ụdị ihe ọkụkụ.

Ma egwu kasịnụ nke ndị ọkà n’ihe banyere gburugburu ebe obibi ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị ezi, ọ pụrụ isiri gị ike inwe obi ike n’ọdịnihu nke mbara ala a. Ogologo oge hà aṅaa ka ọ ga-adịgide, ebe o yiri ka ọ̀ bụ anyaukwu na-akwali ihe a kpọrọ mmadụ? Ebe ha chọsiri ihe ngwọta ike, ọtụtụ ndị nwere olileanya na sayensị ga-edozi nsogbu ahụ.

Sayensị na Nkà na Ụzụ Hà Pụrụ Ịzọpụta Anyị?

N’oge na-adịbeghị anya, òtù Royal Society nke Edinburgh kwara arịrị na ọganihu sayensị na-enwe na-agawanye ngwa ngwa ma na-agba gharịị nke na ndị ọkà mmụta sayensị nọ n’ihe ize ndụ nke aghọtachaghị ihe ọganihu a pụrụ ịrụpụta. “Sayensị na-enye obere ihe ọmụma, n’ụdị dị iche iche banyere ihe ndị e kere eke,” ka David Suzuki dere. “Anyị amaghị ihe ndị mejupụtara ụdị ihe ndị dị iche iche dị ndụ dị n’Ụwa, ma ya fọdụzie ịmata ihe jikọtara ha na otú ha si adabere n’ebe ibe ha dị.”

Dị ka magazin bụ́ Science si kọwaa, “ma ihe ize ndụ ndị dị na GEO [Ihe Ndị Dị Ndụ A Gbanwere Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa Ha] ma abamuru ndị dị na ya adịghị nke doro anya ma ọ bụ zuo ebe nile. . . . Nkà anyị nwere ikwu ihe ga-abụ mmetụta nke ụdị ihe ndị e si esi weta, gụnyere GEO, adịghị edocha anya.”

Ọtụtụ “ọganihu” e nweworo abụwo n’ezie mma ihu abụọ. Ha na-eweta abamuru ụfọdụ ma na-egosikwa enweghị amamihe nke ihe a kpọrọ mmadụ nakwa, ọtụtụ mgbe karị, anyaukwu ha. (Jeremaịa 10:23) Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na usoro ọhụrụ nke ịkọ ugbo mepụtara ihe oriri n’ụba ma mee ka ọtụtụ ndị nwee ihe oriri, o mekwara ka a gharazie inwe ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ. Site n’ịkwalite iji ọgwụ ahụhụ na usoro ịkọ ugbo ndị ọzọ na-efu oké ego eme ihe, usoro ọhụrụ nke ịkọ ugbo kasị baara ‘ụlọ ọrụ ndị na-azụlite ihe ọkụkụ na ndị nọ n’ọkwá dị elu ná mba ndị na-emepechaghị emepe uru ma na-aghọ ndị nkịtị ahịa,’ ka Dr. Mae-Wan Ho dere. Ọnọdụ a ka na-aga n’ihu ka ịkọ ugbo nke dabeere na nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ na-aghọwanye ọbụna achụmnta ego ka ukwuu nakwa nke siri ike karị ma na-akpọga anyị n’ọdịnihu nke inweta ihe oriri zuru ezu ga-adaberewanye na nkà mmụta sayensị.

Otú ọ dị, nsogbu ndị a ekwesịghị ime ka anyị nwee nkụda mmụọ. N’ezie, nanị ihe ha na-eme bụ igosipụta otu isi ihe ka ukwuu. Bible na-enyere anyị aka ịhụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya ihe dị nnọọ ukwuu n’aka ụmụ mmadụ na-ezughị okè bụ́ ndị na-eji mbara ala a na ihe ndị dị n’ime ya eme ihe ugbu a. Ka ọ dịgodị, ọdịda na ejighị ihe eme ihe n’ụzọ ziri ezi bụ n’ezie akụkụ nke ọnọdụ mmadụ. N’ihi ya, Abụ Ọma 146:3 na-adụ ọdụ, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” Ma anyị pụrụ inwe ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Chineke nọ. (Ilu 3:5, 6) O nwere ma ọchịchọ ma ikike inyere anyị aka.—Aịsaịa 40:25, 26.

N’isi Nso—Ụwa nke Jupụtara n’Ihe Omume Ma Na-enwe Ọganihu

Tupu ị rụzigharịa ụlọ mebiworo emebi, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i buru ụzọ kpopụsịa unyi. N’otu aka ahụ, n’oge na-adịghị anya Jehova Chineke ga-ewepụ ndị ajọ omume nile n’ụwa, gụnyere ndị na-ele mbara ala anyị, ihe ndị e kere eke dị n’ime ya, na ọbụna ụmụ mmadụ ibe ha anya nanị dị ka ihe ndị a ga-erigbu maka inwetara onwe ha na òtù dị iche iche akụ̀ na ụba. (Abụ Ọma 37:10, 11; Mkpughe 11:18) Ma Jehova ga-edebe ndị nile hụrụ ya n’anya ma na-agbalị ime uche ya ndụ.—1 Jọn 2:15-17.

Mgbe nke ahụ gasịrị, ụwa na ọtụtụ ihe dị ndụ dị n’ime ya, gụnyere ụmụ mmadụ na-erube isi, ga-abụ ndị ọchịchị nke Chineke guzobere ga-achị—Alaeze Mesaịa. (Daniel 7:13, 14; Matiu 6:10) Leekwa ụbara ihe ụwa ga-emepụta n’okpuru ọchịchị amamihe ahụ! Abụ Ọma 72:16 na-ekwu, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” Ee, ihe oriri agakwaghị abụ ihe ga-akpata esemokwu na nchegbu. Kama nke ahụ, ọ ga-abụ ihe na-adịghị ize ndụ, nke bakwara ụba.

Ya mere, ka usoro ihe dị ugbu a na-abamikwu n’ọnọdụ ọjọọ ya nke obi nkoropụ na amaghị ihe a ga-eme, ndị tụkwasịrị Jehova obi pụrụ ịtụ anya ọdịnihu dị ebube n’ụwa ebe a kpọmkwem. Olileanya a dị ‘n’ozi ọma nke alaeze,’ bụ́ nke Ndịàmà Jehova na-ekwusara ndị nile chọrọ ụwa nke ka mma nakwa nke ezi omume. (Matiu 24:14) N’ihi olileanya a e ji n’aka—na nlekọta Chineke na-elekọta ndị ya dị ka nna—anyị pụrụ, ọbụna ugbu a, ‘ibi ná ntụkwasị obi, nọrọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.’—Ilu 1:33.

[Foto dị na peeji nke 10]

N’okpuru Alaeze Chineke, ihe oriri ga-abụ ihe na-adịghị ize ndụ, nke bakwara ụba

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]

FAO Photo/K. Dunn

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]

Ngalaba Na-ahụ Maka Njem Nleta nke Thailand