Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

 Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’ebe ndị e zoro aka na Bible, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 23. Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1.Dị ka Pita si kwuo, àgwà dị aṅaa ka mmadụ na-aghaghị igosipụta iji nweta obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ? (1 Pita 5:5)

2. Ka ịchịisi dịruru ụbọchị asaa nke eze Israel nke ise bụ́ Zimri gasịrị, olee ndị ikom abụọ zọrọ ocheeze ahụ n’ime afọ anọ nke agha obodo? (1 Ndị Eze 16:21)

3. Gịnị menyere ndị Israel ụjọ, nke na ha jụrụ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ? (Ọnụ Ọgụgụ 13:28, 31-33; Deuterọnọmi 1:28)

4. Olee ihe kasịnụ ndị Hibru ji atụ ịdị arọ na ego n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀? (Ezra 8:26)

5. N’aha gịnị ka Filiks ji zie ka a kpọọ Pọl, ma gịnị ka ọ na-achọ n’ezie? (Ọrụ 24:24-26)

6. Aha dị aṅaa ka Jisọs ji kọwaa ma ya ma ndị na-eso ụzọ ya? (Matiu 5:14; Jọn 8:12)

7. Aha dị aṅaa kwesịrị nanị Jisọs ma o kwesịghị ndị na-eso ụzọ ya? (Matiu 23:10)

8. Okwu dị aṅaa ka Jemes jiri mee ihe n’izo aka n’oké ọchịchọ, ịbụ onye a ma ama, na ike? (Jemes 4:1)

9. Olee ihe e ji ewu ihe nke a kasị jiri mee ihe n’obí eze Peasia dị na Shushan? (Esta 1:6)

10. Dị ka Jọn si kwuo, gịnị bụ ihe atọ dị n’ụwa ndị ‘na-esiteghị ná Nna anyị’? (1 Jọn 2:16)

11. Ná ndepụta Pọl nke ihe agha ime mmụọ onye Kraịst, olee akụkụ nọchitere anya nzọpụta? (Ndị Efesọs 6:17)

12. Ònye ka a ma ama n’ihi ịsọpụrụ ụmụ ya karịa Jehova? (1 Samuel 2:27-29)

13. Gịnị bụ mkpụrụ akwụkwọ nke ise ná mkpụrụ akwụkwọ ndị Hibru? (Abụ Ọma 111:3, NW)

14. N’ọnwa dị aṅaa na kalenda ndị Juu ka Solomọn malitere iwu ụlọ nsọ ahụ? (1 Ndị Eze 6:1)

15. Olee onye amụma bụ́ onye Kraịst nke buru amụma maka njide a ga-ejide Pọl n’ọdịnihu na Jerusalem? (Ọrụ 21:10, 11)

 Azịza Nye Ajụjụ

1. “Obi dị umeala,” ma ọ bụ ịdị umeala n’obi

2. Tibni na Ọmri

3. ‘Ito ogologo’ na ịdị ike nke ndị bi n’ala ahụ

4. Talent

5. Ịnụ banyere “okwukwe n’ime Kraịst Jisọs”; aka azụ

6. “Ìhè nke ụwa”

7. Onye ndú

8. “Ihe ụtọ anụ ahụ”

9. Marble

10. “Agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ,” “agụụ ihe ọjọọ nke anya,” na “oké okwu nke ibi obi”

11. Okpu agha

12. Onyeisi Nchụàjà bụ́ Ilaị

13. He’

14. Ziv

15. Agabọs