Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma Mgbe M Nọ ná Mba Ọzọ?

Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma Mgbe M Nọ ná Mba Ọzọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma Mgbe M Nọ ná Mba Ọzọ?

“Mgbe m rutere n’ọdụ ụgbọelu, nanị ihe m chọrọ ime bụ ịlawa! . . . Ọchịchọ nile m nwere maka inwe ahụmahụ dị ịrịba ama na ọṅụ nile m nwere maka ịchọpụta ihe kwụsịrị. Ikwu ya n’ụzọ dị nkenke, agụụ ụlọ gụrụ m karịa mgbe ọ bụla ọzọ.”—Uta.

Ọ BỤ ihe na-atụ egwu ịnọ nanị gị n’ala ọzọ. Ma dị ka isiokwu bu ụzọ n’usoro isiokwu a gosiri, ọtụtụ ndị ntorobịa na-ahọrọ ibitụ ná mba ọzọ. Ndị ụfọdụ na-aga ịgụ akwụkwọ ma ọ bụ ịnata ọzụzụ pụrụ iche. Ndị ụfọdụ na-achọ ịmụ asụsụ. Ndị ụfọdụ na-achọ nanị inweta ego. Otú ọ dị, ndị ọzọ akwagawo ala ọzọ bụ́ ebe ndị e nwere mkpa maka ndị nkwusa Alaeze iji jee ozi.

Ka e were ya na i nwere ezi ihe mere i ji nọrọ ná mba ọzọ—ihe ndị metụtara mkpa na ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ gị *—gịnị ka ị pụrụ ime iji hụ na ọnụnọ ị ga-anọ n’ebe ahụ ga-aga nke ọma?

Kpebisie Ike Ime Mgbanwe

Nke mbụ, ị ghaghị ịdị njikere ime mgbanwe. Nke ahụ apụtaghị ịgbahapụ ụkpụrụ ndị Kraịst ma ọ bụ usoro ihe omume ime mmụọ gị. Ma ọ pụrụ ịpụta inwe mmasị ná nrị ị na-adịbughị eri, ịmụ ụkpụrụ omume ọma ndị ọzọ, ma ọ bụ ịmụ ụzọ ndị ọzọ e si eme ihe. Omume ndị a pụrụ ịdị nnọọ iche n’ụzọ i si eme ihe n’obodo unu. Ma iwu Jisọs nyere ka a ‘ghara ikpe ikpe’ pụrụ ịdaba adaba na nke a. (Matiu 7:1) N’ezie, ọ dịghị agbụrụ kwesịrị ikwu na ya ka ndị ọzọ mma. (Ọrụ 17:26) Dị nnọọ ka ndị meworo okenye kwesịrị izere iji ndị ntorobịa nke oge a tụnyere ndị nke oge gara aga, otú ahụkwa ka ndị na-eto eto nọ ná mba ọzọ kwesịrị izere iji mba ọzọ tụnyere mba ha. (Eklisiastis 7:10) Lekwasị anya n’ihe ndị dị mma dị n’ala na ọdịbendị ọhụrụ a. Ọzọkwa, ka ị na-amụta asụsụ ala a ngwa ngwa karị, otú ahụ ka ahụ ga-eru gị ala ngwa ngwa karị.

Pọl onyeozi nwere ihe ịga nke ọma n’ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọdịbendị dị iche iche mgbe ọ na-arụ ọrụ dị ka onye ozi ala ọzọ n’ihi na ọ dị njikere ịghọ “ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ.” (1 Ndị Kọrint 9:22) Àgwà yiri nke ahụ pụrụ inyere gị aka ime mgbanwe. Adrianne bụ nwa odibo bi na Germany, nke na-arụrụ ezinụlọ ọzọ ọrụ ụlọ maka ụlọ na nri. Ọ na-akọwa, sị: “Aghaghị m ime mgbanwe dị ukwuu n’ihi na apụghị m ịtụ anya ka ndị ọzọ gbanwee n’ihi m.”

‘Agụụ Ụlọ Na-agụ M!’

N’izu ole na ole mbụ, ọ bụghị ihe ọhụrụ inwe mwute na agụụ ịla. Bible na-egosi na ‘agụụ ụlọ nna Jekọb gụsiri ya ike,’ ọ bụ ezie na Jekọb anọwo ná mba ọzọ ruo ihe karịrị afọ 20! (Jenesis 31:30) Ya mere ya ejula gị anya ma i bee ákwá mgbe ụfọdụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị na-echekarị banyere ihe ndị ị hapụrụ, nanị ihe ọ ga-eme bụ ime ka i nwekwuo mwute. (Ọnụ Ọgụgụ 11:4, 5) Ụzọ kasị mma isi nagide nkụda mmụọ ahụ bụ ime ka usoro ihe omume gị na gburugburu ebe obibi ọhụrụ gị mara gị ahụ. Ọ bụ ezie na ọ dị mma isoro ezinụlọ gị na-ezirịta ozi site n’ide akwụkwọ ozi ma ọ bụ ịkpọ òkù fon, ịkpọ ezinụlọ gị na fon ọtụtụ ugboro pụrụ igbochi gị ime mgbanwe ndị ga-ekwekọ n’ebe obibi ọhụrụ gị.

Ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst na-achọpụta na ịmaliteghachi usoro ihe omume ime mmụọ ha bụ ihe ngwọta kasị mma maka owu ọmụma. (Ndị Filipaị 3:16) Amber na-echeta izu ndị mbụ ọ nọrọ ná mba ọzọ: “Ọ na-esiri m ike n’oge mgbede, mgbe ọ dịghị ihe m na-eme, ya mere m na-agbalị ịmụkwu ihe ma ọ bụ ịgụ akwụkwọ.” Nwa agbọghọ bụ́ Rachel bụ́ onye Britain na-agba odibo na Germany na-ekwu mgbe ọ na-adụ ọdụ site n’ahụmahụ o nwere, sị: “Soro ha kpakọrịtawa ozugbo. Malite ịga nzukọ n’egbughị oge.” Ná mmalite, ị pụrụ ịchọ enyemaka iji gaa nzukọ. Ma n’ime ọgbakọ ndị Kraịst, ị pụrụ inweta ezigbo ndị enyi bụ́ ndị pụrụ ịdị ka “ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne.”—Mak 10:29, 30.

Ikere òkè n’ọrụ izisa ozi ọma ndị Kraịst bụkwa akụkụ dị mkpa nke usoro ihe omume ime mmụọ dị mma. Ọ bụghị nanị na ime nkwusa ga-abara gị uru n’ụzọ ime mmụọ kama ọ ga-enyekwara gị aka ime mgbanwe ga-ekwekọ n’ọdịbendị na asụsụ ọhụrụ.

N’ikpeazụ nọgide na-ekpe ekpere ma na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye mgbe nile. Ha dị mkpa n’ime ka ị kwụsie ike n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Rom 12:12; 1 Timoti 4:15) N’ihi nke a, Adrianne, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, hụrụ na o ji akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị dị n’asụsụ ala ha.

Ibinyere Ezinụlọ Ọzọ

Ndị na-eto eto ụfọdụ bụ́ ndị Kraịst emewo ndokwa ibinyere ezinụlọ ọzọ kwere ekwe mgbe ha nọ ná mba ọzọ. Ọ bụ ezie na a gaghị atụ anya ka ezinụlọ e binyeere rụọ ọrụ dịịrị nne na nna, ha pụrụ ịbụ ezi ndị mkpakọrịta na ndị na-enye agbamume ime mmụọ.—Ilu 27:17.

Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, iso ezinụlọ e binyeere na-enwe ezi nkwurịta okwu dị oké mkpa iji nọgide na-enwe ezi mmekọrịta. (Ilu 15:22; 20:5; 25:11) Amber na-ekwu, sị: “I kwesịrị ịhazi ihe ndị ị ga-eme. Ọ dị gị mkpa ịmata ihe ndị ndị i bi na be ha na-atụ anya ha n’aka gị. Ha kwesịkwara ịmata ihe ndị ị na-atụ anya ha n’aka ha.” Chọpụta iwu ezinụlọ ahụ, na ókè a chọrọ ka i soro na-ekere òkè n’ọrụ ụlọ. E kwesịrị ikwurịta ihe ndị dị otú ahụ nke ọma.

Ọnọdụ gị ga-esi nnọọ ike ma ọ bụrụ na, dị ka ihe atụ, ị na-arụrụ ezinụlọ i binyeere bụ́ nke gị na ya na-enweghị otu nkwenkwe, ọrụ. Ebe ọ bụ na ezinụlọ ahụ nwere ike ghara ịghọta otú i si ele ụkpụrụ Bible anya, i nwere ike ịhụ onwe gị n’ọnọdụ ndị pụrụ imebi okwukwe gị. (Ilu 13:20) Ọchịchọ a na-achọ ka ị rụọ ọrụ ụlọ pụrụ igbochi ibu ọrụ ime mmụọ, dị ka ịga nzukọ ndị Kraịst. Ya mere ọ bụrụ na ọnọdụ amanye gị ibinyere ezinụlọ gị na ya na-enweghị otu nkwenkwe, mgbe ahụ, e nwere ọtụtụ ihe i kwesịrị ịkpachara anya maka ha.

Rachel na-atụ aro, sị: “Jide n’aka na ha maara na ị bụ onye Kraịst. Ọ kasị mma na ị gwara ha nke bụ eziokwu ozugbo.” Ịkọwa ụkpụrụ okpukpe na nke omume gị pụrụ ịbụ ihe nchebe. Ọzọkwa, i kwesịrị ime ka onye were gị n’ọrụ ghọta nke ọma otú nzukọ ndị Kraịst na ime nkwusa si dị gị mkpa. N’ikpeazụ, ọ bụ ihe amamihe ịhụ na e dere ihe ndị dị mkpa dị ka oge ọrụ, oge ezumike, na ụgwọ ọrụ n’akwụkwọ tupu ị malite. Nke a pụrụ igbochi nsogbu n’ọdịnihu.

Idozi Nsogbu

N’agbanyeghị mgbalị nile i nwere ike itinye, nsogbu ka pụrụ ịdapụta. Dị ka ihe atụ, gịnị ma ọ bụrụ na ndị i bi na nke ha achọọ ka ị kwapụ na be ha? Nke a pụrụ iwute gị nke ukwuu. Ọ bụrụ na unu enwee nghọtahie, ị pụrụ ịgba mbọ ka gị na ndị i bi na nke ha jiri nwayọọ dozie ya n’ụzọ amamihe. (Ilu 15:1) Dị njikere ịnakwere mmejọ ọ bụla i mejọrọ. Ikekwe ha ga-agbanwe obi ha. Ọ bụrụ na ọ dịghị otú ahụ, ị ga-achọ ebe ọzọ ị ga-ebi.

Nsogbu ndị ọzọ pụrụ ịchọ ka ị rịọ mmadụ maka enyemaka. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ inwe nsogbu ego ma ọ bụ daa ọrịa. N’ịtụ egwu na ndị mụrụ gị pụrụ ịbịa kpọlaa gị, ị pụrụ ịla azụ ịgwa ha ihe na-emenụ. E wezụga nke ahụ, ha nọ ọtụtụ kilomita site n’ebe ahụ, ọ pụkwara ịbụ na ha amaghị otú ha ga-esi mee ihe banyere ọnọdụ ahụ ná mba ọzọ. Otú ọ dị, ndị okenye ọgbakọ nọ ebe ahụ pụrụ inwe ahụmahụ n’ime ihe banyere ụdị nsogbu ahụ, ha pụkwara inye ndụmọdụ ụfọdụ dị irè. Ha pụkwara inyere gị aka ikpebi ma ọ̀ bụ ihe ndị mụrụ gị kwesịrị ịnụ.

Ịla

N’agbanyeghị ihe isi ike na ihe ịma aka dị iche iche, ibi ná mba ọzọ pụrụ ịbụ ahụmahụ dị mma, karịsịa ma ị gaa ebe ahụ n’ihi ihe ime mmụọ. N’ezie, oge pụrụ iru mgbe ị na-aghaghị ịla. Andreas na-ekwu, sị: “N’ihi ọtụtụ ihe ndị dị mma m na-echeta—a na-echezọ ndị nke na-adịghị mma ngwa ngwa—o siiri m nnọọ ike ịlọtawa.” Ọ bụrụgodị otú ahụ, atụla anya na ndị enyi na ezinụlọ gị nọ n’ụlọ ga-agbanwe ụzọ ha si eme ihe na mberede ugbu a i ji omume ọhụrụ ị mụtara ná mba ọzọ lọta. Ọzọkwa, akpasula ha iwe site n’ichetara ha mgbe mgbe otú e si eme ihe ebe ọzọ. Dị ka o kwesịrị, ị ga-achọ ịgwa mmadụ nile ahụmahụ i nwere, ma iwe ewekwala gị ma ọ bụrụ na mmadụ nile enweghị mmasị na ya.

N’ụzọ doro anya, e kwesịri iwere mkpebi nke ịga bitụ n’ala ọzọ dị ka nke siri ike. Ọ bụrụ na mgbe gị na ndị mụru gị kwurịtasịrị banyere ya, i kpebie na i nwere ezi ihe ndị mere ị ga-eji kwaga ná mba ọzọ, dị njikere ịnagide ihe ịma aka ndị ị ga-ezute. Dị ka ọ dị n’ihe banyere mkpebi ọ bụla dị ukwuu ị ga-eme ná ndụ, ọ bụ ihe amamihe ibu ụzọ gukọọ ihe ọ ga-ewe.—Luk 14:28-30.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . M̀ Kwesịrị Ibi ná Mba Ọzọ?” dị ná mbipụta nke July 8, 2000.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]

Aro Maka Nchebe

● Debe akwụkwọ ikike ngafe gị, ego, na tiketi ị ga-eji lọta n’ebe ha na-agaghị efu efu.

● Mee ka nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ikike ngafe na/ma ọ bụ visa gị, tiketi ị ga-eji lọta, na akwụkwọ ndị ọzọ dị mkpa dị abụọ. Jide otu n’ime akwụkwọ nke ọ bụla, zigakwara ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị enyi gị nọ n’ụlọ otu n’ime nke ọ bụla.

● Na-eji mgbe nile nọmba telifon ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị enyi gị nọ n’ụlọ nakwa nke ezinụlọ i binyeere.

● Na-akpaso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị àgwà dị ọcha, ma hà nọ n’ezinụlọ i binyeere, n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ.

● Mụta ma ọ dịghị ihe ọzọ okwu ndị bụ́ isi na nkebi okwu ndị dị n’asụsụ mba ị nọ na ya.

● Gaa ka dọkịta lee gị ahụ tupu ị gawa. Hụ na i ji ọgwụ ọ bụla dị gị mkpa n’ókè ga-ezuru gị.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ọ bụrụ na nghọtahie adapụtara gị na ezinụlọ i binyeere, unu jiri nwayọọ dozie ya