Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Ndị Ji Nwee Mmasị ná Mgbaasị?

N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Ndị Ji Nwee Mmasị ná Mgbaasị?

N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Ndị Ji Nwee Mmasị ná Mgbaasị?

A kọwawo mgbaasị dị ka “nkwenkwe bụ́ na akụkụ bụ́ mmụọ nke mmadụ na-adị ndụ mgbe anụ ahụ nwụrụ nakwa na ọ pụkwara isoro ndị dị ndụ kwurịta okwu, ọtụtụ mgbe site n’aka onye na-eje ozi dị ka onye na-ajụ ndị mmụọ ase.”

NA 1998 otu akwụkwọ na-akọwa otú a pụrụ isi soro ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu malitere iwu nnọọ ewu na United States nke na nwa obere oge New York Times depụtara ya dị ka akwụkwọ kasị gaa ahịa.

N’afọ ole na ole gara aga na Moscow, isoro ndị na-eme anwansi na ndị mgbaasị nwee nzukọ wuru ewu n’etiti ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọchụ ntá ego, bụ́ ndị na-akwụ oké ego maka ya.

Na Brazil, usoro ihe nkiri a na-eme na telivishọn bụ́ ndị na-egosi mgbaasị na-adọta ọtụtụ ndị mmadụ ikiri ha.

Nye ọtụtụ ndị bi n’Africa ma ọ bụ n’Esia, a na-ahụkarị ime mgbaasị dị ka a na-ahụ ịzụrụ ihe.

Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Ji Echigharịkwuru Mgbaasị

Ọtụtụ ndị na-echigharịkwuru mgbaasị iji nweta nkasi obi mgbe ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ. Site n’aka ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, ha pụrụ inweta ihe ọmụma pụrụ iche ndị yiri ka ha si n’aka ndị nwụrụ anwụ. N’ihi ya, ndị dị otú ahụ mmadụ nwụnahụrụ na-ekwenyekarị na ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ dị ndụ nakwa na iso ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu ga-enyere ha aka idi ọnwụ ha.

Ndị ọzọ na-enwe mmasị n’ebe mgbaasị dị n’ihi na a gwawo ha na ndị mmụọ ga-enyere ha aka ịchọta ihe ha ga-eji gwọọ ọrịa ha, ịba ọgaranya, inwe ihe ịga nke ọma n’ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ, idozi nsogbu n’alụmdi na nwunye, ma ọ bụ ịchọta ọrụ. Ọtụtụ ndị ọzọ na-echigharịkwuru mgbaasị nanị n’ihi ọchịchọ ịmata ihe.

Otú ọ dị, otu ihe ọzọ mere ọtụtụ nde mmadụ jiworo chigharịkwuru mgbaasị bụ na a kụziworo ha na mgbaasị bụ, dị ka otu ọkachamara na nke a si kọwaa ya, “ụdị okpukpe ọzọ” nke “ya na Iso Ụzọ Kraịst na-aga ụkwụ na ụkwụ.” Ihe na-eme n’okpukpe na Brazil bụ ihe atụ nke a.

Brazil nwere ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke ndị na-ekpe Roman Katọlik n’ụwa, ma dị ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ Sol Biderman si kwuo ya, “ọtụtụ nde ndị Roman Katọlik na-amụnye kandụl n’ihe karịrị otu ọlta ma na-eche [na ọ dịghị] ihe ọjọọ dị na ya ma ọlị.” N’ezie Veja bụ́ akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Brazil kwa izu kọrọ na pasent 80 nke ndị na-agachi ebe a na-eme mgbaasị anya na Brazil bụ ndị Katọlik e mere baptism na-agakwa Mas. Tinyekwara nke a bụ eziokwu ahụ bụ́ na ọbụna ndị ụkọchukwu ụfọdụ na-aga nnọkọ ndị mgbaasị, mmadụ pụkwara ịhụ ihe mere ọtụtụ ndị okpukpe ji na-eche na Chineke na-akwado isoro ndị mmụọ na-ekwurịta okwu iji nweta nkasi obi na nduzi. Ma ọ̀ bụ eziokwu?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 3]

Ụdị Dị Iche Iche nke Mgbaasị

Ime mgbaasị pụrụ ịgụnye ijekwuru onye na-ajụ ndị mmụọ ase, ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase, ma ọ bụ ịchọ ihe àmà ọdịnihu. Otu ụdị mgbaasị a ma ama bụ ịjụ ndị mmụọ ase—ịgbalị ịmata ọdịnihu ma ọ bụ ihe a na-amaghị ama site n’enyemaka ndị mmụọ. Ụdị ụfọdụ nke ịjụ ndị mmụọ ase bụ ịgụ kpakpando, ikiri nkume crystal, ịkọwa nrọ, ịgụ akara aka, na iji kaadị na-akọ ọdịnihu.