Ọnụ Ọgụgụ 11:1-35

  • Chineke zitere ọkụ maka na ndị Izrel nọ na-eme mkpesa (1-3)

  • Ndị Izrel bere ákwá ka e nye ha anụ (4-9)

  • Mosis kwuru na ya erughị eru (10-15)

  • Jehova nyere ndị okenye iri asaa mmụọ nsọ (16-25)

  • Eldad na Midad; Joshụa kwochiteere Mosis ekworo (26-30)

  • Chineke zitere nnụnụ kwel; a tara ndị Izrel ahụhụ maka anyaukwu (31-35)

11  Ndị Izrel malitere ime mkpesa n’ihu Jehova. Mgbe Jehova nụrụ ya, iwe were ya. Jehova wee zite ọkụ, ya amalite iregbu ụfọdụ ndị ná nsọtụ ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu. 2  Mgbe ha malitere ibesara Mosis ákwá, Mosis rịọsiri Jehova arịrịọ ike,+ ọkụ ahụ anyụọ. 3  A kpọziri ebe ahụ Tabera* maka na ọkụ Jehova zitere rere ha.+ 4  Ndị dị iche iche*+ ha na ha so wee nwewe akpịrị ogologo.+ Ndị Izrel malitekwara ibe ákwá, na-asị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa?+ 5  Anyị na-echeta azụ̀ anyị na-ata n’Ijipt n’efu, nakwa kukumba, wọtamelọn, lik, yabaasị, na galik!+ 6  Ma ugbu a, ike na-agwụzi anyị.* E nweghị ihe ọzọ anyị na-ahụ ma ọ́ bụghị mana a.”+ 7  Mana+ yiri mkpụrụ kọrịanda,+ ọ na-achakwa ka eso* deliọm. 8  Ndị Izrel na-agagharị kporo ya ma jiri nkume e ji egwe nri gwee ya ma ọ bụ sụọ ya n’ikwe, ha ejirizie ite e ji esi nri sie ya ma ọ bụ jiri ya mee achịcha dị okirikiri.+ Ọ na-atọ ka keeki dị ụtọ a gwara mmanụ. 9  Ọ na-abụ igirigi daa n’abalị n’ebe ha mara ụlọikwuu, mana adaakwa.+ 10  Mosis nụrụ ka ndị Izrel na-ebe ákwá n’ezinụlọ n’ezinụlọ, onye nke ọ bụla n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya. Ezigbo iwe were Jehova,+ ihe ahụ wutekwara Mosis. 11  Mosis wee sị Jehova: “Gịnị mere i ji emesi ohu gị ike? Gịnịkwa mere na ihe m amasịghị gị, i wee buru ibu mmadụ niile a bokwasị m?+ 12  Ọ̀ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ̀ bụ m mụrụ ha, nke mere i ji sị m, ‘Kuru ha n’obi gị otú onye na-elekọta nwa si eku nwa na-aṅụ ara,’ ka m wee kuba ha n’ala ị ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na ị ga-enye ha?+ 13  Olee ebe m ga-esi nweta anụ m ga-enye ndị a niile? N’ihi na ha na-ebesara m ákwá, sị, ‘Nye anyị anụ ka anyị taa!’ 14  Naanị m agaghị ebuli ibu mmadụ niile a. Ọ karịrị m akarị.+ 15  Ọ bụrụ otú a ka ị ga-esi na-emeso m, biko, gbuo m ozugbo.+ Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, ekwela ka m hụsikwuo anya.” 16  Jehova wee zaa Mosis, sị: “Si ná ndị okenye Izrel kpọkọtara m ụmụ nwoke iri asaa, ndị ị ma na ha bụ ndị okenye na ndị isi ndị Izrel.+ Kpọga ha n’ụlọikwuu nzute, meekwa ka gị na ha guzo n’ebe ahụ. 17  M ga-agbadata+ ma gwa gị okwu n’ebe ahụ.+ M ga-eweretụ mmụọ nsọ m+ dị n’ahụ́ gị nye ha. Ha ga-enyekwara gị aka n’ibu ibu ndị Izrel ka ị ghara ibu ya naanị gị.+ 18  Ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘Meenụ onwe unu ka unu dị nsọ maka echi+ n’ihi na unu ga-ata anụ, n’ihi na unu ebeela ákwá ná ntị Jehova,+ sị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa? Ihe dịịrị anyị mma n’Ijipt.”+ Jehova ga-enye unu anụ, unu ga-atakwa anụ.+ 19  Ọ bụghị naanị otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ ma ọ bụ ụbọchị ise ma ọ bụ ụbọchị iri ma ọ bụ ụbọchị iri abụọ ka unu ga-ata anụ, 20  kama unu ga-ataru ya otu ọnwa zuru ezu ruo mgbe ọ ga-apụta unu n’imi sọwa unu oyi,+ n’ihi na unu jụrụ Jehova, onye nọnyeere unu. Unu nọkwa na-ebe ákwá n’ihu ya, na-asị: “Gịnị mere anyị ji si n’Ijipt pụta?”’”+ 21  Mosis wee sị: “Ndị a mụ na ha nọ dị narị puku ụmụ nwoke isii (600,000)+ ndị ji ụkwụ aga, ma i kwuru, sị, ‘M ga-enye ha anụ. Ha ga-ataru ya otu ọnwa zuru ezu.’ 22  E gbuo ìgwè ewu na atụrụ na ìgwè ehi, ọ̀ ga-ezuru ha? Ma ọ bụ, e gbute azụ̀ niile dị na mmiri, ọ̀ ga-ezuru ha?” 23  Jehova gwara Mosis, sị: “Ihe a ọ̀ nyịrị Jehova?*+ Ugbu a, ị ga-ahụ ma ihe m kwuru ọ̀ ga-emezuru unu ka ọ̀ bụ na ọ gaghị emezu.” 24  Mosis wee pụọ gwa ha ihe Jehova kwuru. Ọ kpọkọtara ụmụ nwoke iri asaa n’ime ndị okenye Izrel wee mee ka ha guzo n’akụkụ ụlọikwuu ahụ.+ 25  Jehova wee gbadata n’ígwé ojii+ gwa ya okwu.+ O weretụụrụ mmụọ nsọ+ dị n’ahụ́ ya nye ndị okenye iri asaa ahụ. Ozugbo ha nwetara mmụọ nsọ ahụ, ha malitere ime ka ndị amụma.*+ Ma, ha emeghị ya ọzọ. 26  E nwere mmadụ abụọ n’ime ụmụ nwoke ahụ ka nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu. Aha ha bụ Eldad na Midad. Ha nwetara mmụọ nsọ maka na ha so ná ndị e dere aha ha n’akwụkwọ. Ma ha agabeghị n’ụlọikwuu.* Ha wee malite ime ka ndị amụma n’ebe ha mara ụlọikwuu. 27  Otu nwa okorobịa gbaara ọsọ gaa gwa Mosis, sị: “Eldad na Midad na-eme ka ndị amụma n’ebe anyị mara ụlọikwuu!” 28  Joshụa+ nwa Nọn, onye na-ejere Mosis ozi kemgbe ọ bụ okorobịa, kwuru, sị: “Onyenwe m Mosis, kwụsị ha ime otú ahụ.”+ 29  Ma Mosis sịrị ya: “Ị̀ na-ekwochitere m ekworo? Emela otú ahụ, n’ihi na ọ dị m ka ya bụrụ na ndị Jehova niile bụ ndị amụma nakwa na Jehova ga-enye ha mmụọ nsọ ya.” 30  Mgbe e mechara, Mosis gaghachiri n’ebe ha mara ụlọikwuu, ya na ndị okenye Izrel. 31  Jehova wee mee ka ifufe fewe. Ifufe ahụ si n’oké osimiri na-ebute nnụnụ kwel ma na-eme ka ha na-efedata n’ebe niile ndị Izrel mara ụlọikwuu.+ Ha fedatara ruo n’ebe ga-ewe otu ụbọchị iji garuo ya ná mpaghara niile, gbaa gburugburu ebe ha mara ụlọikwuu. Ha juru n’ala ruo ihe dị ka kubit* abụọ n’ịdị elu. 32  N’ihi ya, n’ehihie ụbọchị ahụ niile na n’abalị ya niile nakwa n’echi ya niile, ndị Izrel nọ na-anwụrụ nnụnụ kwel. E nweghị onye nwụtara nnụnụ kwel na-agaghị eju homa* iri. Ha nọ na-awụsara onwe ha nnụnụ ahụ gburugburu ebe niile ha mara ụlọikwuu.* 33  Ma mgbe ha ka kpụ anụ ahụ n’ọnụ, tupu ha ataa ya, Jehova wesara ha ezigbo iwe. Jehova wee gbuwe ọtụtụ n’ime ha.+ 34  Ha wee kpọọ ebe ahụ Kibrọt-hateeva,*+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ha liri ndị ahụ nwere akpịrị ogologo.+ 35  Ndị Izrel si na Kibrọt-hateeva kwaga Hazirọt. Ha wee nọrọ na Hazirọt.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Tabera pụtara “Nnukwu Ọkụ.”
O nwere ike ịbụ ndị na-abụghị ndị Izrel so ha.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “gọm.”
Na Hibru, “Aka Jehova ọ̀ dị mkpụmkpụ?”
Ma ọ bụ “malitere ibu amụma.”
Ya bụ, n’ụlọikwuu nzute.
Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Homa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu homa bụ lita 220. Gụọ B14.
O nwere ike ịbụ na ha nọ na-eme ihe a ka anụ nnụnụ ndị ahụ kpọọ.
Kibrọt-hateeva pụtara “Ebe E Liri Ndị Akpịrị Ogologo.”