Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Mgbe Ime Mpụ Ga-akwụsị?

Ò Nwere Mgbe Ime Mpụ Ga-akwụsị?

 Ọ bụrụ na ndị omempụ akpachaa arụ, anyị nwere ike ịjụwa, sị: ‘Ihe banyere anyị ọ̀ na-emetụkwa Chineke n’obi? Gịnị mere ihe ndị a ji eme? Ò nwere mgbe ime mpụ a ga-akwụsị? Olee ihe ga-enyere m aka n’ụjọ na-atụ m?’ Baịbụl zara ajụjụ ndị a nke ọma.

Olee otú obi na-adị Chineke maka mpụ ndị mmadụ na-eme?

 Chineke kpọrọ tigbuo zọgbuo na ime mpụ asị. (Abụ Ọma 11:5; Ilu 6:​16, 17) Jizọs, bụ́ onye nnọchite anya Chineke, bakwaara ndị na-eso ụzọ ya mba mgbe ha chọrọ ịlụso ndị ọzọ ọgụ. (Matiu 26:​50-52) Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị na-eme tigbuo zọgbuo na-ekwu na ha na-eme ya n’aha Chineke, mana ọ bụghị Chineke na-agwa ha mee ya. Ọ naghịdị ege ntị n’ekpere ha.​—Aịzaya 1:15.

 Chineke na-eche banyere ndị niile na-ata ahụhụ, ma ndị nke na-ata ahụhụ n’ihi ihe ndị omempụ mere ha. (Abụ Ọma 31:7; 1 Pita 5:7) Baịbụl gosikwara na Chineke ga-eme ka tigbuo zọgbuo kwụsị.​—Aịzaya 60:18.

Isi ihe na-akpata ime mpụ

 Baịbụl kwuru isi ihe na-akpata ime mpụ. Ọ sịrị: ‘Mmadụ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’ (Ekliziastis 8:9) Kemgbe ụwa, ndị ikike dị n’aka na-eji ike ha emekpọ ndị ọzọ ọnụ, ndị a na-emekpọ ọnụ na-ejikwanụ ime mpụ emegwara ihe e mere ha.​—Ekliziastis 7:7.

Otú ime mpụ ga-esi kwụsị

 Chineke kwere nkwa na ya ga-eme ka ụjọ na tigbuo zọgbuo kwụsị ma mee ka udo dị n’ụwa. (Aịzaya 32:18; Maịka 4:​3, 4) Chineke ga-ewepụ:

  •   Isi ihe na-akpata ime mpụ. Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ ma weta ọchịchị ya ka ọ chịwa ụwa niile. Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Eze nke ọchịchị Chineke. Ọ ga-achị mmadụ niile nke ọma, meekwa ka mmegbu na tigbuo zọgbuo kwụsị. (Abụ Ọma 72:​2, 14) N’oge ahụ, agaghịzi enwe ndị omempụ. Obi ga na-atọkwa ndị mmadụ “ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.”​—Abụ Ọma 37:​10, 11.

  •   Nsogbu niile ime mpụ kpatara. Chineke ga-ewepụrụ ụmụ mmadụ nsogbu niile ime mpụ kpataara ha, nakwa ụjọ nsogbu ndị ahụ kpataara ha. (Aịzaya 65:17; Mkpughe 21:​3, 4) O kwedịrị nkwa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, mee ka ha dịghachi ndụ n’ụwa nke udo ga-adị na ya.​—Jọn 5:​28, 29.

 Baịbụl kwuru ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji kweta na Chineke ga-eme ka ime mpụ kwụsị n’oge na-adịghị anya. Ma, i nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Gịnị mere na Chineke emebeghị ka ime mpụ kwụsị?’ Ị chọọ ịmata azịza ya, lee vidio bụ́ Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ahụhụ Dịrị?

a E kwuo banyere ime mpụ, ọtụtụ mgbe, ihe a na-ekwu bụ iji tigbuo zọgbuo ma ọ bụ iyi egwu emekpọ ndị mmadụ ọnụ, karịchaa ndị nkịtị. Ndị na-eme mpụ na-emekarị ya iji gbanwee ihe n’ọchịchị, n’okpukpe, ma ọ bụkwanụ n’ihe ọ bụla ọzọ. Ma, ihe otu onye weere na ọ bụ ime mpụ nwere ike ịdị iche n’ihe onye ọzọ weere na ọ bụ ime mpụ.