Aịzaya 60:1-22

  • Ebube Jehova na-enwu ka ìhè na Zayọn (1-22)

    • Ka nduru ndị feere na-aga n’akwụ́ ha (8)

    • A ga-eji ọlaedo dochie ọla kọpa (17)

    • Onye dị ntakịrị ga-aghọ otu puku mmadụ (22)

60  “Jeruselem,* bilie,+ mee ka ìhè nwuo, n’ihi na i nweela ìhè. Ebube Jehova na-enwu ka ìhè n’ahụ́ gị.+   Ọchịchịrị ga-ekpuchi ụwa. Oké ọchịchịrị ga-ekpuchikwa mba dị iche iche. Ma, Jehova ga-eme ka ìhè na-enwuru gị,Meekwa ka a hụ ebube ya n’ahụ́ gị.   Mba dị iche iche ga-aga ebe ìhè gị na-enwu.+ Ndị eze+ ga-agakwa ebe ìhè gị dị ebube na-enwu.+   Legharịa anya gburugburu gị. A kpọkọtala ha niile, ha ana-abịakwute gị. Ụmụ gị ndị nwoke si ebe dị anya na-abịa,+E kukwa ụmụ gị ndị nwaanyị n’akụkụ na-abịa.+   N’oge ahụ, ị ga-ahụ ihe a, ihu gị ga na-egbukekwa egbuke.+ Obi ga-atọ gị ụtọ, aṅụrị eju gị obi,N’ihi na akụ̀ dị n’oké osimiri ga-abịara gị. Akụ̀ mba dị iche iche ga-abịara gị.+   Ìgwè kamel ga-eju ebe niile n’ala gị,Ya bụ, kamel ndị si Midian na Ifa.+ Ndị niile si Shiba ga-abịa. Ha ga-ebu ọlaedo na frankinsens bịa. Ha ga-eto Jehova n’ihu ọha.+   A ga-achịkọta ìgwè atụrụ niile dị na Kida,+ kpụtara gị ha. Ebule ndị si Nebeyọt+ ga na-ejere gị ozi. Ha ga-abịa n’elu ebe ịchụàjà m. A ga-anabatakwa ha.+ M ga-achọkwa ụlọ m dị ebube* mma.+   Ole ndị bụ ndị a feere na-abịa ka ígwé ojii,Ka nduru ndị feere na-aga n’akwụ́ ha?*   Agwaetiti niile ga-eji m nwee olileanya.+ Ụgbọ mmiri ndị na-aga Tashish ga-anọ n’ihuMa e bulatawa ma ụmụ gị ndị nọ ebe dị anya+Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha,N’ihi aha Jehova bụ́ Chineke gị na Onye Nsọ Izrel,Chineke ga-eme ka ị dị ebube.*+ 10  Ndị mba ọzọ ga-arụ mgbidi gị. Ndị eze ha ga na-ejekwara gị ozi.+ M ji iwe tie gị ihe. Ma, m ga-emere gị ebere n’ihi amara m.+ 11  A ga-eghewe ọnụ ụzọ ámá gị niile oghe mgbe niile.+ A gaghị emechi ha emechi, ma n’ehihie ma n’abalị,Ka e wee na-ebutere gị akụ̀ mba dị iche iche,Ndị eze ha ga-ebutekwa ụzọ.+ 12  Mba ọ bụla na alaeze ọ bụla na-agaghị ejere gị ozi ga-ala n’iyi. A ga-alakwa mba ndị ahụ n’iyi kpamkpam.+ 13  A ga-ebutere gị ihe ndị mere ka Lebanọn dị ebube,+Ya bụ, osisi junipa, osisi ash, na osisi saịpres. A ga-ebutere gị ha otu mgbe+Ka e jiri ha chọọ ụlọ nsọ m mma. M ga-emekwa ka ebe m gbakwasịrị ụkwụ dị ebube.+ 14  Ụmụ ndị na-emekpa gị ahụ́ ga-abịakwute gị, kpọọrọ gị isiala. Ndị niile na-elelị gị ga-ehulata ala n’ọbụ ụkwụ gị. Ha ga-akpọkwa gị obodo Jehova,Zayọn nke Onye Nsọ Izrel.+ 15  Ọ bụ eziokwu na m hapụrụ gị, ndị mmadụ akpọọ gị asị, e nweghịkwa onye na-esi na gị agafe,+Ma, m ga-eme ka ị bụrụ ihe e ji anya isi ruo mgbe ebighị ebi,Meekwa ka ị bụrụ ihe e ji maka ya aṅụrị ọṅụ n’ọgbọ niile.+ 16  Ị ga-aṅụ ara mba dị iche iche.+ Ị ga-aṅụkwa ara ndị eze.+ Ị ga-ama na mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Onye Nzọpụta gị,Nakwa na Dike na-enyere Jekọb aka bụ Onye Mgbapụta gị.+ 17  M ga-eweta ọlaedo jiri ya dochie ọla kọpa. M ga-ewetakwa ọlaọcha jiri ya dochie ígwè. M ga-eji ọla kọpa dochie osisi,Jirikwa ígwè dochie nkume. M ga-eme ka udo bụrụ onye nlekọta gị,Meekwa ka ezi omume bụrụ onye na-ekenye gị ọrụ.+ 18  A gaghịzi anụ gbasara tigbuo zọgbuo n’ala gị. E nweghịzikwa ebe a ga-anụ gbasara imebisị ihe ndị mmadụ na ibibi ihe ndị mmadụ n’ala gị.+ Ị ga-akpọ mgbidi gị Nzọpụta,+ kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị Otuto. 19  N’ihi na anyanwụ agaghịzi abụrụ gị ìhè n’ehihie. Ọnwa na-eti gbaa agaghịkwa enye gị ìhè n’abalị. Jehova ga-aghọrọ gị ìhè na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Chineke gị ga-achọkwa gị mma.+ 20  Anyanwụ gị agaghịzi ada ada. Ọnwa gị agaghịzi ala ala,N’ihi na Jehova ga-aghọrọ gị ìhè na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Ị ga-akwụsịkwa iru uju.+ 21  Ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume. Ha ga-enweta ala a ruo mgbe ebighị ebi. Ha bụ ome mkpụrụ m kụrụ,Ihe m ji aka m kụọ+ ka e jiri maka ya na-eto m.+ 22  Onye dị ntakịrị ga-aghọ otu puku mmadụ. Onye dị obere ga-aghọkwa mba dị ike. Mụnwa, bụ́ Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nwaanyị.”
Ma ọ bụ “ụlọ m mara mma.”
Ma ọ bụ “n’oghere ụlọ ha.”
Ma ọ bụ “ga-achọ gị mma.”