Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 24

Olee Ihe Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi?

Olee Ihe Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi?

Jehova chọrọ ka anyị mara gbasara ezinụlọ ya dị n’eluigwe. Ndị mmụọ ozi so ná ndị ezinụlọ ya. Baịbụl kpọrọ ha “ụmụ Chineke.” (Job 38:7) Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ndị mmụọ ozi? Olee ihe ndị mmụọ ozi na-eme? Ọ̀ bụ ndị mmụọ ozi niile so n’ezinụlọ Chineke?

1. Ole ndị bụ ndị mmụọ ozi?

Jehova kere ndị mmụọ ozi tupu ya ekee ụwa. Anyị anaghị ahụ ha anya otú ahụ anyị na-anaghị ahụ Chineke. Ha bikwa n’eluigwe. (Ndị Hibru 1:​14) E nwere nde kwuru nde ndị mmụọ ozi, nke ọ bụla n’ime ha dịkwa iche n’ibe ya. (Mkpughe 5:​11) Ha “na-erubere [Jehova] isi ma na-eme ihe o kwuru.” (Abụ Ọma 103:20) N’oge ochie, Jehova na-edunye ndị mmụọ ozi ya mgbe ụfọdụ ka ha zie ndị ya ozi, nyere ha aka, ma ọ bụ napụta ha ná nsogbu. N’oge a, ndị mmụọ ozi na-eduga Ndị Kraịst na nke ndị chọrọ ịmụ gbasara Chineke.

2. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, hà bụ ole ndị?

Ndị mmụọ ozi ụfọdụ nupụụrụ Jehova isi. Onye nke mbụ n’ime ha bụ “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa niile.” (Mkpughe 12:9) Setan chọrọ ka ọ bụrụ ya ga na-achị ndị ọzọ, n’ihi ya, o mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi, mechaakwa mee ka ndị mmụọ ozi ndị ọzọ nupụrụ Chineke isi. A na-akpọ ndị mmụọ ozi ahụ ndị mmụọ ọjọọ. Jehova si n’eluigwe chụdata ha n’ụwa. A ga-emechakwa bibie ha.​—Gụọ Mkpughe 12:​9, 12.

3. Olee otú Setan na ndị mmụọ ọjọọ si anwa iduhie anyị?

Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-eji mgbaasị eduhie ndị mmadụ. Mgbaasị bụ mmadụ ịgba mbọ ka ya na ndị mmụọ ọjọọ na-ekwurịta okwu. Omume a jọgburu onwe ya. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-aga ajụ ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu na ndị dibịa afa ase. Ndị ọzọ na-agakwuru ndị mmụọ ọjọọ ka ha gwọọ ha ọrịa. Ekwensu na-eduhie ndị mmadụ ha echee na ha nwere ike ịgwa ndị nwụrụ anwụ okwu. Ma, Jehova dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Unu agakwurula ndị na-agba afa. Unu ajụkwala ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ase.” (Levitikọs 19:31) Ọ gwara anyị ihe a ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ghara inweta anyị. Ha bụ ndị iro Chineke. Mkpa ha bụkwa imesi anyị ike.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe ọma ndị mmụọ ozi na-eme, ihe mere na ime mgbaasị adịghị mma, nakwa ihe anyị ga-eme ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ghara inweta anyị.

4. Ndị mmụọ ozi na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta gbasara Jehova

Ndị mmụọ ozi Chineke anaghị ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ma, ha nwere ike iduga ndị ohu Chineke na nke ndị chọrọ ịnụ Okwu ya. Gụọnụ Mkpughe 14:​6, 7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị mmụọ ozi nyere anyị aka n’ozi ọma anyị na-ekwusa?

  • Obi ọ̀ dị gị ụtọ ugbu a ị mụtara na ndị mmụọ ozi nwere ike iduga gị na nke ndị chọrọ ịnụ ihe Baịbụl na-ekwu? Maka gịnị?

5. Emela mgbaasị

Setan na ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị iro Jehova. Ha bụkwa ndị iro anyị. Gụọnụ Luk 9:​38-​42. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ndị mmụọ ọjọọ si emeso ndị mmadụ?

Anyị ekwesịghị ime ihe ga-eme ka anyị na ndị mmụọ ọjọọ mekọrịtawa ihe. Gụọnụ Diuterọnọmi 18:​10-​12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe ndị mmụọ ọjọọ na-achọ ka anyị mee nke ga-eme ka anyị na ha na-emekọrịta ihe? Olee otú ndị mmadụ si eme mgbaasị ebe i bi?

  • Ọ̀ dị gị mma na Jehova gwara anyị ka anyị ghara ịna-eme mgbaasị? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ì chere na ihe ahụ nwa Palesa gba n’aka nwere ihe o mere? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

  • Gịnị ka Palesa kwesịrị ime ka ya na ndị mmụọ ọjọọ ghara ịna-emekọrịta ihe?

Kemgbe ụwa, ezigbo Ndị Kraịst anaghị enye ndị mmụọ ọjọọ ohere. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 19:19 na 1 Ndị Kọrịnt 10:21. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere o ji dị mma ka i bibie ihe ọ bụla i nwere nke nwere ike ime ka i tinye aka na mgbaasị?

6. Merie Setan na ndị mmụọ ọjọọ

Ọ bụ Setan na-achị ndị mmụọ ọjọọ. Ma, ọ bụ Maịkel, onyeisi ndị mmụọ ozi, na-edu ndị mmụọ ozi Chineke. Maịkel bụ aha ọzọ a na-akpọ Jizọs. Olee otú ike Maịkel hà? Gụọnụ Mkpughe 12:​7-9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Maịkel na ndị mmụọ ozi ya nakwa Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, olee ndị ka ike?

  • Ì chere na ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịna-atụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ụjọ?

I nwere ike imeri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. Gụọnụ Jems 4:7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe anyị ga-eme ka anyị na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ghara ịna-emekọrịta ihe?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ọ dịghị njọ ma mmadụ na-egwu egwuregwu vidio gbasara mgbaasị ma ọ bụ na-ekiri fim a na-eme mgbaasị na ya, n’ihi na ha bụ naanị ihe mmadụ ji eme onwe ya obi ụtọ.

  • Gịnị mere na ọ dịghị mma mmadụ iche ụdị ihe a?

NCHỊKỌTA

Ndị mmụọ ozi na-enyere anyị aka. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya bụ ndị iro Jehova, ha na-ejikwa mgbaasị eduhie ndị mmadụ.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú ndị mmụọ ozi Jehova si enyere ndị mmadụ aka ịmụta gbasara ya?

  • Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, hà bụ ole ndị?

  • Gịnị mere ị ga-eji gbaara ime mgbaasị ọsọ?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Gụọ isiokwu a ka ị hụ ihe mere anyị ji kwuo na ọ bụ Jizọs bụ Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi.

“Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta ihe na-egosi na Ekwensu bụ onye dị adị.

“Ekwensu Ọ̀ Dị Adị n’Eziokwu?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta ihe otu nwaanyị mere nke mere ka ndị mmụọ ọjọọ hapụ ya aka.

“Ọ Chọtara Nzube ná Ndụ” (Ụlọ Nche, Julaị 1, 1993)