Ozi Ọma Luk Dere 9:1-62

  • Jizọs nyere ndịozi ya iri na abụọ ntụziaka gbasara ikwusa ozi ọma (1-6)

  • Ihe gbasara Jizọs gbara Herọd gharịị (7-9)

  • Jizọs nyere puku ụmụ nwoke ise nri (10-17)

  • Pita kwuru na Jizọs bụ Kraịst (18-20)

  • Jizọs kwuru na a ga-egbu ya (21, 22)

  • Ihe e ji ama ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs (23-27)

  • Jizọs nwoghara (28-36)

  • Jizọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ nke ji otu nwatakịrị nwoke (37-43a)

  • Jizọs kwukwara ọzọ na a ga-egbu ya (43b-45)

  • Ndị na-eso ụzọ Jizọs na-azọ onye kacha ukwuu n’ime ha (46-48)

  • Onye ọ bụla na-anaghị emegide anyị dịnyeere anyị (49, 50)

  • Otu obodo nke dị na Sameria anabataghị Jizọs (51-56)

  • Otú e si eso ụzọ Jizọs (57-62)

9  O wee kpọkọta ndịozi ya iri na abụọ, nye ha ikike ịgwọ ọrịa+ na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ niile.+  O zipụkwara ha ka ha gaa kwusaa gbasara Alaeze Chineke ma gwọọ ọrịa.  Ọ gwakwara ha, sị: “Unu ewerela ihe ọ bụla maka njem a. Unu ejila mkpara ma ọ bụ obere akpa nri, ma ọ bụ achịcha ma ọ bụ ego.* Unu achịkwala uwe abụọ.*+  Kama n’ụlọ ọ bụla unu banyere, nọrọnụ ebe ahụ ruo mgbe unu ga-apụ.+  N’obodo ọ bụla ndị mmadụ na-anabataghịkwa unu, mgbe unu si na ya na-apụ, tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu ka ọ bụụrụ ha ihe àmà.”+  Ha wee gaa n’obodo niile, na-ezisa ozi ọma, na-agwọkwa ọrịa ebe niile.+  Herọd* onye na-achị ógbè ahụ wee nụ ihe niile na-emenụ. Ihe a niile gbakwara ya gharịị n’ihi na ụfọdụ nọ na-asị na a kpọlitela Jọn n’ọnwụ.+  Ma ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ndị ọzọ ana-asịkwa na otu n’ime ndị amụma oge ochie esila n’ọnwụ bilie.+  Herọd sịrị: “Ọ bụ m gbupụrụ Jọn isi.+ Ònyezi bụ onye a m na-anụ ọtụtụ ihe gbasara ya?” N’ihi ya, ọ nọ na-achọsi ike ịhụ onye ọ bụ.+ 10  Mgbe ndịozi ahụ lọtara, ha kọọrọ Jizọs ihe niile ha mere.+ O wee kpọrọ ha gaa ebe naanị ha ga-anọ n’obodo a na-akpọ Betsaịda.+ 11  Ma mgbe ìgwè mmadụ ahụ matara, ha chọọrọ ya gawa. Ọ nabatakwara ha nke ọma, malite ịgwa ha gbasara Alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị ahụ́ na-adịghị.+ 12  Mgbe chi jiwere, ndịozi ya iri na abụọ bịara sị ya: “Gwa ìgwè mmadụ a ka ha lawa, ka ha gaa n’ime obodo nakwa n’obodo nta ndị dị gburugburu ebe a chọta ebe ha ga-ehi na ihe ha ga-eri, n’ihi na ndị mmadụ anaghị anọkarị ebe a anyị nọ.”+ 13  Ma ọ sịrị ha: “Nyenụ ha nri ka ha rie.”+ Ha asị: “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ka anyị nwere. Oleekwa otú anyị ga-esi azụta ihe mmadụ niile a ga-eri?” 14  N’eziokwu, ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise nọ ebe ahụ. Ma ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Hazienụ ha n’ìgwè n’ìgwè, ka ha nọdụkwa ala, ihe dị ka mmadụ iri ise mmadụ iri ise.” 15  Ha wee hazie ha otú ahụ, ha niile anọdụkwa ala. 16  O wee were ogbe achịcha ise ahụ na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe kpee ekpere.* O wee nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha nye ìgwè mmadụ ahụ. 17  Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha atụtụkọta ihe ha rifọrọ, ya eju nkata iri na abụọ.+ 18  E mechaa, mgbe naanị ya nọ na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, ya ajụọ ha, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”+ 19  Ha asị: “Jọn Onye Na-eme Baptizim. Ma ndị ọzọ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa na-asị na otu n’ime ndị amụma oge ochie esila n’ọnwụ bilie.”+ 20  Ya asị ha: “Ma, ònye ka ununwa chere na m bụ?” Pita asị: “Kraịst nke Chineke.”+ 21  O wee gwasie ha ike ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla ihe a.+ 22  Ma ọ sịrị ha: “Nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ, ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ajụkwa ya, a ga-egbukwa ya.+ N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.”+ 23  O wee gwa mmadụ niile, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya+ ma buru osisi ịta ahụhụ* ya kwa ụbọchị na-eso m.+ 24  N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta ndụ* ya ga-atụfu ya, ma onye ọ bụla nke tụfuru ndụ* ya n’ihi m ga-azọpụta ya.+ 25  N’eziokwu, olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ ya ma ọ bụ merụọ onwe ya ahụ́?+ 26  N’ihi na onye ọ bụla ihere ịbụ onye na-eso ụzọ m na ihere okwu m na-eme, ihere onye ahụ ga-eme Nwa nke mmadụ mgbe ọ ga-abịa n’ebube ya na n’ebube Nna ya nakwa nke ndị mmụọ ozi dị nsọ.+ 27  Ma n’eziokwu, ana m asị unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo ebe a na-agaghị anwụ ruo mgbe ha bu ụzọ hụ Alaeze Chineke.”+ 28  N’eziokwu, ihe dị ka ụbọchị asatọ o kwuchara ihe ndị a, ọ kpọọrọ Pita, Jọn, na Jems gbagoo n’ugwu ka o kpee ekpere.+ 29  Ka ọ nọkwa na-ekpe ekpere, ihu ya gbanwere, uwe ya ana-enwukwa gbaa. 30  Ya na ụmụ nwoke abụọ nọkwa na-akparịta ụka. Ha bụ Mosis na Ịlaịja. 31  Ndị a pụtara ìhè n’ebube ma malite ikwu gbasara otú Jizọs ga-esi si n’ụwa laa, nke ga-eme na Jeruselem.+ 32  Ma ụra buuru Pita na ndị ya na ha nọ. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube Jizọs,+ hụkwa ụmụ nwoke abụọ ahụ ha na ya guzo. 33  Mgbe ụmụ nwoke abụọ ahụ si ebe ọ nọ na-apụ, Pita sịrị Jizọs: “Onye Ozizi, ọ dị mma na anyị nọ ebe a. N’ihi ya, ka anyị maa ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Ịlaịja.” Ma ọ maghị ihe ọ na-ekwu. 34  Ma ka ọ na-ekwu ihe ndị a, ígwé ojii malitere ikpuchi ha. Ka ha banyere n’ígwé ojii ahụ, ụjọ tụwara ha. 35  Otu olu+ sikwa n’ígwé ojii ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họọrọ.+ Geenụ ya ntị.”+ 36  Mgbe olu ahụ nọ na-ekwu okwu, ha hụziri naanị Jizọs. Ma n’oge ahụ, ha akọrọghị onye ọ bụla ihe ha hụrụ.+ 37  N’echi ya, mgbe ha si n’ugwu ahụ gbadata, ìgwè mmadụ zutere ya.+ 38  Ma, otu nwoke nke so n’ìgwè mmadụ ahụ tiri mkpu, sị: “Onye Ozizi, biko, nyere nwa m nwoke aka,* n’ihi na ọ bụ naanị ya ka m mụrụ.+ 39  Ma, mmụọ ọjọọ na-enye ya nsogbu. Ọ na-abụ ya nọkata, ya etiwe mkpu. Ihe ọdụdọ na-adọkwa ya, ya ana-agbọ ụfụfụ n’ọnụ. Ọ na-esikwara ya ike ịhapụ ya ma o merụchaa ya ahụ́. 40  Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike ịchụpụ ya.” 41  Jizọs asị ya: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke rụkwara arụ,+ ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ tupu unu enwee okwukwe? Ruo ole mgbe ka m ga na-edi ihe unu na-eme? Kpọta nwa gị ebe a.”+ 42  Ma ka nwa ahụ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kụrụ ya n’ala, meekwa ka ihe ọdụdọ dọsie ya ike. Ma, Jizọs baara mmụọ ọjọọ ahụ* mba ma gwọọ nwatakịrị nwoke ahụ, kpọnyekwa ya nna ya. 43  Ma, ike dị ebube Chineke nwere tụrụ ha niile n’anya. Ka ihe niile Jizọs na-eme nọ na-atụ ha niile n’anya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: 44  “Geenụ ntị nke ọma, chetakwanụ ihe a, na a ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ.”+ 45  Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-ekwu. N’eziokwu, e zochiiri ha ya ka ha ghara ịghọta ya, egwu ekweghịkwa ha ịjụ ya ajụjụ gbasara okwu a. 46  Ha wee malite ise okwu, na-azọ onye ọ bụ ya kacha ukwuu n’ime ha.+ 47  Ebe Jizọs ma ihe ha na-eche n’obi ha, ọ kpọrọ otu nwatakịrị, gwa ya ka o guzoro n’akụkụ ya, 48  wee sị ha: “Onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị a n’aha m na-anabatakwa m. Onye ọ bụla nke na-anabata m na-anabatakwa onye zitere m.+ N’ihi na onye na-eme onwe ya ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.”+ 49  Jọn wee sị: “Onye Ozizi, anyị hụrụ onye ji aha gị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, anyị gbalịkwara igbochi ya n’ihi na ọ naghị eso anyị.”+ 50  Ma Jizọs sịrị ya: “Unu anwala igbochi ya, n’ihi na onye na-anaghị emegide unu dịnyeere unu.” 51  Mgbe ụbọchị Jizọs ga-alaghachi eluigwe ruwere nso,+ o kpebisiri ike ịga Jeruselem. 52  N’ihi ya, o zipụrụ ndị ozi ka ha buru ya ụzọ gawa. Ha wee gawa ma banye n’otu obodo nke dị na Sameria, ịga kwadebere ya ihe. 53  Ma ha anabataghị ya,+ n’ihi na o kpebiri ịga Jeruselem. 54  Mgbe Jems na Jọn, bụ́ ndị na-eso ụzọ ya,+ hụrụ ihe merenụ, ha sịrị: “Onyenwe anyị, ị̀ chọrọ ka anyị kwuo ka ọkụ si n’eluigwe daa laa ha n’iyi?”+ 55  Ma ọ tụgharịrị baara ha mba. 56  Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya wee gawa obodo ọzọ. 57  Ma ka ha na-aga n’ụzọ, otu onye sịrị ya: “M ga-eso gị jee ebe ọ bụla ị na-eje.” 58  Jizọs wee sị ya: “Nkịta ọhịa nwere ọgba, nnụnụ nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ na-atọgbọ isi ya.”+ 59  O wee gwa onye ọzọ, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” Nwoke ahụ asị ya: “Onyenwe anyị, hapụ m ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”+ 60  Ma ọ sịrị ya: “Hapụ ndị nwụrụ anwụ+ ka ha lie ndị ha nwụrụ anwụ, ma gaa kwusaa Alaeze Chineke n’ebe niile.”+ 61  Onye ọzọ sịkwara: “M ga-eso gị, Onyenwe anyị. Ma hapụgodị m ka m sị ndị ezinụlọ m ka e mesịa.” 62  Jizọs sịrị ya: “O nweghị onye jidere aka n’ọ́gụ̀ ma na-ele anya n’ihe ndị dị n’azụ+ nke kwesịrị iketa Alaeze Chineke.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ọlaọcha.”
Ma ọ bụ “uwe ọzọ.”
Ya bụ, Herọd Antipas. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “gọzie ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Grik, “lee nwa m nwoke anya.”
Na Grik, “mmụọ ahụ na-adịghị ọcha.”