Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 26

Gịnị Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme, Ndị Mmadụ Ana-atakwa Ahụhụ?

Gịnị Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme, Ndị Mmadụ Ana-atakwa Ahụhụ?

E nwee ọdachị, ihe a na-ajụkarị bụ: “Gịnị mere ihe a ji mee?” Obi dị anyị ụtọ na Baịbụl zara ajụjụ a otú doro anya.

1. Olee otú Setan si mee ka ihe ọjọọ malite ime n’ụwa?

Setan bụ́ Ekwensu nupụụrụ Chineke isi. Ọ chọkwara ịna-achị ndị ọzọ. N’ihi ya, o mere ka mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, soro ya nupụrụ Chineke isi. Otú o si mee ya bụ na ọ ghaara Iv ụgha. (Jenesis 3:1-5) O mere ka Iv chewe na e nwere ihe dị mma Jehova na-achọghị ka o nweta. Ihe Setan na-ekwu bụ na ndị mmadụ ga-aka enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha anaghị erubere Chineke isi. Ọ bụ Setan bụ onye mbụ ghara ụgha. Ọ gwara Iv na ọ gaghị anwụ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ọ bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.”​—Jọn 8:44.

2. Gịnị ka Adam na Iv kpachaara anya mee?

Jehova nyere Adam na Iv ihe niile ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ. Ọ gwara ha na ha nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ogige Iden, ma e wezụga otu. (Jenesis 2:15-​17) Ma, ha kpachaara anya rie mkpụrụ osisi ahụ a gwara ha erila. Baịbụl kwuru na Iv ‘ghọọrọ mkpụrụ ya rie,’ mechaakwa nye Adam “ya erie.” (Jenesis 3:6) Otú a ka ha abụọ si nupụrụ Chineke isi. Ebe ọ bụ na Adam na Iv zuru okè, ime ihe ọjọọ anaghị agụ ha agụụ, ihe na-agụ ha bụ ime ihe dị mma. Ma, ha kpachaara anya nupụrụ Chineke isi. Ha si otú a mehie ya, gosikwa na ha achọghị ka ọ bụrụ ya ga na-achị ha. Ihe a ha mere mere ka ha malite ịta ezigbo ahụhụ.​—Jenesis 3:16-19.

3. Olee otú ihe Adam na Iv mere si gbasa anyị?

Mgbe Adam na Iv mehiechara, ha ghọrọ ndị na-ezughị okè. Ha bufeere ụmụ ha niile ezughị okè. Baịbụl kwuru otú ihe Adam mere si gbasa anyị. Ọ sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee gbasaa ruo mmadụ niile.”​—Ndị Rom 5:12.

O nwere ihe dị iche iche mere anyị ji ata ahụhụ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-ata ahụhụ n’ihi ihe na-adịghị mma anyị mere. Anyị na-atakwa ahụhụ mgbe ụfọdụ n’ihi ihe na-adịghị mma ndị ọzọ mere. E nwekwara oge ụfọdụ anyị na-ata ahụhụ n’ihi na anyị nọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị.​—Gụọ Ekliziastis 9:11.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe mere na ọ bụghị Chineke na-akpata ma ahụhụ ndị mmadụ na-ata ma ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa taa. Chọpụtakwa otú obi na-adị Chineke mgbe anyị na-ata ahụhụ.

4. Onye na-akpata ahụhụ anyị na-ata

Ọtụtụ ndị na-eche na ọ bụ Chineke na-achị ụwa a. Ihe a ha na-eche ọ̀ bụ eziokwu? Kpọnyenụ VIDIO a.

Gụọnụ Jems 1:13 na 1 Jọn 5:19. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ma ahụhụ ndị mmadụ na-ata ma ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa?

5. Otú ihe si kwụrụ kemgbe Setan chịwara

Gụọnụ Jenesis 3:1-6. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ụgha Setan ghara?​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 4 na nke 5.

  • Olee otú Setan si kwuo na Jehova achọghị ka ụmụ mmadụ nweta ihe dị mma?

  • Gịnị ka Setan kwuru nke pụtara na ndị mmadụ ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị Jehova na-achị ha?

Gụọnụ Ekliziastis 8:9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • N’oge a niile ọ na-abụghị Jehova na-achị ndị mmadụ, olee otú ihe si kwụrụ n’ụwa?

  1. A. Mgbe Chineke kere Adam na Iv, ha zuru okè, birikwa na Paradaịs. Ma, ha gere Setan ntị ma nupụrụ Jehova isi

  2. B. Mgbe ha nupụchaara Chineke isi, mmehie, ahụhụ, na ọnwụ juziri ebe niile n’ụwa

  3. CH. Jehova ga-akwụsị mmehie, ahụhụ, na ọnwụ. Ụmụ mmadụ ga-ezu okè ọzọ ma biri na Paradaịs

6. Ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Jehova n’obi

Ahụhụ anyị na-ata ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi? Chegodị gbasara ihe Eze Devid na Pita onyeozi dere. Gụọnụ Abụ Ọma 31:7 na 1 Pita 5:7. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú obi dị gị ịmata na Jehova na-ahụ ahụhụ anyị na-ata nakwa na ọ na-emetụ ya n’obi?

7. Chineke ga-akwụsị ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata

Gụọnụ Aịzaya 65:17 na Mkpughe 21:3, 4. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Jehova kwere nkwa na ọ ga-emezi ihe niile ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata kpatara. Gịnị mere nkwa a ji akasi gị obi?

Ị̀ ma ihe a?

Mgbe Setan ghara ụgha mbụ, o kwutọrọ Jehova, ya bụ, o mebiri aha ya. Ihe o kwuru pụtara na Jehova anaghị ekpe ikpe ziri ezi nakwa na ọ kpọrọ ndị ọ na-achị asị. Jehova ga-eme ka a kwụsị imebi aha ya n’oge na-adịghị anya mgbe ọ ga-emezi ihe niile ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata kpatara. E nwere ike ikwu na ọ ga-​eme ka onye ọ bụla mara na e nweghị ọchịchị ka nke ya mma. Ime ka a kwụsị imebi aha Jehova so n’ihe kacha mkpa a ga-eme ma n’eluigwe ma n’ụwa.​—Matiu 6:9, 10.

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ahụhụ anyị na-ata bụ uche Chineke.

  • Gịnị ka ị ga-agwa onye kwuru ụdị ihe a?

NCHỊKỌTA

Ọ bụ ihe Setan bụ́ Ekwensu na Adam na Iv mere kacha akpata ihe ọjọọ na-eme n’ụwa taa. Ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Jehova n’obi, ọ ga-akwụsịkwa ya n’oge na-adịghị anya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee ụgha Setan bụ́ Ekwensu ghaara Iv?

  • Olee otú isi Adam na Iv nupụrụ si gbasa anyị?

  • Olee otú anyị si mara na ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Jehova n’obi?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe Baịbụl kwuru na mmehie bụ.

“Gịnị Bụ Mmehie?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Gụọ isiokwu a ka ị hụ otú e si kọwakwuo ihe Setan bụ́ Ekwensu kwuru n’ogige Iden.

“Gịnị Mere Chineke Ji Hapụ Ụmụ Mmadụ Ka Ha Na-ata Ahụhụ?” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 1, 2014)

Chọpụta ihe otu nwoke mụtara gbasara ahụhụ ndị ezinụlọ ha na-ata.

Anọghịzi M Naanị M (5:09)