Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 21

Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?

Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?

N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eji Alaeze ya wepụ nsogbu niile na-echi anyị ọnụ n’ala. Mmadụ niile kwesịrị ịnụ ozi ọma a na-eme obi ụtọ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaara mmadụ niile ozi ọma a. (Matiu 28:​19, 20) Olee otú Ndịàmà Jehova si eme ihe a Jizọs kwuru?

1. Olee otú ihe e kwuru na Matiu 24:14 si na-emezu taa?

Jizọs buru amụma, sị: ‘A ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa.’ (Matiu 24:14) Obi dị Ndịàmà Jehova ụtọ na ha na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma. Anyị na-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile n’ihe karịrị otu puku asụsụ. E kwesịrị ịgbasi mbọ ike n’ọrụ a na-abụghị obere ọrụ. E kwesịkwara ịhazi ya nke ọma. E nweghị otú anyị ga-esi rụọ ya ma ọ bụrụ na Jehova anaghị enyere anyị aka.

2. Olee mbọ ndị anyị na-agba ka anyị nwee ike izi ndị mmadụ ozi ọma?

Anyị na-aga ebe ọ bụla anyị ga-ahụ ndị mmadụ zie ha ozi ọma. Anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma “n’ụlọ n’ụlọ” otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere. (Ọrụ Ndịozi 5:​42) Otú a a haziri ahazi anyị si ezi ozi ọma na-eme ka anyị nwee ike izi ọtụtụ nde mmadụ ozi ọma n’afọ ọ bụla. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ anaghị anọ n’ụlọ mgbe niile, anyị na-aga n’ebe ha na-anọkarị zie ha ozi ọma. Anyị na-achọ oge ọ bụla dabara adaba anyị ga-eji gwa ndị mmadụ gbasara Jehova na ihe ndị ọ chọrọ ime.

3. Ònye kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma?

Onye ọ bụla bụ́ ezigbo Onye Kraịst kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma. Anyị ejighị ikwusa ozi ọma egwu egwu. Anyị na-ekwusa ozi ọma a ruo otú ọnọdụ anyị kwere anyị, n’ihi na anyị ma na o nwere ike ịzọ ndị mmadụ ndụ. (Gụọ 1 Timoti 4:​16.) A naghị akwụ anyị ụgwọ maka ozi ọma a anyị na-ekwusa, n’ihi na Baịbụl sịrị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:​7, 8) Ọ bụghị mmadụ niile na-ege ntị ma anyị ziwe ha ozi ọma. Ma, anyị anaghị akwụsị ikwusa ozi ọma n’ihi na anyị ma na o so n’otú anyị si efe Jehova, ọ na-emekwa ya obi ụtọ.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo mbọ dị iche iche Ndịàmà Jehova na-agba ka ha nwee ike ikwusara ndị mmadụ ozi ọma n’ụwa niile. Chọpụtakwa otú Jehova si enyere anyị aka.

4. Anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị zie mmadụ niile ozi ọma

  • Gịnị masịrị gị n’ụdị mbọ Ndịàmà Jehova na-agba ka ha zie ndị mmadụ ozi ọma?

Gụọnụ Matiu 22:39 na Ndị Rom 10:​13-​15. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya?

  • Olee otú i chere obi na-adị Jehova ma ọ hụ ndị na-ekwusa ozi ọma? ​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 15.

5. Anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ

E nwere ọtụtụ akụkọ na-egosi na ọ bụ Jehova na-eduzi ozi ọma a anyị na-ekwusa. Dị ka ihe atụ, na Niu Ziland, mgbe otu nwanna nwoke aha ya bụ Paul nọ na-ekwusa ozi ọma n’otu ehihie, ọ hụrụ otu nwaanyị. Mgbe nwaanyị ahụ nọ na-ekpe ekpere n’ụtụtụ ụbọchị ahụ, ọ kpọrọ Chineke aha ya bụ́ Jehova ma rịọ ya ka o mee ka mmadụ bịa zie ya ozi ọma. Paul kwuru, sị: “Awa atọ o kpechara ekpere a, m bịara n’ụlọ ya.”

Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 3:9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ihe ndị mere eme, dị ka nke a mere na Niu Ziland, si egosi na ọ bụ Jehova na-eduzi ozi ọma a anyị na-ekwusa?

Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 1:8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị ebe anyị ji azụ aga n’ozi ọma anyị na-ekwusa ma ọ bụrụ na Jehova anaghị enyere anyị aka?

Ị̀ ma ihe a?

Anyị gaa ọmụmụ ihe n’etiti izu ọ bụla, a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma. Ọ bụru na e nwetụla mgbe ị bịara ọmụmụ ihe anyị a, olee ihe i chere gbasara otú e si akụziri anyị ikwusa ozi ọma?

6. Anyị na-erube isi n’iwu Chineke nyere anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma

N’oge Ndị Kraịst oge mbụ, ndị mmadụ nọ na-anwa ka ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsị ikwusa ozi ọma. Ndị Kraịst oge mbụ a gbasiri mbọ ike ka ha ghara ịkwụsị ikwusa ozi ọma. Ha gbalịrị “iji ihe iwu kwuru kwado izisa ozi ọma.” (Ndị Filipaị 1:7) Ndịàmà Jehova na-emekwa otú ahụ n’oge a. a

Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 5:​27-​42. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere Ndịàmà Jehova ji aga n’ụlọ n’ụlọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

NCHỊKỌTA

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa ebe niile n’ụwa kwusaa ozi ọma. Jehova na-enyere anyị aka n’ozi ọma anyị na-ekwusa.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú e si ekwusa ozi ọma n’ụwa niile?

  • Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya?

  • Ì chere na ozi ọma anyị na-ekwusa na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta otú Ndịàmà Jehova si ekwusa ozi ọma n’obodo ndị mepere emepe.

Ụzọ Pụrụ Iche E Si Ezi Ozi Ọma n’Ebe Ndị Na-ekwo Ekwo na Paris (5:11)

Olee otú Ndịàmà Jehova sirila nyere ndị gbara ọsọ ndụ aka?

Otú E Si Kụziere Ndị Gbara Ọsọ Ndụ Eziokwu Baịbụl (5:59)

Jiri anya gị hụ ụdị obi ụtọ mmadụ na-enwe ma ọ na-ekwusa ozi ọma mgbe niile.

Obi Dị M Ụtọ na M Ji Ozi Jehova Mere Ọrụ (6:29)

Chọpụta okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị meriri n’ụlọikpe, ndị nyere aka mee ka a na-ekwusakwu ozi ọma.

“Okwu Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke Wepụrụ n’Ụlọikpe” (Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!, isi nke 13)

a Ọ bụ Jehova gwara anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma, n’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị eche ka ndị ọchịchị nye ha ikike tupu ha ekwusawara ndị mmadụ ozi ọma.