Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỤ NKE 5

Eziokwu Banyere Ime Anwansi, Ịgba Afa, na Ịta Amoosu

Eziokwu Banyere Ime Anwansi, Ịgba Afa, na Ịta Amoosu

1. Olee ókè ime anwansi, ịgba afa, na ịta amoosu gbasaruru?

“N’AFRICA, ọ baghị uru ịjụwa ma amoosu ọ̀ dị ka ọ̀ bụ na ọ dịghị,” ka akwụkwọ bụ́ African Traditional Religion na-ekwu, na-agbakwụnye na “nye ndị Africa nọ n’ọkwá ọ bụla, ịta amoosu bụ ihe dị adị nke a na-ejighị egwuri egwu.” Ma ndị na-agụghị akwụkwọ ma ndị gụrụ oké akwụkwọ kwenyere n’ime anwansị, ịgba afa na ịta amoosu. Ndị ndú okpukpe Alakụba na Krisendọm kwenyekwara na ya.

2. Dị ka nkwenkwe e nwere ebe nile si dị, olee ebe e si enweta ike ime anwansi?

2 Dị ka nkwenkwe e nwere ebe nile n’Africa si dị, e nwere ike dị omimi, nke sitere n’aka ndị mmụọ dịnụ. Ọ bụ Chineke na-achịkwa ya. Ndị mmụọ na ndị nna ochie pụrụ iji ya mee ihe. Ụfọdụ ndị mmadụ makwaara otú e si enweta ya ma jiri ya mee ihe. Ụfọdụ na-eche na ha pụrụ iji ya mee ihe ọma iji chebe onwe ma ọ bụ ndị ọzọ, ụfọdụ na-ejikwa ya emerụ ndị ọzọ ahụ́.

3. Olee ụdị anwansi a na-eji eme ihe ọjọọ, gịnịkwa ka ndị mmadụ kwenyere na ọ pụrụ ime?

3 Ọ bụ ndị iro ka a na-eji anwansi a na-eji eme ihe ọjọọ emerụ ahụ́. E kwenyere na ndị na-eme anwansi a nwere ike izipụ ụsụ, nnụnụ, ijiji, na anụmanụ ndị ọzọ ịga wakpo ndị mmadụ. N’ọtụtụ ebe, e kwenyere na a pụrụ iji anwansi kpata ịlụ ọgụ, atụghị ime, ọrịa, na ọbụna ọnwụ.

4. Gịnị ka ọtụtụ kwenyere banyere ndị amoosu, oleekwa nkwupụta ụfọdụ ndị tinyeworo aka n’amoosu meworo?

4 Ihe ọzọ e jikọtara nnọọ ya na ya bụ ịta amoosu. A na-ekwu na ndị amoosu na-ahapụ ahụ́ ha n’abalị fepụ, ịga soro ndị amoosu ndị ọzọ nwee nzukọ ma ọ bụ ịga jiri nwayọọ gbuo ndị mmadụ. Ebe ọ bụ na ahụ́ ndị amoosu ka ga-edinara n’elu àkwà ha na-ehi ụra, ihe nkwado bụ́ isi e nwere maka akụkọ ndị a bụ nkwupụta nke ndị sepụworo aka n’ịta amoosu na-eme. Dị ka ihe atụ, otu magazin a na-ebipụta n’Africa kwuru na ndị bụbu ndị amoosu (ndị ihe ka ukwuu n’ime ha bụ ụmụ agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma) kwuru, sị: “Egburu m mmadụ 150 site n’ịkpata ihe mberede ụgbọala.” “Egburu m ụmụaka ise site n’ịmị ọbara nile dị ha n’ahụ́.” “Egburu m ndị enyi m nwoke atọ n’ihi na ha gbahapụrụ m.”

5. Olee ụdị anwansi a na-eche na e ji eme ihe ọma, oleekwa otú a na-esi eme ya?

5 A na-eche na a pụrụ iji anwansi chebe mmadụ ka ihe ọjọọ ghara ịdakwasị ya. Ndị na-eme anwasi iji chebe onwe ha ma nyere ndị ọzọ aka na-eyi mgbaaka ma ọ bụ ọla aka ndị nwere ikike pụrụ iche. Ha na-aṅụ ọgwụ na-echebe mmadụ ma ọ bụ na-ete ya n’ahụ́ ha. Ha na-ezo ihe ndị ha kwenyere na ha nwere ikike ichebe mmadụ n’ebe obibi ha ma ọ bụ lie ha n’ime ala. Ha na-atụkwasị obi n’ọgwụ nchebe ndị nwere ihe odide ndị e si na Koran ma ọ bụ na Bible were.

Ụgha na Aghụghọ

6. Gịnị ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya meworo n’oge gara aga, oleekwa otú anyị kwesịrị isi were ike ha?

6 Ọ bụ eziokwu na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya bụ ndị iro dị ize ndụ nke ụmụ mmadụ. Ha nwere ikike ịkpụzigharị uche na ndụ ndị mmadụ, n’oge gakwara aga, ha abawo ọbụna n’ime ụmụ mmadụ na anụmanụ ma chịkwaa ha. (Matiu 12:​43-45) Ọ bụ ezie na anyị agaghị eleda ike ha nwere anya, anyị ekwesịghị ibuli ike ndị ahụ elu karịa otú ha hà.

7. Gịnị ka Setan chọrọ ka anyị kwere, oleekwa ihe atụ a ga-eji kọwaa nke a?

7 Setan bụ ọkà n’ịghọ aghụghọ. Ọ na-aghọgbu ndị mmadụ iche na o nwere ike karịa otú o nwere n’ezie. Iji maa atụ: Mgbe a na-alụ otu agha a lụrụ na nso nso a n’otu mba Africa, ndị agha ji ígwè ọrụ na-ewepụta ụdà menye ndị iro ha ụjọ. Tupu ha alụso ndị iro ha ọgụ, ndị agha ahụ na-akpọ n’olu na-adasi ụda ike ụda égbè ukwu na nke ụmụ obere égbè bụ́ nke e tinyere na teepu. Ha chọrọ ka ndị iro ha chee na ọ bụ ìgwè ndị agha nwere ọtụtụ ngwá agha dị ike na-alụso ha ọgụ. N’otu ụzọ ahụ, Setan chọrọ ka ndị mmadụ chee na ike ya enweghị nsọtụ. Nzube ya bụ imenye ndị mmadụ ụjọ ka ha wee mee uche ya kama ime uche Jehova. Ka anyị tụlee ugbu a ụgha atọ nke Setan chọrọ ka ndị mmadụ kwere.

8. Gịnị bụ otu ụgha Setan na-akwalite?

8 Otu ụgha Setan na-akwalite bụ nke a: Ọ dịghị ihe ọjọọ na-eme ná ndabata; ihe ọjọọ ọ bụla nke ọ na-abụghị mmadụ kpatara kpọmkwem na-eme site n’ike dị omimi. Dị ka ihe atụ, were ya na ịba gburu nwatakịrị. Nne ya nwere ike ịma na ịba bụ ọrịa nke anwụnta na-ekesa. Ma o nwekwara ike ikwenye na ọ bụ mmadụ ji amoosu zite anwụnta ka ọ taa nwa ya.

Mgbe ụfọdụ ihe ọjọọ na-eme ná ndaba

9. Olee otú Bible si egosi na ọ bụghị Setan na-akpata nsogbu nile?

9 Ọ bụ ezie na Setan nwere ike ịkpata nsogbu ụfọdụ, o zighị ezi iche na o nwere ike ịkpata nsogbu nile. Bible na-asị: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka ịwụ ọsọ dịịrị, ọ bụghịkwa ndị dị ike ka agha dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nghọta ka akụ̀ dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị; kama mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” (Eklisiastis 9:11) Otu onye nke na-agba ọsọ n’asọmpi ịgba ọsọ pụrụ ịdị na-agbakarị ndị ọzọ, ma o nwere ike ọ gaghị emeri. Otu “ihe ndapụta” pụrụ ime ya ka ọ ghara imeri. Ma eleghị anya ọ ga-akpọ ụkwụ n’ihe wee daa ma ọ bụ daa ọrịa ma ọ bụ ọkpụkpụ echikwapụ ya. Ihe ndị a pụrụ ime onye ọ bụla. Ọ bụchaghị Setan na-akpata ha, o sitechaghịkwa n’ịta amoosu; ha na-emere onwe ha.

10. Gịnị ka a na-ekwu banyere ndị amoosu, oleekwa otú anyị si mara na nke a bụ ụgha?

10 Ụgha nke abụọ Setan na-akwalite bụ nke a: Ndị amoosu na-ahapụ ahụ́ ha pụọ n’abalị ịgakwuru ndị amoosu ndị ọzọ ma ọ bụ ịga mịa ma ọ bụ taa ndụ nke ndị ha chọrọ ịta. Ugbu a jụọ onwe gị: ‘Ọ bụrụ na ndị amoosu pụrụ ime nke ahụ, gịnị kpọmkwem na-esi n’ahụ́ apụ?’ Dị ka anyị hụworo, mkpụrụ obi bụ onye ahụ n’onwe ya, ọ bụghị ihe pụrụ isi n’onye ahụ pụọ. Ọzọkwa, mmụọ bụ ike ndụ nke na-eme ka ahụ́ nwee ike ịrụ ọrụ ma ọ pụghị ime ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na ahụ́ adịghị.

Ndị amoosu apụghị ịhapụ ahụ́ ha

11. Gịnị mere anyị ji mara na ndị amoosu apụghị ịhapụ ahụ́ ha, ma ì kwere nke a?

11 Ma mkpụrụ obi ma mmụọ apụghị ịhapụ ahụ́ mee ihe ọ bụla, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ. N’ihi ya, ndị amoosu apụghị ịhapụ ahụ́ ha. Ha anaghị eme n’ezie ihe ha na-azọrọ na ha na-eme ma ọ bụ ihe ha chere na ha mere.

12. Olee otú Setan si eme ka ndị mmadụ kwere na ha emewo ihe ndị ha na-emeghị?

12 Olee otú anyị pụrụ isi kọwaa nkwupụta nke ndị tinyeworo aka n’ịta amoosu mere? Setan pụrụ ime ka ndị mmadụ kwenye na ha enwewo ahụmahụ ha na-enwebeghị. Setan pụrụ isite n’ọhụụ mee ndị mmadụ ka ha chee na ha ahụwo ihe ndị ha na-ahụghị, nụ ihe ndị ha na-anụghị, meekwa ihe ndị ha na-emeghị. N’ụzọ dị otú a, Setan na-atụ anya ime ka ndị mmadụ si n’ebe Jehova nọ pụọ ma mee ka ha chee na ihe Bible na-ekwu abụghị eziokwu.

13. (a) Anwansi a sị na-eji echebe onwe onye ọ̀ dị mma? (b) Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere anwansi?

13 Ụgha nke atọ bụ nke a: Anwansi iji chebe onwe onye​—ụdị anwansi a sị na ọ na-emeri nke a na-eme iji merụọ ndị ọzọ ahụ́​—dị mma. Bible akpaghị ókè n’etiti anwansi iji chebe onwe onye na nke iji merụọ ndị ọzọ ahụ́. Ọ na-akatọ ụdị anwansi nile. Tụlee iwu Jehova nyere mba Izrel banyere anwansi na ndị mere ya:

  • “Unu agbala afa, unu ejikwala ígwé ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ.”​—Levitikọs 19:26.

  • “Ma nwoke ma ọ bụ nwanyị, mgbe mmụọ a na-ajụ ihe dị n’ime ha, ma ọ bụ nke bụ́ dibịa afa, a ghaghị ime ka ha nwụọ.”​—Levitikọs 20:27.

  • “A gaghị ahụta n’etiti gị . . . onye na-ajụ ase, ma ọ bụ onye na-eji ígwé ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị, ma ọ bụ dibịa nrafu, ma ọ bụ onye na-ajụ mmụọ ihe.”​—Deuterọnọmi 18:​10-14.

14. N’ihi gịnị ka Jehova ji nye iwu megide ime anwansi?

14 Iwu ndị a mere ka o doo anya na Chineke achọghị ka ndị ya na-eme anwansi. Jehova nyere ndị ya iwu ndị a n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya, ọ chọghịkwa ka ha bụrụ ohu nke egwu na nkwenkwe ụgha. Ọ chọghị ka ndị mmụọ ọjọọ mekpaa ha ahụ́.

15. Olee otú Bible si egosi na Jehova dị ike karịa Setan?

15 Ọ bụ ezie na Bible akọwaghị ihe nile ndị mmụọ ọjọọ pụrụ ime na ihe ndị ha na-apụghị ime, o gosiri na Jehova Chineke dị ike nke ukwuu karịa Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. Jehova mere ka a chụpụ Setan n’eluigwe. (Mkpughe 12:9) Rịbakwa ama na Setan rịọrọ ka e kwe ya ka ya nwaa Job ọnwụnwa, o rubekwara isi n’ịdọ aka ná ntị Chineke nyere ya ka ọ ghara igbu Job.​—Job 2:​4-6.

16. N’ebe ònye nọ ka anyị kwesịrị ịdabere maka nchebe?

16 Ilu 18:10 na-ekwu, sị: “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu.” Ya mere anyị kwesịrị ịdabere n’ebe Jehova nọ maka nchebe. Ndị na-ejere Chineke ozi adịghị adabere n’ọtụmọkpọ ma ọ bụ ọgwụ maka nchebe pụọ n’ọrụ ọjọọ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-arụ, ha adịghịkwa atụ ọgwụ nke ndị mgbaasị na-akọ egwu. Ndị ohu Chineke kwenyere n’ihe Bible na-ekwu: “N’ihi na Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.”​—2 Ihe E Mere 16:9.

17. Gịnị ka Jems 4:7 na-emesi anyị obi ike banyere ya, ma gịnị ka anyị na-aghaghị ime?

17 Gị onwe gị kwa pụrụ inwe obi ike ma ọ bụrụ na ị na-ejere Jehova ozi. Jems 4:7 na-ekwu, sị: “Ya mere, doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” Ọ bụrụ na i jeere ezi Chineke ahụ ozi, na-edo onwe gị n’okpuru ya, ị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-echebe gị.