Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 97

Jizọs Abịa Dị Ka Eze

Jizọs Abịa Dị Ka Eze

NWA oge mgbe ọ gwọsịrị ndị arịrịọ abụọ ahụ kpuru ìsì, Jizọs bịaruru otu obodo nta dị nso na Jeruselem. Ọ gwara mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Gaanụ n’ime obodo, unu ga-ahụkwa nwa ịnyịnya ibu e liwere eliwe. Tọpụnụ ya ma kpụtara m ya.’

Mgbe a kpụtaara ya ịnyịnya ibu ahụ, Jizọs nọkwasịrị n’elu ya. O wee gbara ya ruo Jeruselem nke dị nso. Mgbe ọ na-eru obodo ahụ nso, oké ìgwè mmadụ wee bịa izute ya. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha yipụrụ uwe ha ma gbasaa ha n’ụzọ. Ndị ọzọ gbutere igu nkwụ. Ha wee na-atụsa ha n’okporo ụzọ ahụ, na-eti mkpu, sị: ‘Ka Chineke gọzie eze nke na-abịa n’aha Jehova!’

Mgbe dị anya gara aga n’Izrel, ndị e chiri eze ọhụrụ na-agbara nwa ịnyịnya ibu abanye n’ime Jeruselem iji gosi ndị mmadụ onwe ha. Ọ bụ ihe Jizọs na-eme ugbu a. Ndị a na-egosikwa na ha chọrọ ka Jisọs bụrụ eze ha. Ma ọ bụghị mmadụ niile chọrọ ya. Anyị pụrụ ịhụ nke a site n’ihe mere mgbe Jizọs na-abanye n’ụlọ nsọ Chineke.

N’ụlọ nsọ ahụ, Jizọs gwọrọ ndị ìsì na ndị ngwụrọ. Mgbe ụmụntakịrị hụrụ nke a, ha tiri mkpu otuto nye Jizọs. Ma nke a kpasuru ndị nchụàjà iwe, ha wee sị Jizọs: ‘Ị̀ na-anụ ihe ụmụntakịrị a na-ekwu?’

‘Ana m anụ ya,’ ka Jizọs zara ha. ‘Ọ̀ bụ unu agụtụbeghị ebe Bible na-asị: “Chineke ga-esi n’ọnụ ụmụ ọhụrụ mee ka otuto pụta?”’ N’ihi ya, ụmụntakịrị ahụ nọgidere na-eto eze nke Chineke.

Anyị kwesịrị ịdị ka ụmụntakịrị ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị? Ụfọdụ ndị pụrụ ịnwa igbochi anyị ikwu okwu banyere alaeze Chineke. Ma anyị ga-anọgide na-akọrọ ndị ọzọ banyere ihe ndị dị ebube nke Jizọs ga-emere ụmụ mmadụ.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, oge erubeghị ka ọ malite ịchị dị ka eze. Olee mgbe oge ahụ ga-eru? Ndị na-eso ụzọ ya chọrọ ịmata. Anyị ga-agụ nke a n’akụkọ na-esonụ.