Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 2

Ogige nke Mara Mma

Ogige nke Mara Mma

LEGODỊ otú ụwa dị n’ebe a! Lee ka ihe niile si maa mma! Legodị ahịhịa na osisi, okooko osisi na anụmanụ niile a. Ị̀ pụrụ igosi m enyí na ọdụm?

Olee otú ogige a mara mma si bịa dịrị? Ka anyị hụ ụzọ Chineke si kwadebere anyị ala nke a.

Nke mbụ, Chineke mere ka ahịhịa ndụ jupụta n’ala. O keziri ụmụ obere ihe ọkụkụ dị iche iche na ọhịa na osisi. Ihe ndị a na-eto eto so eme ka ala maa mma. Ha na-eme ihe karịrị nke ahụ. Ọtụtụ n’ime ha na-enye anyị nri na-atọ ezigbo ụtọ.

E mesịa, Chineke kere azụ̀ ka ha na-egwugharị n’ime mmiri, keekwa nnụnụ ka ha na-efegharị na mbara igwe. O kere nkịta na nwamba na ịnyịnya; anụ ukwu na anụ nta. Olee anụmanụ ndị bi na gburugburu ụlọ unu? Obi ọ́ dịghị atọ anyị ụtọ na Chineke keere anyị ihe ndị a?

N’ikpeazụ, Chineke kere otu akụkụ ụwa ịbụ ebe pụrụ nnọọ iche. Ọ kpọrọ ebe ahụ Ogige Iden. O nweghị nnọọ atụ. Ihe niile banyere ya mara mma. Ma Chineke chọrọ ka ụwa dum dịrị ka ogige a mara mma nke o kere.

Ma lee anya ọzọ n’ebe a mara mma. Ị̀ ma ihe Chineke chọpụtara na ọ dịghị n’ime ya? Ka anyị hụ.