Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 113

Mgbe Pọl Nọ na Rom

Mgbe Pọl Nọ na Rom

LEE ịga a tụrụ Pọl n’aka, leekwa onye agha Rom na-eche ya nche. Pọl bụ onye mkpọrọ na Rom. Ọ na-echere ruo mgbe Siza nke Rom ga-ekpebi ihe a ga-eme ya. Ka ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, e kwere ka ndị mmadụ na-eleta ya.

Mgbe ụbọchị atọ gasịrị n’oge Pọl ruru Rom, o ziri ụfọdụ ndị isi ndị Juu ozi ka ha bịa hụ ya. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu nọ na Rom bịara. Pọl ziri ha ozi ọma banyere Jizọs na alaeze Chineke. Ụfọdụ kwere wee ghọọ Ndị Kraịst, ma ndị ọzọ ekweghị.

Pọl zikwara ọtụtụ ndị agha na-eche ya nche ozi ọma. Pọl nọgidere na-ezi ndị niile o nwere ike inweta ozi ọma ruo afọ abụọ ọ nọrọ n’ebe ahụ dị ka onye mkpọrọ. N’ihi ya, ọbụna ezinụlọ Siza nụrụ ozi ọma Alaeze ahụ, ụfọdụ n’ime ha ghọkwara Ndị Kraịst.

Ma ònyekwanụ bụ onye ọbịa nke a na-ede ihe na tebụl? Ị̀ pụrụ ịkọta ya? Ọ bụ Timoti. A tụkwara Timoti mkpọrọ n’ihi izisa ozi ọma nke Alaeze, ma a hapụwo ya. Ọ bịakwara ebe a inyere Pọl aka. Ị̀ ma ihe Timoti na-ede? Ka anyị hụ.

Ì chetara obodo Filipaị na Efesọs n’Akụkọ nke 110? Pọl nyere aka iguzobe ọgbakọ Ndị Kraịst n’obodo ndị ahụ. Ugbu a, ka Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ, o degaara Ndị Kraịst ndị a akwụkwọ. Akwụkwọ ozi ndị ahụ dị na Bible, a na-akpọkwa ha Ndị Efesọs na Ndị Filipaị. N’ebe a, Pọl na-agwa Timoti ihe ọ ga-edegara ndị enyi ha Ndị Kraịst nọ na Filipaị.’

Ndị Filipaị gosiri Pọl obiọma. Ha ziteere Pọl onyinye n’ebe a n’ụlọ mkpọrọ, o wee na-ekele ha maka ya. Ọ bụ Epafrọdaịtọs wetara onyinye ahụ. Ma ọ rịara ọrịa, ọ fọkwara nke nta ka ọ nwụọ. Ahụ́ adịwo ya mma ugbu a, ọ na-ejikerekwa ịla. Ọ ga-ewere akwụkwọ ozi a nke si n’aka Pọl na Timoti laghachi Filipaị.

Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, Pọl dere akwụkwọ ozi abụọ ọzọ nke dị n’ime Bible. Otu ka o degaara Ndị Kraịst bi n’obodo Kọlọsi. Ị̀ ma ihe a na-akpọ ya? A na-akpọ ya Ndị Kọlọsi. Nke ọzọ bụ akwụkwọ ozi o degaara enyi ya Faịlimọn, onye bikwa na Kọlọsi. Akwụkwọ ozi ahụ bụ banyere Ọnisimọs ohu Faịlimọn.

Ọnisimọs si n’aka Faịlimọn gbapụ wee jee Rom. Ọnisimọs nụrụ na Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ebe ahụ. O jere ileta ya, Pọl wee zie ya ozi ọma. N’oge na-adịghị anya, Ọnisimọs ghọkwara Onye Kraịst. Ugbu a, o wutere Ọnisimọs na ya gbara ọsọ. N’ihi ya, ị̀ ma ihe Pọl dere n’akwụkwọ ozi ahụ o degaara Faịlimọn?

Ọ rịọrọ Faịlimọn ka ọ gbaghara Ọnisimọs. Pọl dere, sị: ‘M na-ezighachiri gị ya. Ma ugbu a, ọ bụghị naanị ohu gị. Ọ bụkwa ezi nwanna nwoke bụ́ Onye Kraịst.’ Ọnisimọs weere akwụkwọ ozi abụọ ahụ laghachi Kọlọsi, otu bụ nke Ndị Kọlọsi, nke ọzọ bụ nke Faịlimọn. Anyị pụrụ iche n’echiche ụdị obi ụtọ Faịlimọn ga-enwe ịnụ na ohu ya aghọwo Onye Kraịst.

Mgbe Pọl degaara ndị Filipaị na Faịlimọn akwụkwọ ozi, o ziri ha ụfọdụ ozi obi ụtọ. Ọ sịrị Ndị Filipaị: ‘M na-ezitere unu Timoti. Ma m ga-eleta unu n’oge na-adịghị anya.’ O degakwaara Faịlimọn akwụkwọ, sị: ‘Kwadebekwara m ebe m ga-anọ.’

Mgbe Pọl nweere onwe ya, o letara ụmụnna ya ndị ikom na ndị inyom n’ọtụtụ ebe. Ka e mesịrị, a tụrụ Pọl mkpọrọ ọzọ na Rom. N’oge a, ọ matara na a ga-egbu ya. O wee degara Timoti akwụkwọ ka ọ bịa ọsọ ọsọ. ‘Ekwesịwo m ntụkwasị obi nye Chineke,’ ka Pọl na-ede, ‘Chineke ga-akwụghachikwa m ụgwọ.’ N’ime afọ ole na ole ka e gbusịrị Pọl, e bibikwara Jeruselem ọzọ. Na nke ugbu a, ọ bụ ndị Rom bibiri ya.

Ma e nwere ihe ọmụma ndị ọzọ dị n’ime Bible. Jehova Chineke mere ka Jọn onyeozi dee akwụkwọ ndị ikpeazụ dị na Bible, tinyere akwụkwọ Mkpughe. Akwụkwọ Bible a na-akọ banyere ọdịnihu. Ka anyị mụọ ugbu a ihe ọdịnihu ahụ ga-eweta.