Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 14

Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule

Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule

Ị̀ NA-AHỤ ihe Ebreham na-eme n’ebe a? O ji mma, o yikwara ka ọ gaje igbu nwa ya. Gịnị mere ọ ga-eji mee ihe dị otú a? Ka anyị burugodị ụzọ lee otú ya na Sera si mụta nwa ha.

Cheta na Chineke kwere ha nkwa na ha ga-amụta nwa. Ma nke ahụ yiri ihe na-apụghị ime eme, n’ihi na Ebreham na Sera emewo nnọọ agadi. Ma, Ebreham kwere na Chineke pụrụ ime ihe yiri ihe na-apụghị ime eme. Gịnịzi mere?

Mgbe Chineke kwesịrị nkwa ya, otu afọ gabigara. Ka e mesịrị, mgbe Ebreham gbara otu narị afọ, Sera agbaakwa afọ iri itoolu, ha mụrụ nwa nwoke, bụ́ Aịzik. Chineke mezuru nkwa ya!

Ma mgbe Aịzik tolitere, Jehova lere okwukwe Ebreham ule. Ọ kpọrọ ya: ‘Ebreham!’ Ebreham azaa ya, sị: ‘Lee m!’ Chineke wee sị ya: ‘Kpọrọ nwa gị, naanị otu nwa i nwere, bụ́ Aịzik, jee n’ugwu nke m ga-egosi gị. Gbuo nwa gị n’ebe ahụ ma were ya chụọ àjà.’

Okwu ndị a wutere Ebreham nke ukwuu n’ihi na ọ hụrụ nwa ya n’anya hie nne. Ma cheta na Chineke ekwewo nkwa na ụmụ Ebreham ga-ebi n’ala Kenan. Olee otú nke a ga-esi mee ma ọ bụrụ na Aịzik anwụọ? Ebreham aghọtaghị nke a, ma o gere Chineke ntị.

Mgbe Ebreham ruru n’ugwu ahụ, o kere Aịzik agbụ wee nyiwe ya n’elu ebe ịchụàjà nke o wuru. O wee mịpụta mma igbu nwa ya. Ma n’otu mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke kpọrọ ya: ‘Ebreham, Ebreham!’ Ebreham wee zaa ya: ‘Lee m!’

Chineke wee sị ya: ‘Emerụla nwata ahụ ahụ́ ma ọ bụ mee ya ihe ọ bụla. Ugbu a ka M matara na i kwere na m, n’ihi na ị jụghị iji nwa gị, bụ́ otu nwa i nwere, chụọrọ m àjà.’

Lee okwukwe siri ike Ebreham nwere n’ebe Chineke nọ! O kwere na ọ dịghị ihe Jehova na-apụghị ime, na ọbụna Ọ pụrụ ịkpọlite Aịzik n’ọnwụ. N’ezie, ọ bụghị uche Chineke ka Ebreham gbuo Aịzik. Chineke mere ka alụghụlụ ọhịa jide otu ebulu, o wee gwa Ebreham ka o jiri ya chụọ àjà kama iji nwa ya.