Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 102

Eze Jizọs Ejiri Nwa Ịnyịnya Ibu Banye na Jeruselem

Eze Jizọs Ejiri Nwa Ịnyịnya Ibu Banye na Jeruselem

MATIU 21:1-11, 14-17 MAK 11:1-11 LUK 19:29-44 JỌN 12:12-19

  • JIZỌS ABANYE NA JERUSELEM KA ONYE MMERI

  • JIZỌS EKWUO NA A GA-EBIBI JERUSELEM

N’echi ya bụ́ Sọnde, abalị itoolu n’ọnwa Naịsan, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ Betani gawa Jeruselem. Ka ha na-erute Betfeji, n’Ugwu Oliv, Jizọs gwara mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị:

“Gaanụ n’obodo nta ahụ unu na-ahụ, ozugbo ahụ, unu ga-ahụ ịnyịnya ibu e liwere eliwe, na nwa ịnyịnya ibu ya na ya nọ; tọpụnụ ha, kpụtara m ha. Ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa unu ihe ọ bụla, sịnụ ya, ‘Ha dị Onyenwe anyị mkpa.’ Mgbe ahụ, ọ ga-ahapụ ha ka unu kpụrụ ha.”—Matiu 21:2, 3.

Ndị na-eso ụzọ ya amaghị na ihe a ọ sị ha mee nwere otú o si gbasa amụma e buru na Baịbụl. Ma mgbe e mechara, ha ghọtara na o mezuru ihe Zekaraya buru n’amụma. Zekaraya kwuru na Eze Chineke kwere ná nkwa “dị umeala n’obi, ọ nọkwa n’elu ịnyịnya ibu, ọbụna anụmanụ tojuru etoju, bụ́ nwa nke nne ịnyịnya ibu.”—Zekaraya 9:9.

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs rutere Betfeji, kpụta nwa ịnyịnya ibu ahụ na nne ya, ndị nọ nso ebe ahụ jụwara ha, sị: “Gịnị mere unu ji na-atọpụ nwa ịnyịnya ibu ahụ?” (Mak 11:5) Mgbe ndị na-eso ụzọ ahụ gwara ha na ọ dị Onyenwe ha mkpa, ha hapụrụ ha. Ndị na-eso ụzọ ahụ wụkwasịrị uwe elu ha n’elu nne ịnyịnya ibu ahụ na nwa ya, Jizọs anọkwasịzie n’elu nwa ịnyịnya ibu ahụ.

Ọtụtụ ndị nọ na-agbakọta ka Jizọs nọ n’elu nwa ịnyịnya ibu ahụ na-aga Jeruselem. Ọtụtụ ndị nọkwa na-agbasa uwe elu ha n’okporo ụzọ, ndị ọzọ “si n’ọhịa gbute alaka osisi” ma gbasaa ha. Ha nọkwa na-eti mkpu, sị: “Biko, zọpụta ya! Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova bụ! Ihe a gọziri agọzi ka alaeze na-abịa abịa nke nna anyị Devid bụ!” (Mak 11:8-10) Ihe a ndị a na-ekwu na-ewe ndị Farisii nọ ebe ahụ iwe. Ha gwara Jizọs, sị: “Onye Ozizi, baara ndị na-eso ụzọ gị mba.” Ma, Jizọs zara ha, sị: “Ana m asị unu, Ọ bụrụ na ndị a agbachi nkịtị, nkume ga-eti mkpu.”—Luk 19:39, 40.

Ka Jizọs hụrụ Jeruselem, o bidoro bewe ákwá ma sị: “A sị na gị onwe gị ghọtara n’ụbọchị taa ihe ndị ga-eweta udo—ma ugbu a, e zowo ha ka anya gị ghara ịhụ ha.” Jeruselem ga-akwụ ụgwọ ihe ọjọọ niile o mere. Jizọs kwuru, sị: “Ndị iro gị ga-eji osisi pịrị ọnụ wuo ogige gburugburu gị, ha ga-agbakwa gị gburugburu ma si n’akụkụ niile na-enye gị nsogbu. Ha ga-akụtu gị na ụmụ gị bụ́ ndị nọ n’ime gị n’ala, ha agaghịkwa ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya n’ime gị.” (Luk 19:42-44) Ihe a Jizọs kwuru mezuru. E bibiri Jeruselem n’afọ 70.

Mgbe Jizọs banyere n’ime Jeruselem, “obodo ahụ dum malitere ịgba aghara, ha ana-asị: ‘Ònye bụ onye a?’” Ma, ìgwè mmadụ ahụ só Jizọs nọ na-asị: “Onye a bụ Jizọs onye amụma, onye Nazaret nke Galili!” (Matiu 21:10, 11) Ụfọdụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ, ndị hụrụ mgbe Jizọs kpọlitere Lazarọs, gwawara ndị ọzọ banyere ya. Ọ na-ewute ndị Farisii na mbọ ha na-agba ime ka ìgwè mmadụ a kwụsị ito Jizọs na-akụ afọ n’ala. Ha gwawara ibe ha, sị: “Ụwa dum esorola ya.”—Jọn 12:18, 19.

Jizọs gawara n’ụlọ nsọ ịga zie ihe otú ọ na-eme mgbe ọ bụla ọ bịara Jeruselem. Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ gwọrọ ndị ìsì na ndị ngwọrọ. Iwe bịara ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ n’ihi ihe ndị a Jizọs na-eme nakwa n’ihi na ụmụ okoro nọ na-asị ya, “Biko, zọpụta Nwa Devid!” Ha jụrụ Jizọs, sị: “Ị̀ na-anụ ihe ndị a na-ekwu?” Jizọs zara ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe e dere, sị, ‘I mewo ka otuto si n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara pụta’?”—Matiu 21:15, 16.

Jizọs legharịziri anya n’ụlọ nsọ ahụ. Ebe ọ bụ na oge agaala, ya na ndịozi ya pụwara. Tupu abalị iri n’ọnwa Naịsan, ọ laghachiri Betani ma nọọ ebe ahụ n’abalị Sọnde.