Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Ọ̀ Katọrọ Ịgba Chaa Chaa?

Baịbụl Ọ̀ Katọrọ Ịgba Chaa Chaa?

Baịbụl Ọ̀ Katọrọ Ịgba Chaa Chaa?

FIM na ihe omume televishọn ndị ọzọ na-ewu ewu na-egosikarị ịgba chaa chaa, karịchaa n’ụlọ ọkụ na-eri ego, dị ka ihe mara mma ndị ọgaranya ma nke a na-akọ ji atụrụ ndụ. N’ezie, ọtụtụ ndị na-ekiri ha ghọtara na ihe ndị ahụ a na-egosi emeghị eme.

Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ ịgba lọtrị, iti ebé, ịgba chaa chaa n’Ịntanet na ọkụ na-eri ego na-eme ka obi ya dịrị n’ịgba chaa chaa mgbe niile. Akwụkwọ bụ́ Internet Gambling kwuru na ịgba chaa chaa bụ “ihe ọjọọ fọrọ obere ka o zuo ebe niile bụ́ nke na-adọrọkwa mmasị ndị mmadụ n’ike n’ike.” Dị ka ihe atụ, nke a na-akpọ poka aghọọla egwuregwu a na-egosikarị na televishọn n’ebe ụfọdụ nakwa n’Ịntanet. Otu akwụkwọ akụkọ kwuru na ndị ọkachamara na-ekwu na n’Amerịka, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba poka mụbara okpukpu abụọ n’ime otu afọ na ọkara na-adịbeghị anya.

A kọwara na ịgba chaa chaa bụ mmadụ iji ego ya eti ebé n’ihe ọ na-amaghị ihe ga-esi na ya pụta. Ọtụtụ ndị chere na ọ dịghị ihe dị njọ n’ịgba chaa chaa ma ọ bụrụhaala na onye na-agba ya ji ego ya na-agba ya nakwa na o righị ya ahụ́. N’ezie, akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru na ịgba chaa chaa “abụghị mmehie ọ gwụla ma ịgba ya ọ̀ na-egbochi mmadụ ịrụ ọrụ o kwesịrị ịrụ.” Ma, o nweghị ebe akwụkwọ ahụ gosiri n’Akwụkwọ Nsọ kwadoro ihe ahụ o kwuru. Oleezi otú Onye Kraịst kwesịrị isi lee okwu a anya? Baịbụl ò kwadoro ịgba chaa chaa ka ọ̀ katọrọ ya?

Ọ dị mma iburu n’uche na Akwụkwọ Nso akpọghị ịgba chaa chaa aha kpọmkwem. Ma, nke a apụtaghị na o nweghị ntụziaka o nyere anyị banyere ya. Baịbụl enyeghị anyị iwu n’okwu niile ma ọ bụ n’ihe niile anyị chọrọ ime, kama nke ahụ, ọ gbara anyị ume ka anyị ‘nọgide na-aghọta ihe uche Jehova bụ.’ (Ndị Efesọs 5:17) Ọkà mmụta Baịbụl bụ́ E. W. Bullinger kwuru na okwu Grik a sụgharịrị “na-aghọta” pụtara iji “iche echiche, na ihe mmadụ mụtara mgbe ọ tụgharịrị uche” chịkọta ihe dị iche iche e kwuru banyere ihe. Ya mere, Onye Kraịst nwere ike ịghọta ihe bụ́ uche Chineke n’okwu a site n’ịchịkọta ụkpụrụ Baịbụl ndị metụtara ịgba chaa chaa ma chebara ha echiche. Ka ị na-agụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara n’isiokwu a, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Akwụkwọ Nsọ ọ̀ kwadoro ịgba chaa chaa? Olee ihe Okwu Chineke gosiri bụ́ uche Chineke n’okwu a?’

Otú Ihu Ọma Si Arata Mmadụ

Ebe ịgba chaa chaa bụ iti ebé maka ihe a na-ejighị n’aka, ihe ya na ya na-esokarị bụ ikwere n’ihu ọma, ya bụ, n’ikike dị omimi nke a sịrị na-ahụ maka ihe ndabara, karịsịa mgbe e ji ego tie ebé. Dị ka ihe atụ, nọmba ndị mmadụ na-ahọrọ na tiketi lọtrị ha bụ ndị ha chere ga-eme ka ha rite ihe; o nwere okwu ụfọdụ ndị nwere nkwenkwe na-enweghị isi na-ezere ikwu mgbe ha na-agba chaa chaa ndị Chaịna bụ́ mah-jongg; a na-afụkwa mkpụrụ ludo ikuku tupu a wụpụ ya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ndị na-agba chaa chaa na-ekwerekarị na ihu ọma ha ga-eme ka ha rite ihe, ma ọ bụkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ na o nwere ike inye aka ka ha rite ihe.

Ọ̀ bụ eziokwu na ọ dịghị ihe o mere ma mmadụ kwenyesie ike na ya ga-enwe ihu ọma? Ụfọdụ ndị Izrel oge ochie chere otú ahụ. Ha kweere na inwe ihu ọma ga-eme ka ihe gaara ha nke ọma. Olee otú Jehova Chineke si lee okwu ahụ anya? Chineke si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaya gwa ha, sị: “Unu bụ ndị na-ahapụ Jehova, ndị na-echefu ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebụl maka chi Ihu Ọma, ndị na-agbajuru chi Akara Aka mmanya a gwara agwa.” (Aịzaya 65:11) N’anya Chineke, ikwere n’ihu ọma bụ ikpere arụsị, onye na-efe ezi ofufe ekwesịghịkwa itinye aka na ya. Ọ na-eme ka mmadụ tụkwasị chi na-adịghị adị obi kama ịtụkwasị ezi Chineke obi. E nweghị ihe mere anyị ga-eji chee na Chineke agbanweela otú o si ele ya anya.

Otú E Si Erite Ihe na Ya

Ma ndị na-agba chaa chaa hà na-eti ebé n’Ịntanet, na-agba lọtrị, na-eti ebé n’egwuregwu, ma ọ bụ na-agba ọkụ na-eri ego, ha anaghị echekarị echiche banyere ebe ego ha na-achọ irite si. Ịgba chaa chaa dị iche n’ezigbo achụmnta ego ma ọ bụ azụmahịa n’ihi na onye na-agba chaa chaa na-achọ irite ego funahụrụ ndị na-agba chaa chaa ibe ya. * Ụlọ Ọrụ Kanada nke Na-ahụ Maka Ihe Iri Mmadụ Ahụ́ na Uche Akpakọghị Ọnụ kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla mmadụ si n’ịgba chaa chaa ghọọ aka ji akụ̀, e nweela ọtụtụ nde ndị ọzọ e riri ego ha!” Olee ihe Baịbụl kwuru bụ́ ndị nwere ike inyere Onye Kraịst aka ịghọta ihe Chineke chere n’okwu a?

Iwu ikpeazụ n’Iwu Iri e nyere ụmụ Izrel kwuru, sị: “Agụụ nwunye mmadụ ibe gị, ma ọ bụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ma ọ bụ ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị, agụla gị.” (Ọpụpụ 20:17) Ihe onye ọzọ ịgụ mmadụ agụụ, ma ihe onwunwe ya, akụnụba ya, ma ego ya, bụ mmehie dị oké njọ, nke e dere n’ebe e dere agụụ nwunye onye ọzọ ịgụ mmadụ. Ọtụtụ narị afọ mgbe nke ahụ gachara, Pọl onyeozi nyeghachiri Ndị Kraịst iwu ahụ, gbaa ha ume, sị: “Enwela anyaukwu.” (Ndị Rom 7:7) È nwere ike ịkpọ Onye Kraịst nke chọrọ irite ihe ga-efunahụ onye ọzọ onye anyaukwu?

J. Phillip Vogel, bụ́ onye na-edekarị ihe n’akwụkwọ akụkọ, dere, sị: “Ma [ọtụtụ ndị na-agba chaa chaa] hà kwetara ma ọ bụ na ha ekwetaghị, tupu ha agbaa chaa chaa, ọ na-agụ ha agụụ iji ihe ha nwere, ya bụrụgodị dọla ole na ole, rite nnukwu ego.” Ọ na-agụ ndị na-agba chaa chaa dị otú ahụ agụụ ịba ọgaranya n’otu ntabi anya. O doro anya na nke a megidere ndụmọdụ Baịbụl nyere ka Onye Kraịst “rụsie ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ ọma, ka o wee nwee ihe ọ ga-ekenye onye nọ ná mkpa.” (Ndị Efesọs 4:28) Pọl onyeozi kwuru hoo haa, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya erila ihe.” O kwukwara, sị: “Ha kwesịrị iri nri ha onwe ha rụtara.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:10, 12) Ma, è nwere ike ịsị na ịgba chaa chaa bụ ezigbo ọrụ?

Ọ bụ ezie na ịgba chaa chaa anaghị adịcha mfe, ego ọ bụla mmadụ nwetara na ya bụ ego o ritere erite, ọ bụghị ego ọ rụtara arụta ma ọ bụ nke o nwetara n’ihi ọrụ ọ rụrụ ma ọ bụ ozi o jere. Mgbe ndị mmadụ na-agba chaa chaa, ha na-eji ego ha eti ebé n’amaghị ma hà ga-erite ihe ma ọ bụ na ha agaghị erite, nweekwa olileanya na ọ ga-adabara ha otu ụbọchị. N’ikwu ya ná nkenke, onye na-agba chaa chaa na-ebu n’obi irite ihe n’emefughị ihe ọ bụla. Ma, a dụrụ ezi Ndị Kraịst ọdụ ịrụ ọrụ dị mma iji nweta ego. Eze Sọlọmọn bụ́ onye maara ihe dere, sị: “Ọ dịghị ihe dịịrị mmadụ mma karịa iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, meekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.” O kwukwara, sị: “Mụ onwe m ahụwo nke a, na o si n’aka ezi Chineke.” (Ekliziastis 2:24) N’ezie, ndị ohu Chineke anaghị atụkwasị ihe a na-ejighị n’aka obi ma ọ bụ na-achọ ụzọ ha ga-esi baa ọgaranya n’arụghị ọrụ, kama ha na-elekwasị Chineke anya ka o mee ka ha nwee obi ụtọ ma gọzie ha.

“Ọnyà” E Kwesịrị Izere

Ọ bụrụgodị na onye gbara chaa chaa mechara rite ihe, o kwesịrị ichebara ihe ndị ga-emecha si na chaa chaa ọ gbara pụta echiche, ọ bụghị naanị ilekwasị anya n’obi ụtọ o nwere mgbe o ritere ya. Ilu 20:21 kwuru, sị: “A na-eji anyaukwu enweta ihe nketa ná mmalite, ma ọdịnihu ya agaghị abụ nke a gọziri agọzi.” O wutela ọtụtụ ndị ritere ihe na lọtrị na ndị ọzọ na-agba chaa chaa mgbe ha chọpụtara na akụ̀ ha ritere emeghị ka ha nwee obi ụtọ. Ọ ka nnọọ mma ige ntị na ndụmọdụ Baịbụl bụ́ ka anyị ghara inwe olileanya “n’akụnụba ndị a na-ejighị n’aka, kama n’ebe Chineke nọ bụ́ onye na-enye anyị ihe niile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.”—1 Timoti 6:17.

E nwekwara nsogbu ọzọ dị n’ịgba chaa chaa ma e wezụga irite ego ma ọ bụ ego mmadụ ifu. Okwu Chineke kwuru, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́, ndị na-emekwa ka mmadụ mikpuo ná mbibi na ịla n’iyi.” (1 Timoti 6:9) A na-agba ọnyà iji jide ihe a gbaara ya. Ọnyà ịgba chaa chaa amatala ọtụtụ ndị, bụ́ ndị kpebiri iji naanị obere ego gbaa chaa chaa ma ọ bụ ịgba chaa chaa naanị ugboro ole na ole, ya eriekwa ha ahụ́. O mebierela ndị mmadụ ọrụ ha, kpatara ndị a hụrụ n’anya nsogbu, bibiekwa ọtụtụ ezinụlọ.

Ugbu a anyị tụlechara ọtụtụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị kwuru banyere ịgba chaa chaa, ị̀ ghọtala ihe bụ́ uche Chineke n’okwu a? Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Ọ bụ uche Chineke kwesịrị iduzi ndụ Onye Kraịst, ọ bụghị ihe ọtụtụ ndị chere. Ebe Jehova bụ ‘Chineke onye obi ụtọ,’ ọ chọrọ ka anyị kporie ndụ, ghara ịghọrọ mkpụrụ ọjọọ ndị ọnyà ịgba chaa chaa matara na-aghọrọ.—1 Timoti 1:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Teta! (Bekee) October 8, 2000, peeji nke 25 ruo 27, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, kọwara otú mmadụ ịzụ aka òkè si dị iche n’ịgba chaa chaa.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Ndị ohu Chineke na-arụ ọrụ dị mma iji nweta ego

[Igbe dị na peeji nke 13]

Ọṅụ A Na-enweta n’Irite Ihe

Ịgba chaa chaa ò nwere ike iri mmadụ ahụ́ ngwa ngwa? Mgbe Dọkịta Hans Breiter mụchara ihe ọmụmụ banyere otú ahụ́ na-adị ndị na-agba chaa chaa mgbe ha meriri na mgbe ego ha furu, o kwuru na “mgbe e nyere ndị mmadụ ego ha ritere n’ihe yiri chaa chaa e ji nwalee ha, o metụtara ụbụrụ ha otú yiri nnọọ otú koken si emetụta ụbụrụ onye ịṅụ koken ririla ahụ́.”

[Foto dị na peeji nke 13]

Ego ònye ka ndị na-agba chaa chaa na-enwe olileanya irite?